Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ikiri Ụwa

Ikiri Ụwa

 Ikiri Ụwa

“Anyị Ga-eme nke Ọma  Ime Ka Ha Dịrị”

Prọfesọ Anatoly P. Zilber bụ́ onyeisi oche nke Ngalaba Na-ahụ Maka Ndị Ọrịa Ha Siri Oké Ike na Ọgwụ Nkụnwụ Ahụ na Mahadum Petrozavodsk na Ụlọ Ọgwụ Republican nke Karelia, Russia, na-aja Ndịàmà Jehova mma, sị: “Ha adịghị aṅụbiga ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ókè, ha adịghị ese siga, ha enweghị akpịrị ego, ha adịghị ahapụ imezu nkwa ha, ha adịghịkwa agba àmà ụgha . . . Ha abụghị òtù nzuzo, kama ha bụ ụmụ amaala na-erube isi n’iwu.” Ọ na-ekwukwa, sị: “[Ha] bụ ndị dị ùgwù, nwere obi ụtọ, nwere mmasị n’akụkọ ihe mere eme, akwụkwọ, nkà, na ndụ n’akụkụ ya nile.” Ọzọkwa, mgbe o depụtasịrị mgbanwe ndị dị mma Ndịàmà kpatara n’ihe banyere ịwa ahụ n’ejighị ọbara, prọfesọ ahụ na-ekwu, sị: “Ikwu ihe Voltaire kwuru n’ụzọ ọzọ, anyị pụrụ ikwu na ọ bụrụ na Ndịàmà Jehova adịghị adị, anyị ga-eme nke ọma ime ka ha dịrị.”

Ọ̀ Bụ Ebe Ejiji Ruru Gwụ?

Akpụkpọ ụkwụ ndị ike ha buru ibu, “bụ́ ngwá dị oké mkpa nye ndị na-eto eto ji ejiji akpọrọ ihe,” nakwa akpụkpọ ụkwụ ndị ike ha dị ogo, na-akpata ihe dị ka 10,000 n’ime mmerụ ahụ ndị mmadụ na-enwe kwa afọ na Britain, ka The Times nke London na-ekwu. Steve Tyler, bụ́ ọnụ na-ekwuru Òtù Na-ahụ Maka Mmepụta nke Ihe Ndị Dị Mma nke Britain, na-ekwu, sị: “Mmerụ ahụ ndị a kasị enwe bụ nchipụ nke nkwonkwo ụkwụ na mgbaji ụkwụ, ma akpụkpọ ụkwụ ndị a pụkwara ịkpata azụ mgbu, karịsịa nye ụmụ agbọghọ bụ́ ndị ahụ ha ka na-eto eto.” Na Japan akpụkpọ ụkwụ ndị ike ha buru ibu akpatawo ọbụna ọnwụ nke ụmụ nwanyị abụọ n’ọnwa ndị na-adịbeghị anya. N’otu n’ime ha otu onye dị afọ 25 na-arụ ọrụ n’ụlọ akwụkwọ ọta akara bụ́ onye yi sandal ike ya buru ibu dị sentimita 12.5 n’ogo dara, kụwaa isi ya, wee nwụọ. Nwa agbọghọ ọzọ nwụrụ mgbe obere ụgbọala ọ nọ n’ime ya kụrụ pol kọnkịrị n’ihi na onye na-anya ya apụghị ịzọdo ụkwụ nke ọma na brek n’ihi na o yi buutu ike ya buru ibu dị sentimita 15 n’ogo. Ná mgbalị izere ịbụ ndị a gbara akwụkwọ, ndị ụfọdụ na-emepụta akpụkpọ ụkwụ amalitewo ịmapawa okwu ịdọ aka ná ntị na ha.

