Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndịàmà Jehova

Họrọ asụsụ Igbo

Eprel 1-​7

1 NDỊ KỌRỊNT 7-9

Eprel 1-​7
  • Abụ nke 136 na Ekpere

  • Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

  • Mmadụ Ịnọ n’Alụghị Di ma Ọ Bụ Nwunye Bụ Onyinye”: (Nkeji 10)

    • 1 Kọr. 7:32​—Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ga-ejeliri Jehova ozi otú ha chọrọ n’ihi na ha anaghị enwe nchegbu ndị lụrụlanụ na-enwe (w11 1/15 17-18 ¶3)

    • 1 Kọr. 7:​33, 34​—Ndị Kraịst lụrụla di ma ọ bụ nwunye ‘na-echegbu onwe ha maka ihe nke ụwa’ (w08 7/15 27 ¶1)

    • 1 Kọr. 7:​37, 38​—Ndị Kraịst hapụrụ ịlụ di ma ọ bụ nwunye iji jekwuoro Jehova ozi ‘ga-eme nke ọma karịa’ Ndị Kraịst lụrụnụ (w96 10/15 12-13 ¶14)

  • Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)

    • 1 Kọr. 7:11​—Olee ihe ndị nwere ike ime ka Onye Kraịst kpebie na ya na di ya ma ọ bụ nwunye ya ga-ekewa? (lv 220-221)

    • 1 Kọr. 7:36​—Gịnị mere Onye Kraịst kwesịrị iji chere ruo mgbe ọ ‘gafere oge ntoju ntorobịa’ tupu ya alụọ di ma ọ bụ nwunye? (w00 7/15 31 ¶2)

    • Gịnị ka ọgụgụ Baịbụl nke izu a kụziiri gị gbasara Jehova?

    • Olee ihe ndị ọzọ ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a?

  • Ọgụgụ Baịbụl: (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya) 1 Kọr. 8:​1-13 (th ihe ọmụmụ nke 5)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 37

  • Jiri Oge Ị Na-alụbeghị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Mee Ihe Bara Uru: (Nkeji 15) Kpọnye vidio ahụ. Jụzie ụmụnna ajụjụ ndị a: Olee nsogbu ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye na-enwe? (1 Kọr. 7:39) Gịnị mere e kwesịrị iji ṅomie ada Jefta? Olee ihe Jehova ga-emere ndị na-eje ije n’enweghị ntụpọ? (Ọma 84:11) Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ ga-esi na-agba ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye ume? Olee ụfọdụ ihe Ndị Kraịst na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nwere ike ime ná nzukọ Jehova?

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: (Nkeji 30) jy isi nke 61

  • Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)

  • Abụ nke 42 na Ekpere