Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ònye Bụ Onye Ozi?

Ònye Bụ Onye Ozi?

 Echiche Nke Bible

Ònye Bụ Onye Ozi?

N’UHURUCHI bu ụbọchị ọnwụ ịchụ àjà Jisọs ụzọ, ezi ndị enyi ya malitere arụmụka kpụ ọkụ n’ọnụ. Dị ka Luk 22:24 si kwuo, “esemokwu wee daakwa n’etiti ha, onye n’ime ha ka a na-agụ na ọ ka ibe ya ukwuu.” Nke a abụghị nke mbụ esemokwu dị otú ahụ bilitere n’etiti ndị ozi Jisọs. Jisọs agbaziwo echiche ha, ọ dịkarịa ala ugboro abụọ tupu mgbe ahụ.

Lee ihe mwute ọ bụ na n’abalị a dị oké mkpa, Jisọs hụrụ na ya aghaghị ichetakwara ha ọzọ ihe onye Kraịst na-eje ozi kwesịrị ịbụ n’ezie. Ọ sịrị: “Onye ka ibe ya ukwuu n’etiti unu, ya dị ka onye bụ nwata; onye bụkwa onyeisi, ya dị ka onye na-eje ozi.”—Luk 22:26.

O kwesịghị iju anyị anya na ndị ozi ahụ nwere echiche na-ezighị ezi banyere ịdị mkpa nke ọnọdụ na ịbụ onye a ma ama. Tupu Jisọs, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii bụ ndị na-esetịpụrụ ha ihe nlereanya bụ́ isi n’ihe banyere idu ndú okpukpe. Kama inye ndị mmadụ nduzi na ntụzi ime mmụọ, ndị ozi ụgha a na-ewepụta omenala na ụkpụrụ ndị siri ike bụ́ ndị “na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu mmadụ.” Ha hụrụ ọkwá n’anya, bụrụ ndị na-achọ ka a mara ha, ndị na-eche banyere nanị onwe ha ma na-arụ ọrụ ha “ka mmadụ wee kirie ha.”—Matiu 23:4, 5, 13.

Ụdị Onye Ozi Ọhụrụ

Otú ọ dị, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya echiche ọhụrụ banyere ozi ime mmụọ. Ọ kụziri, sị: “Ka a ghara ịkpọ unu onwe unu, Rabaị: n’ihi na otu Onye bụ Onye ozizi unu, ma unu onwe unu nile bụ ụmụnna. Unu akpọkwala onye ọ bụla nna unu n’elu ụwa: n’ihi na otu Onye bụ Nna unu, Ya bụ Onye nke eluigwe. . . . Ma onye dịkarịrị ukwuu n’etiti unu ga-abụ onye na-ejere unu ozi.” (Matiu 23:8–11) Ndị na-eso ụzọ Jisọs agaghị eṅomi ndị ndú okpukpe nke oge ha. Ọ bụrụ na ha achọọ ịbụ ezi ndị ozi, ha aghaghị iṅomi Jisọs. Ihe nlereanya dị aṅaa ka o setịpụrụ?

Bible na-ejikarị okwu Grik bụ́ di·aʹko·nos eme ihe maka “onye ozi.” The Encyclopedia of Religion na-akọwa na okwu a na-anọchi anya “ọ bụghị ọnọdụ mmadụ kama mmekọrịta ije ozi dị n’etiti onye ozi na onye ọ na-ejere ozi: ịgbaso ihe nlereanya Kraịst . . . bụ isi ihe ga-enyere ndị Kraịst aka ịghọta ihe ozi pụtara.”

N’ikwekọ ná nkọwa ziri ezi nke  okwu ahụ bụ́ “onye ozi,” Jisọs wepụtara onwe ya inyere ndị ọzọ aka. “Nwa nke mmadụ abịaghị ka e jeere Ya ozi,” ka o ji ndidi kọwaa, “kama ka O jee ozi, ka O werekwa ndụ Ya nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Jisọs ji achọghị ọdịmma onwe nanị tinye oge, ume, na ikike ya n’inyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ anụ ahụ. N’ihi gịnị? N’ihi na o nwere ọmịiko n’ahụ ìgwè mmadụ a ghọgburu n’ụzọ ime mmụọ bụ́ ndị gbakọtara ịhụ ya. Ọ chọrọ inye aka. Mmesapụ aka nke ịhụnanya kpaliri bụ ihe kwaliri ozi ya, ọ chọkwara ka ndị na-eso ụzọ ya gosipụta otu àgwà inye ihe dị otú ahụ.—Matiu 9:36.