Ọrụ Ndị Dịịrị Ụmụaka n’Ụlọ

“Ndị nne na nna nke taa bụ́ ndị na-eji ọrụ n’aka adịghị eji ime ka ụmụaka ha nye aka n’ụlọ akpọrọ ihe,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-ekwu. Ọ bụ ezie na ọrụ “abụghị ihe ụmụaka ga-achọ ịrụ ma ọlị,” ka Jane Nelsen, bụ́ onye dere Positive Discipline na-ekwu, ọrụ ndị dị otú ahụ “na-akwalite ịdabere n’onwe onye na inwe ùgwù onwe onye.” Dị ka otu nnyocha dị na magazin bụ́ Child na-ekwu, ọrụ ụlọ ụfọdụ kwesịrị ekwesị dịịrị ụmụaka nọ n’agbata afọ abụọ na atọ pụrụ ịgụnye idozi ihe ndị ha ji egwurị egwu nakwa ịchịsa ákwà n’ebe a ga-asa ha. Ụmụaka nọ n’agbata afọ atọ na ise pụrụ idozi ihe na tebụl, iburu efere gaa n’ebe a na-asa ha, nakwa idebe ebe ndị ha na-anọ egwurị egwu ọcha. Ndị nọ site n’afọ 5 ruo 9 pụrụ idozi àkwà ha, tụtụọ akwụkwọ osisi, fookwa ahịhịa, ebe ndị nọ site n’afọ 9 ruo 12 pụrụ ịrụ ọrụ ndị dị ka ịsa na ihicha efere, ikpofu ahịhịa, ịsụ ahịhịa, na ịza ihe. Nelsen na-ekwukwa na “ọ dị mma ikwu oge e kwesịrị ịrụcha ihe.”

Ndị Na-eto Eto na Mpụ

Otu nnyocha Ndị Ọchịchị Scotland mere na-egosi na na Scotland pasent 85 nke ụmụ okoro na pasent 67 nke ụmụ agbọghọ nọ n’agbata afọ 14 na 15 na-ekwu na ha mere mpụ n’afọ gara aga. Akwụkwọ akụkọ Glasgow bụ́ The Herald na-akọ na n’ime 1000 ụmụ akwụkwọ a gbara ajụjụ ọnụ n’ụlọ akwụkwọ isii, nanị pasent 12 kwuru na ọ dịbeghị mgbe ha dara iwu. N’ime mpụ ndị e kwetara na e mere, ọ bụ pasent 69 nke ụmụ okoro na pasent 56 nke ụmụ agbọghọ mebiri ihe onwunwe. Ihe dị ka pasent 66 nke ụmụ okoro na pasent 53 nke ụmụ agbọghọ zuuru ihe n’ụlọ ahịa, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ọkara n’ime ha zuru ohi n’ụlọ akwụkwọ. Mpụ ndị ọzọ gụnyere ịgba ihe onwunwe ọkụ na iji ngwá ọgụ merụọ mmadụ ahụ. Ndị na-eto eto nọ n’afọ ndụ a na-ekwu na ọ bụ nrụgide ndị ọgbọ bụ isi ihe mere ha ji mee mpụ, ebe n’ihe banyere ndị gafeworo afọ 15, ihe yikarịrị ka ọ bụ ya na-akpata ha ji eme mpụ bụ inweta ego ha ga-eji ṅụọ ọgwụ ọjọọ.

Ụmụ Akwụkwọ Na-emeghasị Ihe

Kemgbe ụwa, Japan adịghị enwekebe nnupụisi nke ndị nọ n’afọ iri na ụma. Ma ndị nkụzi nọ n’akụkụ nile nke Japan na-akọzi na ọ na-esiwanye ike ime ka a nọrọ jụụ na klas n’ihi ụmụ akwụkwọ na-adịghị anọ otu ebe ma bụrụ ndị na-emeghasị ihe. Gọọmenti obodo Tokyo jụrụ ụmụ akwụkwọ dị afọ 9, 11, 14 ajụjụ iji chọpụta mmetụta ha na-enwe banyere ndị ọzọ. Dị ka  akwụkwọ akụkọ bụ́ The Daily Yomiuri si kwuo, pasent 65 kwuru na ike ndị enyi ha agwụwo ha nakwa na ha na-ewesara ha iwe, pasent 60 na-ewesara ndị mụrụ ha iwe, pasent 50 na-ewesakwara ndị nkụzi ha iwe. Pasent 40 kwuru na ha adịghị enwe ike ịchịkwa iwe ha ma ọ bụ na ọ na-esiri ha ike ime otú ahụ. Ịkụwasị ihe bụ ụzọ 1 onye n’ime ụmụ akwụkwọ 5 sịrị na ha na-esi egosipụta iwe ha.

