Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JOB 11-15

Obi Siri Job Ike na A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

Obi Siri Job Ike na A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

Job kwuru ihe gosiri na obi siri ya ike na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma ya nwụọ

14:7-9, 13-15

  • Job ji osisi kọwaa ihe mere obi ji sie ya ike na Chineke ga-akpọlite ya n’ọnwụ ma ya nwụọ. Ọ ga-abụ na ọ bụ osisi oliv ka o bu n’obi mee ihe atụ ahụ

  • Otú mgbọrọgwụ osisi oliv si abami n’ime ala na-eme ka úkwù ya pulite ome ma e gbutuo ya. Mgbọrọgwụ ya dịrịhaala ndụ, ọ ga-eto ọzọ

  • A sịgodị na úkwù osisi oliv kpọrọ nkụ n’oge oké ọkọchị, mmiri zoo, ọ ga-epu ome, malitekwa ịwa alaka