Site n’ụzọ ndụ ya, Jisọs setịpụụrụ ndị ozi ọ ga-enwe n’ọdịnihu ụkpụrụ ha ga-agbaso. “Owuwe ihe ubi hiri nne n’ezie,” ka o kwuru, “ma ndị ọrụ dị ole na ole. Ya mere, na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ, ka O zipụ ndị ọrụ baa n’owuwe ihe ubi Ya.” (Matiu 9:37, 38) Ee, ndị ozi Kraịst ga-abụ ndị ọrụ nke ọrụ kasị ukwuu a rụtụrụla n’ụwa—inye ihe a kpọrọ mmadụ nkasi obi ime mmụọ site n’ikwusa na ịkụzi ozi ọma nke Alaeze Chineke.—Matiu 28:19, 20.

Anya a e lekwasịrị n’inye ihe na n’igbo mkpa ndị ọzọ bụ ihe mere ka otú Kraịst si eje ozi dị nnọọ iche. Ọ kụziiri ndị ozi ya ịbụ ndị ọrụ, ndị ọkụ azụ̀ ime mmụọ na ndị ọzụzụ atụrụ, ọ bụghị ndị kweere n’ihe omimi na ndị gụrụ oké akwụkwọ na-eyi uwe ndị pụrụ iche na ndị a chọrọ mma nke ukwuu.—Matiu 4:19; 23:5; Jọn 21:15–17.

Echiche nke Bible

N’ụzọ dị mwute, ruo ọtụtụ narị afọ a gwagbuwo echiche a dị elu na nke achọghị ọdịmma onwe onye e ji kọwaa ndị ozi dị ka ndị nkwusa na ndị nkụzi na-achụ onwe ha na-àjà. Ihe malitere dị ka ozi ndị Kraịst, ghọrọ usoro ọrụ e guzobere eguzobe nke òtù ndị ụkọchukwu. E guzobere òtù dị iche iche na ndị nwere ọkwá, e nyekwara ha ihe ùgwù na ike, ọtụtụ mgbe kwa, ha na-akwakọba akụ̀ na ụba. Nke a wetara nkewa. E hiwere òtù ndị ụkọchukwu nke ọrụ ya bụ́ isi bụ inye sakramenti okpukpe nakwa inye ndị njehie ndụmọdụ. Iso Ụzọ Kraịst nke narị afọ mbụ gbanwere na narị afọ ndị sochiri ya, site n’ịbụ okpukpe na-arụsi ọrụ ike, ebe onye ọ bụla bụ onye ozi gaa n’ịbụ ebe e nwere mmadụ ole na ole a zụrụ n’ụzọ pụrụ iche na ndị e nyere ikike bụ́ ndị pụrụ ikwusa na ịkụzi ihe.

Otú ọ dị, Bible mere ka a mara onye Kraịst na-eje ozi, ọ bụghị site n’uwe pụrụ iche, ememe okpukpe gabigara ókè, ịkwụ ụgwọ, ma ọ bụ iwu ọchịchị, kama site n’ọrụ achọghị ọdịmma onwe onye nanị. Pọl onyeozi depụtara àgwà ndị Kraịst bụ́ ndị ndị ozi kwesịrị igosipụta. Ọ gbara ha ume ka ha ghara ‘ime ihe ọ bụla n’ụzọ ịchọ otuto efu, kama n’obi dị umeala.’—Ndị Filipaị 2:3.

N’ezie, Pọl mere ihe kwekọrọ n’ihe o kwusara. N’ịgbasochi ihe nlereanya Kraịst anya, ọ dịghị mgbe ọ chọrọ ‘uru nke aka ya kama uru nke mmadụ nile, ka e wee zọpụta ha.’ Ọ ghọtara ihe ibu ọrụ ya pụtara ma nwee mmetụta miri emi banyere ya nke na o ‘mere ka ozi ọma ghara ịbụ ihe ego dị’ na ya, dị ka o kwuru, “ka m ghara ijizu ike m ịnara ihe n’ozi ọma ahụ.” Ọ dịghị achọ “otuto site na mmadụ.”—1 Ndị Kọrint 9:16–18; 10:33; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:6.

Lee nnọọ ihe nlereanya pụtara ìhè nke ezi onye Kraịst na-eje ozi nke ahụ bụ! Ndị na-eṅomi ihe nlereanya ya bụ́ ịgba ma jiri ụkpụrụ achọghị ọdịmma onwe onye nke Jisọs Kraịst setịpụrụ na-eje ozi, na-ewepụta onwe ha iji nyere ndị ọzọ aka n’ụzọ ime mmụọ ma jiri ozi ọma ahụ kasie ha obi, na-egosipụta onwe ha ịbụ ezigbo ndị ozi nke Chineke.—1 Pita 2:21.