Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọrịa Na-adịghị Ala Ala—Nsogbu Ezinụlọ

Ọrịa Na-adịghị Ala Ala—Nsogbu Ezinụlọ

 Ọrịa Na-adịghị Ala Ala—Nsogbu Ezinụlọ

GỊNỊ bụ ọrịa na-adịghị ala ala? N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe, ọ bụ ọrịa na-adịte aka. Ọzọkwa, otu prọfesọ na-akọwa ọrịa na-adịghị ala ala dị ka “ọrịa nke ịwa ahụ nkịtị ma ọ bụ usoro ọgwụgwọ na-adịru nwa oge na-agaghị agwọta.” Ihe mere ọrịa na-adịghị ala ala ma ọ bụ ihe ndị ọ na-akpata ji abụ nnukwu ihe ịma aka abụghị nanị ọdịdị nke ọrịa ahụ na ọgwụgwọ ya kama ọ bụ n’ihi na a ghaghị idi ya ruo ogologo oge.

E wezụga nke ahụ, ọ bụchaghị nanị onye ahụ na-arịa ọrịa na-adịghị ala ala ka ọ na-emetụta. “Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ si n’ezinụlọ,” ka akwụkwọ bụ́ Motor Neurone Disease—A Family Affair na-ekwu, “ndị ị hụrụ n’anya ga-enwekwa mmetụta na nchegbu ị [onye ọrịa] na-enwe.” Otu nne nke nwa ya nwanyị na-arịa ọrịa cancer na-egosi na nke a bụ eziokwu. “Ọ na-emetụta onye òtù ọ bụla nke ezinụlọ,” ka ọ na-ekwu, “ma hà na-egosipụta ya ma ọ bụ mara banyere ya ma ọ bụ na ọ dịghị otú ahụ.”

Otú ọ dị, ọ gaghị emetụta mmadụ nile n’otu ụzọ ahụ. Ka o sina dị, ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ aghọta otú ọrịa na-adịghị ala ala si emetụta ndị mmadụ n’ozuzu ha, o yiri ka hà ga-enwe ike karị iche ihe ịma aka nke ọnọdụ ha pụrụ iche ihu. Ọzọkwa, ọ bụrụ na ndị na-abụghị ndị òtù ezinụlọ—ndị ha na mmadụ na-arụkọ ọrụ, ndị ha na mmadụ na-agakọ akwụkwọ, ndị agbata obi, ndị enyi—aghọta mmetụta nke ọrịa na-adịghị ala ala, ha ga-enwe ike karị inye nkwado gbara ọkpụrụkpụ ma gosi ọmịiko. N’iburu nke a n’uche, ka anyị leba anya n’ụzọ ụfọdụ ọrịa na-adịghị ala ala pụrụ isi metụta ezinụlọ.

Ime Njem Gabiga Ala A Na-amaghị Ama

A pụrụ iji ahụmahụ ezinụlọ n’ihe banyere ọrịa na-adịghị ala ala tụnyere ha ime njem gabiga ala ọzọ. Ọ bụ ezie na ihe ụfọdụ dị n’ebe ahụ na ndị dị n’obodo ezinụlọ ahụ si na ya ga-abụ nnọọ otu ihe, ihe ndị ọzọ ga-abụ ihe ọhụrụ ma ọ bụ dị nnọọ iche. Mgbe ọrịa na-adịghị ala ala dakwasịrị onye òtù ezinụlọ, ọtụtụ ihe ga-anọgide na-adị nnọọ otú ha dịbu n’ụzọ ndụ ezinụlọ ahụ. Otú ọ dị, ihe ụfọdụ ga-adị nnọọ iche.

Ná mmalite, ọrịa ahụ n’onwe ya pụrụ imetụta ihe ezinụlọ ahụ na-eme mgbe dum ma manye onye òtù ezinụlọ nke ọ bụla ime mgbanwe iji nagide ya. Helen dị afọ 14, bụ́ onye nne ya nwere oké ịda mbà n’obi, na-egosi na nke a bụ eziokwu. “Anyị na-eme mgbanwe n’usoro  ihe omume anyị ka o kwekọọ n’ihe ndị mama anyị ga-emeli ma ọ bụ ihe ndị ọ na-agaghị emeli n’ụbọchị nke ọ bụla,” ka ọ na-ekwu.