“Nje Virus Dị Mgbagwoju Anya”

“Nje virus dị mgbagwoju anya dị n’ọbara ụmụ mmadụ n’akụkụ nile nke ụwa,” ka magazin bụ́ New Scientist na-akọ. “Ọ dịghị onye maara ma nje ‘TT’ nke a ọ dị ize ndụ, ma egwu ji onye ọ bụla na ọ pụrụ ịkpata ọrịa imeju.” A hụwo nje virus ahụ, nke a kpọrọ TT, bụ́ aha e si ná mkpụrụ akwụkwọ ndị bidoro aha onye Japan mbụ a chọpụtara ya n’ọbara ya, nweta, “ma n’ọbara ndị ọzọ nyere ma n’ahụ ndị na-arịa ọrịa imeju bụ́ ndị a mịnyere ọbara.” N’eziokwu, otu nnyocha gosiri na nje virus ahụ dị n’ahụ mmadụ 8 n’ime ndị California 102 ọ bụla nyere ọbara ha bụ́ ndị a chọpụtara na ọbara ha ebughị nje virus, gụnyere nje HIV na ịba ọcha n’anya nke B na C. A na-eme atụmatụ na ọ̀tụ̀tụ̀ e ji ebute nje virus ahụ bụ pasent 2 na Britain, pasent 4 ruo 6 na France, pasent 8 ruo 10 na United States, na pasent 13 na Japan. Ndị ọkà mmụta sayensị “na-amụ ihe banyere nje TT gburugburu ụwa achọghị nnọọ ime ka a malite ịtụ egwu,” ka isiokwu ahụ na-ekwu, ma ha chọrọ “ịchọpụta ma nje virus ahụ ọ̀ bụ ihe ize ndụ nye ahụ ike.”

Ihe A Na-anya n’Olu nke Na-echekwa Ndụ

Nkịta ọhịa na-atagbu ihe ruru pasent 40 nke ụmụ anụ ụlọ nke ndị na-akpa anụ ụlọ n’ebe ụfọdụ na South Africa n’oge ọ bụla a na-akpa ha n’afọ. Ọ bụghị nanị na nke a kpatara mfu ego kamakwa ọ kpatara njubiga ókè nke nkịta ọhịa. Mgbalị ndị e mere iji kpochapụ nkịta ọhịa ndị ahụ agaghị nke ọma, ọbụna o metụtara anụ ọhịa ndị ọzọ n’ụzọ dị njọ. Otú ọ dị, e nwetawo ihe ngwọta e ji ọgụgụ isi chepụta ma jiri ya mee ihe n’afọ ndị a. Ọ bụ ihe sitụrụ ike nke a na-anyawa atụrụ n’olu bụ́ nke a pụrụ ịgbanwe ọdịdị ya na nke a na-eji eme ihe ọtụtụ ugboro nakwa nke na-adịghị egbochi atụrụ ịgagharị agagharị ma ọ bụ na-adịghị emerụ nkịta ọhịa ahụ. Nanị ihe ọ na-eme bụ igbochi nkịta ọhịa ịtagbu anụ ụlọ. Dị ka akwụkwọ akụkọ Natal Witness si kwuo, ndị na-akpa anụ ụlọ bụ́ ndị nọworo na-anyawa atụrụ ha ihe ndị ahụ n’olu “kọrọ na ozugbo ahụ, nkịta ọhịa kwụsịrị kpam kpam ịtagbu anụ ụlọ ha.” N’ihi na e mere ka nkịta ọhịa ndị ahụ na-eri nanị ihe ndị ha na-ahụ n’ọhịa bụ́ ahụhụ, òké, na anụ ọhịa ndị nwụrụ anwụ, ọnụ ọgụgụ ha adalatawala.

