Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | HOSIA 1-7

Jehova Bụ Chineke Na-ahụ n’Anya, Olee Maka Gịnwa?

Jehova Bụ Chineke Na-ahụ n’Anya, Olee Maka Gịnwa?

Onye nwere ezigbo ịhụnanya na-ekwesị ntụkwasị obi n’ebe onye ahụ ọ hụrụ n’anya nọ, ihe ọ sọkwara ya mee. Jehova ji ihe mere n’etiti Hosia na nwunye ya Goma na-akwa iko, kụziere anyị otú anyị kwesịrị isi na-egosi ịhụnanya ma na-agbaghara mmejọ.​—⁠Hos. 1:2; 2:7; 3:​1-5.

Olee otú Goma si gosi na ya enweghị ịhụnanya?

Olee otú ndị Izrel si gosi na ha enweghị ịhụnanya?

Olee otú Hosia si gosi na ya nwere ịhụnanya?

Olee otú Jehova si gosi ịhụnanya ya?

IHE Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: Olee otú m ga-esi gosi na m hụrụ Jehova n’anya?