Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | MATIU 1-3

“Alaeze Eluigwe Eruwo Nso”

“Alaeze Eluigwe Eruwo Nso”

3:4

  • Uwe Jọn na ejiji ya na-eme ka mmadụ mata na o bighị ndụ okomoko, kama na o ji ndụ ya niile na-ejeere Jehova ozi

  • Ọrụ pụrụ iche Jọn rụrụ ka onye kwadebeere Jizọs ụzọ ka mkpa karịa ihe ndị ọ hapụrụ

Ibi ndụ dị mfe ga-eme ka anyị nwee ohere anyị ga-eji jekwuoro Jehova ozi, meekwa ka anyị na-enwe obi ụtọ. Anyị nwere ike ime ka ndụ anyị dịkwuo mfe ma anyị . . .

  • mata ihe ndị dị anyị mkpa n’eziokwu

  • ghara ịzụ ihe ọ bụla anyị hụrụ

  • depụta otú anyị ga-esi na-emefu ego

  • tụfuo ihe ndị na-adịghịzi anyị mkpa

  • kwụọ ụgwọ ndị anyị ji

  • selata aka n’ọrụ ego ndị na-ewekọrọ oge anyị

Nri Jọn bụ igurube na mmanụ aṅụ

Olee ihe ndị ibi ndụ dị mfe ga-enye m ohere ime?