Ebu nke Na-atụ Osisi

Ebu bụ́ ichneumon nwere ebe o ji eyi àkwá bụ́ nke “manganese ma ọ bụ zinc nke ghọrọ ion na-eme ka ha sie ike,” ka akwụkwọ bụ́ National Geographic na-akọ. Ebu na-eji ngwá ọrụ ya yiri ígwè wee tụọ ọnụ miri emi n’ogwe osisi iji yie àkwá n’ebe ọtị ndị bi n’osisi ahụ nọ. “Ụfọdụ pụrụ ịtụ ọnụ ruru sentimita asatọ n’ime osisi siri ike,” ka Donald Quicke nke Imperial College nke Britain, na-ekwu. Mgbe àkwá ndị ahụ ghọsịrị ebu, ha na-eri ọtị ndị ahụ na-atụ ọnụ n’osisi ma tapuo ụzọ ha ga-esi apụta n’osisi ahụ site n’iji akụkụ ọnụ ha nke ihe ndị dị n’ọtị ndị ahụ ha riri mere ka o sie ike.

“Ọnọdụ Mberede Na-apụtaghị Ìhè” nke India

“N’agbanyeghị ọganihu e nwere n’ahụ ike na ahụ ịdị mma n’afọ ole na ole gara aga, erighị ihe na-edozi ahụ ka bụ ‘ọnọdụ mberede na-apụtaghị ìhè’ n’India,” ka The Times of India na-akọ. Erighị ihe na-edozi ahụ na-eme ka ihe karịrị nde $230 funahụ India n’ihi nlekọta ahụ ike na arụpụtaghị ihe. Dị ka akụkọ ahụ si kwuo, ihe karịrị pasent 50 nke ụmụaka ndị India na-erubeghị afọ anọ adịghị eri ihe na-edozi ahụ, pasent 30 nke ụmụ ọhụrụ “tara nnọọ ahụ,” pasent 60 nke ndị inyom nwekwara ụkọ ọbara. Ọkachamara ọkwá ya dị elu n’ihe banyere ọganihu ọha na eze n’Ụlọ Akụ Ụwa, bụ́ Meera Chatterjee, na-ekwu na “ọ bụghị nanị na erighị ihe na-edozi ahụ na-ebibi ndụ ndị mmadụ na ezinụlọ kamakwa ọ na-ebelata ihe ego a na-etinye n’agụmakwụkwọ na-arụpụta ma bụrụ isi ihe na-egbochi ọganihu nke ọha mmadụ na nke akụ̀ na ụba.”

Hà Bụ Ndị Ụkọchukwu Na-enweghị Obi Ụtọ?

N’afọ isii gara aga, e mere nnyocha ugboro atọ iji mata otú ndị France si ele ndị ụkọchukwu anya. Dị ka e biputara n’akwụkwọ akụkọ ndị Katọlik bụ́ La Croix, nnyocha kasị ọhụrụ e mere na-egosi na pasent 45 nke ndị France adịghị ele ndị ụkọchukwu anya dị ka ndị nwere obi ụtọ ma ọ bụ ndị nwere afọ ojuju. Ndị mmadụ n’ozuzu ha ka na-ele ụkọchukwu anya dị ka onye nwere omume enyi na dị ka onye na-ege mmadụ ntị. Otú ọ dị, akwụkwọ akụkọ ahụ na-ekwu na “ọ bụ ndị France ole na ole na-ele ya anya dị ka onye dị ọha mmadụ mkpa” nakwa na ọ bụ nanị pasent 56 na-ahụ ya dị ka “onye àmà Chineke n’ụwa.” Ọ bụ ihe na-erughị 1 onye n’ime mmadụ 3 n’ime ọha na eze na nanị pasent 51 nke ndị na-ejechi chọọchị anya na-agba nwa ha ma ọ bụ onye ikwu ha ume ịghọ ụkọchukwu.