Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Gịnị Ka Ị Ga-eme n’Afọ E Nwere Ụkọ Mmiri Ozuzo?

Gịnị Ka Ị Ga-eme n’Afọ E Nwere Ụkọ Mmiri Ozuzo?

Inwe okwukwe na ịtụkwasị Jehova obi dị anyị mkpa. Dị ka ihe atụ, Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe siri ike, ọ ga-eme ka anyị tụkwasị Jehova obi na ọ ga na-echebe anyị ma na-elekọta anyị. (Ọma 23:​1, 4; 78:22) Ka ọgwụgwụ ụwa a ji ọsọ na-abịa, anyị ga-atụ anya na Ekwensu ga na-emesikwu anyị ike. (Mkpu. 12:12) Olee ihe ga-enyere anyị aka?

LEENỤ VIDIO BỤ́, GỊNỊ KA Ị GA-EME N’AFỌ E NWERE ỤKỌ MMIRI OZUZO? ZAAKWANỤ AJỤJỤ NDỊ A:

  1. Olee otú anyị si dịrị ka “osisi” ahụ e kwuru okwu ya na Jeremaya 17:8?

  2. Olee otu ụdị “okpomọkụ” e nwere ike inwe?

  3. Ò nwere ihe nsogbu ndị ahụ mere “osisi” ahụ, n’ihi gịnịkwa?

  4. Olee ihe Ekwensu chọrọ imebi?

  5. Olee otú anyị si dịrị ka ndị iji ụgbọelu eme njem maara ahụ́?

  6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji nọgide na-atụkwasị ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche obi, oleekwa otú e nwere ike isi nwalee ma ànyị tụkwasịrị ha obi n’eziokwu?

  7. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na ime ihe Baịbụl kwuru kacha mma, ọ bụrụgodị na ndị mmadụ ana-eme anyị akaja?