Ọbụna usoro ọgwụgwọ—nke e zubere iji mee ka ọrịa ahụ belata—pụrụ ịkpaghasịkwu ihe omume ọhụrụ nke ezinụlọ. Tụlee ihe atụ nke Braam na Ann, bụ́ ndị e kwuru banyere ha n’isiokwu bu nke a ụzọ. “Anyị mere nnukwu mgbanwe n’ihe anyị na-eme kwa ụbọchị n’ihi usoro ọgwụgwọ a na-enye ụmụ anyị,” ka Braam na-ekwu. Ann na-akọwa, sị: “Anyị na-eje ma na-alọta site n’ụlọ ọgwụ kwa ụbọchị. Tụkwasịkwa na nke ahụ, dọkịta tụrụ aro ka anyị na-enye ụmụ anyị nri na-ebughị ibu ugboro isii kwa ụbọchị iji dochie ụkọ ihe ndị na-edozi ahụ nke ọrịa ha kpatara. Nye m, ọ bụ kpam kpam ụzọ ọhụrụ nke isi nri.” Ọbụna nke ka bụrụ ihe ịma aka bụ inyere ụmụ anyị aka inwe mmega ahụ e kwuru ka ha na-enwe ka ahụ wee gbasie ha ike. “Nke ahụ,” ka Ann na-echeta, “bụ ọgụ a na-alụ kwa ụbọchị iji mezuo ọchịchọ dịgasị iche.”

Ka onye ọrịa ahụ na-anagide ahụ erughị ala—mgbe ụfọdụ kwa ihe mgbu—nke ọgwụgwọ ahụ na nnyocha nke ndị ọrụ ahụ ike na-eme kpatara, ọ na-adabere n’ebe ezinụlọ ya nọ karị maka enyemaka na nkwado dị ya mkpa n’ụzọ mmetụta uche. N’ihi ya, ọ bụghị nanị na ndị òtù ezinụlọ aghaghị ịmụta nkà ọhụrụ iji lekọta onye ọrịa ahụ n’ụzọ anụ ahụ kamakwa ha nile aghaghị ịgbanwe àgwà, mmetụta uche, ụzọ ndụ ha, na ihe ndị ha na-eme mgbe dum.

O kwere nghọta na ihe ndị a nile na-achọ ntachi obi n’aka ezinụlọ ahụ. Otu nne nke nwa ya nwanyị nọ n’ụlọ ọgwụ ebe a na-agwọ ya ọrịa cancer na-ekwukwa na ọ pụrụ “ịdị na-agwụ ike karịa ka onye ọ bụla ọzọ pụrụ ichetụ n’echiche.”

Mgbagwoju Anya Na-aga n’Ihu

“A latụ ihu a latụ azụ na-aga n’ihu n’ihu nke dị n’ọrịa na-adịghị ala ala na-akpata mgbagwoju anya dị egwu,” ka Coping With Chronic Illness—Overcoming Powerlessness na-ekwu. Ozugbo ndị òtù ezinụlọ na-amalite ịnagide ọnọdụ ndị dị adị, ha pụrụ ịdaba ná ndị ọzọ dị iche, bụ́ ndị pụkwara isi ike karị. Mgbaàmà ya pụrụ ịgbanwe ma ọ bụ ka njọ na mberede, usoro ọgwụgwọ nwekwara ike ghara ịrụ ọrụ a tụrụ anya ka ọ rụọ. Ọgwụgwọ ahụ pụrụ ịbụ nke a na-aghaghị ịgbanwe site n’oge ruo n’oge ma ọ bụ ọ pụrụ ịkpata nsogbu ndị a na-atụghị anya ha. Ka onye ọrịa ahụ na-adaberekwu ná  nkwado nke ezinụlọ ya nọ ná mgbagwoju anya na-agbalisi ike inye ya, mmetụta uche ndị ọ chịkwaburu pụrụ irikpu ya na mberede.

Ọtụtụ ọrịa na ọgwụgwọ ha a na-apụghị ịkọ otú ha ga-adị echi na-akpatakarị ajụjụ ndị dị ka: Ruo ole mgbe ka ihe a ga-adịgide? Ruo ókè hà aṅaa ka ọrịa ahụ ga-akaru njọ? Ruo ole mgbe ka anyị ga-ediru ihe a? Ọrịa na-enweghị ngwọta na-akpatakarị oké mgbagwoju anya—“Ogologo oge hà aṅaa ga-agafe tupu ọ nwụọ?”

Ọrịa ahụ, usoro ọgwụgwọ, ike ọgwụgwụ, na mgbagwoju anya ha nile na-ejikọta aka akpata ihe ọzọ a na-atụghị anya ya.

