Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ OMA 135-141

E Kere Anyị n’Ụzọ Dị Ebube

E Kere Anyị n’Ụzọ Dị Ebube

Devid tụgharịrị uche n’àgwà ọma ndị Chineke nwere. Ọ chọpụtara àgwà ndị a mgbe ọ na-ekiri ihe ndị Chineke kere eke. Ihe ndị a nyeere ya aka iji obi ya niile fee Jehova.

Mgbe Devid chere echiche nke ọma banyere ihe ndị Chineke kere, o mere ka o too Jehova:

139:14

  • “M ga-eto gị n’ihi na i kere m n’ụzọ dị egwu, dịkwa ebube”

139:15

  • “E zonahụghị gị ọkpụkpụ m mgbe i mere m na nzuzo, mgbe ị kpara m dị ka ákwà n’ime ime ala”

139:16

  • “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ, e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị”