Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JỌN 3-4

Jizọs Ezie Nwaanyị Sameria Ozi Ọma

Jizọs Ezie Nwaanyị Sameria Ozi Ọma

4:6-26, 39-41

Gịnị nyeere Jizọs aka izi nwaanyị Sameria ahụ ozi ọma?

  • 4:7—Kama ịgwawa nwaanyị ahụ gbasara Alaeze Chineke ma ọ bụ ime ka ọ mara na ya bụ Mesaya, o bu ụzọ rịọ ya ka o nye ya mmiri ka ọ ṅụọ

  • 4:9—O ledaghị nwaanyị Sameria ahụ anya n’ihi agbụrụ ya

  • 4:9, 12—Mgbe nwaanyị ahụ kwuru ihe ndị nwere ike ime ka ya na Jizọs rụwa ụka, Jizọs ji akọ zere ha ma lekwasị anya n’ihe ọ chọrọ ịgwa ya.—cf 77 ¶3

  • 4:10—O ji ihe atụ metụtara ihe nwaanyị ahụ na-eme kwa ụbọchị malite ịgwa ya okwu

  • 4:16-19—N’agbanyeghị na nwaanyị ahụ na-ebi ndụ rụrụ arụ, Jizọs kwanyeere ya ùgwù

Olee otú akụkọ a si gosi na ọ dị mkpa anyị ịna-agba àmà mgbe anyị na-anọghị n’ozi?