Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl

Otú Anyị Ga-esi Jiri Broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke Na-amụrụ Ndị Mmadụ Baịbụl
  1. Buru ụzọ jụọ ajụjụ paragraf unu chọrọ ịtụle ka onye ahụ buru ya n’uche.

  2. Gụzienụ paragraf ahụ.

  3. Gụọnụ amaokwu Baịbụl e kwuru ka a gụọ, gị ajụọ ya ajụjụ ụfọdụ ga-eme ka o jiri ihe amaokwu ahụ kwuru zaa ajụjụ paragraf ahụ.

  4. Ọ bụrụ na paragraf dị́ n’okpuru ajụjụ ahụ karịrị otu, meekwanụ ihe a e kwuru na nke abụọ na nke atọ. Ọ bụrụ na e nwere vidio dị na jw.org/ig gbasara ihe ahụ unu na-amụ, kpọnyere ya onye ahụ.

  5. Jụghachi ya ajụjụ paragraf ahụ ka ị mata ma ọ̀ ghọtakwara ihe paragraf ahụ na-ekwu.