Ebe ndị nkwusa abụọ ji broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke na-ezi ozi ọma n’Azebaịjan

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ Ọgọst 2017

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye mmadụ Teta! nakwa otú e nwere ike isi jiri ebe sịrị Na-akụzi Eziokwu kụziere mmadụ gbasara ihe mere Chineke ji kee ụmụ mmadụ. Dee otú ị ga-esi eme nke gị.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Jehova Kwụrụ Mba Na-ekpere Arụsị Ụgwọ

Jehova kwụrụ ndị Babịlọn ụgwọ maka ịnọchibido Taya afọ iri na atọ. Olee otú o si egosi anyị na obi dị ya ụtọ maka ozi anyị na-ejere ya na maka ịkwụsị ike n’ebe ọ nọ?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-akpa Àgwà E Ji Mara Ndị Chineke​—⁠Ịdị Umeala n’Obi

Gịnị mere ịdị umeala n’obi dị mkpa? Olee otú anyị ga-esi na-egosi ịdị umeala n’obi? Olee otú ikpe ekpere na otú Jizọs si gosi na ọ dị umeala n’obi ga-esi nyere anyị aka ịna-adị umeala n’obi?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Nnukwu Ọrụ Dịịrị Onye Nche

Orụ dịịrị onye nche bụ ịgbara ndị obodo ya àmà maka ọdachi na-abịanụ. Gịnị mere Jehova ji họpụta Ezikiel ka ọ bụrụ onye nche nke ụlọ Izrel?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-akpa Àgwà E Ji Mara Ndị Chineke​—⁠Obi Ike

Olee ihe mere anyị kwesịrị iji kwụsị ịna-atụ egwu mmadụ? Olee otú ịtụgharị uche, ikpe ekpere, na ịtụkwasị Jehova obi ga-esi nyere anyị aka inwe obi ike?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

A Ga-ebibi Gọg nke Megọg n’Oge Na-adịghị Anya

Baịbụl kwuru ihe ndị ga-eme tupu e bibie Gọg nke Megọg nakwa ihe ga-eme ma e bibichaa ya.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Na-akpa Àgwà E Ji Mara Ndị Chineke​—⁠Okwukwe

Dị ka Ebreham, anyị kwesịrị igosi na anyị nwere okwukwe na Chineke ma mgbe ihe siri ezigbo ike. Olee otú anyị ga-esi wusie okwukwe anyị ike ma guzosie ike n’ebe Jehova nọ?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Ihe Ụlọ Nsọ Ezikiel Hụrụ n’Ọhụụ Na-akụziri Gị

Ụlọ nsọ ahụ Ezikiel hụrụ n’ọhụụ na-echetara anyị na ofufe Jehova na-anabata bụ ofufe dị ọcha. Gịnị ka ọhụụ a na-akpali anyị ime?

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Olee Mgbe Ọzọ M Ga-arụ Ọsụ Ụzọ Inyeaka?

Otu ụzọ magburu onwe ya anyị ga-esi na-achụ àjà otuto bụ ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ì nwere ike iji ya mee ka ozi gị kakwuo mma?