Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Na-eso Kraịst

Nyerenụ Ụmụ Unu Aka Ka Ha Na-eso Kraịst

O nweghị ihe na-eme ndị nne na nna bụ́ Ndị Kraịst obi ụtọ ka ịhụ ka ụmụ ha ‘jụrụ onwe ha ma bulie osisi ịta ahụhụ ha, na-eso Jizọs mgbe niile.’ (Mak 8:34; 3 Jọn 4) Olee ihe ndị nne na nna ga-eme iji nyere ụmụ ha aka ịna-eso Jizọs, nyefee Jehova onwe ha ma mee baptizim? Olee ihe ụfọdụ ga-egosi na nwatakịrị eruola ime baptizim?

Gụọnụ isiokwu bụ́ “Ihe A Chọrọ Ka Ndị Nne na Nna Bụ́ Ndị Kraịst Mee” dị na peeji nke 165-166 n’akwụkwọ Ndị A Haziri Ime Uche Jehova, mgbe unu na-akwadebe ọmụmụ ihe. Zaakwanụ ajụjụ ndị a:

  1. Ònye bụ onye na-eso ụzọ?

  2. Olee ihe ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha?

  3. N’iburu afọ ndụ nwatakịrị nke ọ bụla n’uche, olee otú nwatakịrị kwesịrị isi mee ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị a ka o nwee ike iru eru ime baptizim?