Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu

Kwụsịnụ Ichegbu Onwe Unu

N’ozizi elu ugwu ahụ, Jizọs kwuru, sị: “Kwụsịnụ ichegbu onwe unu banyere mkpụrụ obi unu.” (Mat. 6:25) Ọ bụ eziokwu na ụmụ mmadụ na-ezughị okè bi n’ụwa Setan na-echegbukarị onwe ha mgbe ụfọdụ, Jizọs na-agwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha ghara ichegbubiga onwe ha ókè. (Ọma 13:2) Gịnị mere o ji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na nchekasị maka ihe ndị e ji ebi ndụ nwere ike ịdọpụ uche anyị, mee ka o siere anyị ike iburu ụzọ na-achọ Alaeze ahụ. (Mat. 6:33) Ihe ndị ọzọ Jizọs kwuziri ga-enyere anyị aka ka anyị ghara ikwe ka ihe na-enweghị isi na ọdụ na-echegbu anyị.

Olee ihe ndị m chọrọ ịkwụsị ichegbu onwe m maka ha?