Mmetụta Ọ Na-enwe ná Mmekọrịta Mmadụ na Ndị Ọzọ

“Aghaghị m ịnagide mkpasu iwe nke nkewapụ iche na nke ịbụ onye na-apụghị ịkpapụ akpapụ na-akpata,” ka Kathleen, bụ́ onye di ya nwere oké ịda mbà n’obi na-akọwa. “Ọnọdụ ahụ enweghị nkwụsị,” ka ọ gara n’ihu na-ekwu, “n’ihi na ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị nwere ike ịkpọ ndị ọzọ òkù ma ọ bụ zaa òkù maka iso ha mekọrịta ihe. Ka oge na-aga, ọ fọrọ nke nta ka mmekọrịta anyị na ndị ọzọ ghara ịdị adị.” Dịkwa ka Kathleen, ọtụtụ ndị aghaghị ịnagide obi amamikpe maka ịbụ ndị na-adịghị ele ọbịa na ịbụ ndị na-adịghị aza òkù. N’ihi gịnị ka nke a ji eme?

Ọrịa ahụ n’onwe ya ma ọ bụ nsogbu ndị ọgwụgwọ ya na-akpata pụrụ ime ka o sie ike ikere òkè n’ihe omume ọha na eze ma ọ bụ ọbụna mee ka ọ ghara ikwe omume. Ezinụlọ ahụ na onye ọrịa pụrụ iche na ọrịa ahụ bụ ihe ihere n’anya ọha na eze, ma ọ bụ ha pụrụ ịtụ egwu na ọ pụrụ imechu ha ihu. Ịda mbà n’obi pụrụ ime ka onye ọrịa ahụ chee na ya erukwaghị eru inwe ndị enyi ya nweburu, ma ọ bụ ọ pụrụ nnọọ ịbụ na ike agakwaghị adị ezinụlọ ya isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe. N’ihi ọtụtụ ihe, ọrịa na-adịghị ala ala pụrụ ime n’ụzọ dị mfe ka ezinụlọ ahụ dum kewapụ onwe ha iche, kpatakwara ha owu ọmụma.

Ọzọkwa, ọ bụghị mmadụ nile ga-ama ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ụzọ ha ga-esi meghachi omume n’ihu onye ahụ na-arịa ọrịa. (Lee igbe bụ́ “Ụzọ Ị Pụrụ Isi Nye Aka,” dị na peji nke 11.) “Mgbe nwa gị gbapụrụ iche n’ebe ụmụaka ndị ọzọ nọ, ọtụtụ ndị mmadụ ga na-ele ya anya ma na-ekwu ọtụtụ ihe n’ebughị ụzọ chee echiche,” ka Ann na-ekwu. N’ezie, ị ga na-atakarị onwe gị ụta maka ọrịa ahụ, ihe ndị ha na-ekwu ga na-akpatakwuru gị obi amamikpe.” Ihe Ann na-ekwu metụtara ihe ọzọ ezinụlọ pụrụ inwe.

Mmetụta Ndị Na-akpasasị Uche

“Mgbe a chọpụtara ọrịa, ihe ka n’ọtụtụ ezinụlọ na-atụ egwu, ha adịghịkwa ekweta na ọ bụ eziokwu,” ka otu onye na-eme nchọpụta na-ekwu. “Ọ na-esi ike odidi.” Ee, ọ pụrụ ịdị mwute ịnụ na onye mmadụ hụrụ n’anya na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta ma ọ bụ ọrịa na-akpata ike ọgwụgwụ. Ezinụlọ pụrụ iche na olileanya na atụmanya ha adakpọọla, na-eme ka ha nwee ọdịnihu a na-ejighị n’aka na mmetụta nke mfu nakwa mwute.

N’ezie, nye ọtụtụ ezinụlọ bụ́ ndị hụworo ajọ mgbaàmà ndị dịteworo aka n’ahụ onye òtù ezinụlọ ha n’amataghị ihe kpatara ya, ịchọpụta ihe kpatara ya pụrụ ime ka obi ruo ha ala. Ma ụfọdụ ezinụlọ pụrụ imeghachi omume n’ụzọ dị iche nye nchọpụta ahụ. Otu nne na South Africa na-ekweta, sị: “O wutere m nke ukwuu ịbụ onye e mesịrị gwa ihe na-eme ụmụ anyị nke na, n’ezie, ọ gaara akara m mma ma a sị na anụghị m ihe a chọpụtara.”

Akwụkwọ bụ́ A Special Child in the Family —Living With Your Sick or Disabled Child na-akọwa na “ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị na ị ga-enwe mkpasasị uche . . . ka ị na-eme mgbanwe iji kwekọọ n’ọnọdụ ọhụrụ a. Mgbe ụfọdụ mmetụta gị pụrụ isi ike nke na ị ga na-atụ egwu na ị pụghị ịnagide ha.” Onye dere akwụkwọ ahụ, bụ́ Diana Kimpton, bụ́ onye ụmụ ya ndị nwoke abụọ rịara ọrịa cystic fibrosis, na-akọ, sị: “M tụrụ mmetụta m egwu, ọ dịkwa m mkpa ịmata na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị inwe mwute dị ukwuu.”

Ọ bụghị ihe ọhụrụ ezinụlọ ịtụ egwu—egwu ihe a na-amaghị, egwu ọrịa, egwu ọgwụgwọ, egwu ihe mgbu, na egwu ọnwụ. Ụmụaka karịsịa pụrụ inwe ọtụtụ ihe ha na-amaghị ha na-atụ egwu ha—nke ka nke ma ọ bụrụ na e jighị ezi uche kọwaara ha ihe na-aganụ.

Ọtụtụ na-ewekwa iwe. “Ndị òtù ezinụlọ,” ka magazin South Africa bụ́ TLC na-akọwa, “pụrụ ịghọ ndị ndị ọrịa na-ewesa iwe.” Ndị òtù ezinụlọ, n’aka nke ha, pụrụ iwe iwe—megide ndị dọkịta maka achọpụtaghị nsogbu ahụ ngwa ngwa, megide onwe ha maka ibufe mkpụrụ ndụ ihe nketa nwere ntụpọ, megide onye ọrịa ahụ maka elekọtaghị onwe ya nke ọma, megide Setan bụ́ Ekwensu maka ịkpata ahụhụ dị otú ahụ, ma ọ bụ ọbụna megide Chineke, na-eche na ọ bụ ya ka ụta dịịrị maka ọrịa ahụ. Obi amamikpe bụ mmeghachi omume ọzọ ọrịa na-adịghị ala ala na-akpata. “Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nne ma ọ bụ nna ma ọ bụ nwanne ọ bụla nke nwatakịrị na-arịa ọrịa cancer na-enwe obi amamikpe,” ka akwụkwọ bụ́ Children With Cancer—A Comprehensive Reference Guide for Parents, na-ekwu.

Mkpasasị uche a na-akpatakarị ịda mbà n’obi—ruo n’ókè ụfọdụ. “Ma eleghị anya nke a bụ mmeghachi omume nke mmadụ nile na-akasị enwe,” ka otu onye na-eme nchọpụta dere. “Enwere m faịlụ jupụtara n’akwụkwọ ozi iji gosi na ọ bụ eziokwu.”

Ee, Ezinụlọ Pụrụ Ịnagide Ya

N’akụkụ na-enye olileanya, ọtụtụ ezinụlọ achọpụtawo na ịnagide ọnọdụ ahụ esirughị ike otú o yiri ná mmalite. “Ihe ị ga-eji anya nke uche gị hụ ga-adị nnọọ njọ karịa ka ọ dị n’ezie,” ka Diana Kimpton na-emesi obi ike. Site n’ihe meworo ya ọ chọpụtara na “ọdịnihu adịchaghị njọ otú ahụ ọ dị mgbe i ji anya nke uche gị na-ahụ ya ná mmalite.” Jide n’aka na ezinụlọ ndị ọzọ enwewo ihe ịga nke ọma na njem ha mere gabiga ala ha na-amaghị nke ọrịa na-adịghị ala ala, ị pụkwara inwe ihe ịga nke ọma. Ọtụtụ ndị achọpụtawo na nanị ịmata na ndị ọzọ anagidewo ya emewo ka obi rutụ ha ala, nyekwa ha olileanya.

Otú ọ dị, ezinụlọ pụrụ ịjụ n’ụzọ ezi uche dị na ya,‘Olee otú anyị pụrụ isi nagide ya?’ Isiokwu na-esonụ ga-atụle ụfọdụ n’ime ụzọ dị iche iche ọtụtụ ezinụlọ siworo nagide ọrịa na-adịghị ala ala.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]

Ọ dị ezinụlọ mkpa ilekọta onye ọrịa ahụ na ịgbanwe àgwà, mmetụta uche, na ụzọ ndụ nke ha onwe ha

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]

Ma onye ọrịa ma ezinụlọ ya ga-enwe mwute

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]

Enwela obi nkoropụ. Ezinụlọ ndị ọzọ anagidewo ya, ị pụkwara ịnagide ya

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ihe Ịma Aka Ụfọdụ nke Ọrịa Na-adịghị Ala Ala

• Ịmata banyere ọrịa ahụ na ụzọ isi nagide ya

• Mmadụ ime mgbanwe n’ụzọ ndụ ya na n’ihe ndị ọ na-eme kwa ụbọchị

• Ịnagide mmekọrịta mmadụ na ndị ọzọ nke gbanwere agbanwe

• Ịnọgide na-enwe mmetụta uche dị mma ma na-achịkwa mmetụta

• Inwe mwute n’ihi mfu ndị ọrịa ahụ kpatara

• Ịnagide mmetụta uche ndị siri ike

• Ịnọgide na-enwe echiche ziri ezi