VIRGILIJUS PUDŽIUVYS | AKỤKỌ NDỤ
Jehova Na-enyere Anyị Aka Mgbe Niile
Ezinụlọ anyị agaghị echefu nleta pụrụ iche nwanne mama m na nwunye ya letara anyị n’afọ 1976. Nwanne mama m ahụ gwara papa m na mama m na e nwere ihe ọhụrụ ọ mụtara na Baịbụl, n’ihi na n’oge ahụ, ya na Ndịàmà Jehova na-amụ Baịbụl. Ọ gwara papa m na mama m ihe Jizọs kwuru na Matiu isi 23 banyere ndị isi okpukpe n’oge ya, kọwaziere ha otú ndị isi okpukpe oge Jizọs ahụ si yie ndị nke oge anyị a. Mama m bu ihe gbasara chọọchị Katọlik n’isi, n’ihi ya, o kwetaghị na Jizọs katọrọ ndị isi okpukpe n’ezoghị ọnụ. O kpebiziri na ọ ga-eji aka ya chọpụta ihe Baịbụl kwuru.
N’oge ahụ, anyị bi na Lituenia, o sokwa n’ebe ndị a na-akpọ Sọviet Yuniọn mgbe ahụ. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole nwere Baịbụl n’oge ahụ n’ihi na ndị ọchịchị machiri ndị mmadụ ime ọtụtụ ihe gbasara okpukpe. N’ihi ya, mama m gara n’otu chọọchị gbaziri Baịbụl, jiri aka ya gụọ ya, chọpụtazie na Jizọs katọrọ ndị isi okpukpe oge ya n’eziokwu maka na ha na-eme ihu abụọ. Ihe a tọrọ mama m ezigbo ụtọ, ya achọọ ịmatakwu ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru. N’ihi ya, ọ natara Onyeàmà Jehova ya na nwanne ya nwoke ahụ na-amụ Baịbụl akwụkwọ ụfọdụ Ndịàmà Jehova bipụtara.
O teghị aka, ezinụlọ anyị amalite ịga ọmụmụ ihe Ndịàmà Jehova. Ebe ọ bụ na a machiri ọrụ ha n’oge ahụ, ọ bụghị otu ebe ka ha na-anọ enwe ọmụmụ ihe ha. Oge ụfọdụ, a na-enwe ya n’ọhịa dị nso n’ebe anyị bi. E mere mụ na mama m na ejima m aha ya bụ Danguolė baptizim n’afọ 1978 anyị abụrụ Ndịàmà Jehova. Mụ na ejima m dị afọ iri na ise n’oge ahụ. E mere papa m baptizim mgbe afọ ole na ole gachara.
Mụ na ejima m bụ́ Danguolė mgbe anyị dị afọ anọ
Jehova Nyeere M Aka Mgbe M Na-eto Eto
Otu ọnwa anyị mechara baptizim, a malitere ịkpagbu mụ na Danguolė n’ụlọ akwụkwọ. Mgbe a nọ na-eme otu nnọkọ pụrụ iche n’ụlọ nzukọ dị n’ụlọ akwụkwọ anyị, ndị nkụzi anyị chọpụtara na anyị ebilighị ọtọ mgbe a na-ekwe ukwe e ji eto mba Sọviet Yuniọn n’ihi ihe anyị kweere. Ha gara gwa onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị aha anyị na ihe merenụ. Onyeisi ụlọ akwụkwọ anyị gaziri gwa ndị uwe ojii nzuzo gbasara anyị, ha abịazie n’ụlọ anyị gbaa anyị ajụjụ ọnụ.
Mụ na Danguolė gbakwara mbọ ka anyị ghara ikweta ihe ndị nkụzi anyị na-ekwu, ya bụ, na Chineke adịghị. Dị ka ihe atụ, mgbe anyị dị afọ iri na isii, a gwara ndị klas anyị ka onye ọ bụla dee ihe mere na o kweghị na Chineke. Ebe ọ bụ na m kweere na Chineke dị, m dere n’otu mpempe akwụkwọ na “Ekweere M na Chineke Dị” ma dowe ya n’elu tebụl m. Mgbe onye nkụzi anyị hụrụ akwụkwọ ahụ, ezigbo iwe were ya, ya ejiri olu ike sị m, “Dee ihe mere i ji kwere na Chineke dị.” Obi tọrọ m ezigbo ụtọ na ọ gwara m dee gbasara ihe m kweere. Nwanne m nwaanyị dewekwara ihe mere o ji kwere na Chineke dị. Mgbe ụmụ agbọghọ abụọ ọzọ hụrụ ihe anyị na-ede, ha dekwara ihe mere ha ji kwere na Chineke dị. Ihe a bụ naanị otu n’ime ọtụtụ oge m hụrụ otú Jehova si ‘enyere anyị aka’ n’oge nsogbu.—1 Ndị Kọrịnt 10:13.
Ụmụnna na-edu ndú n’ọgbakọ gbazinyere anyị akwụkwọ Ndịàmà Jehova bipụtara bụ́ Site Na Paradais Etufuru Rue Paradais Enweghachiri, ka anyị gụọ ya otu ọnwa. Ihe m ma bụ na n’oge ahụ, akwụkwọ ahụ akarịghị mkpụrụ anọ ma ọ bụ ise na Lituenia niile. Mụ na Danguolė nọ na-agwa ibe anyị na “Obi gaara atọ anyị ezigbo ụtọ ma a sị na ha ga-ahapụrụ anyị akwụkwọ a.” Ma ebe ọ bụ na ha agaghị ahapụrụ anyị ya, anyị meziri ihe kacha mma anyị nwere ike ime, ya bụ, anyị ji aka depụtaghachi ihe niile dị n’akwụkwọ ahụ. Anyị degidere ihe a aka afụwa anyị ụfụ, ma obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị dechara ya ma si otú ahụ nwee akwụkwọ anyị ga-eji na-eme ka okwukwe anyị sie ike.
Obere oge m ruru afọ iri na itoolu, a tụrụ m mkpọrọ afọ abụọ n’afọ 1982 maka na ekweghị m aba amị. Ebe ọ bụ ndị omekome gbara m gburugburu n’ụlọ mkpọrọ, ịnọ ebe ahụ adịrịghị m mfe. Ma obi dị m ụtọ na mụ na nwanna ọzọ nọkwa n’ụlọ mkpọrọ ahụ na-ekwurịta okwu oge ụfọdụ. M mechara si n’ụlọ mkpọrọ pụta mgbe m nọzuru afọ abụọ m, ma nke a abụghị nke ikpeazụ m gara mkpọrọ.
M Lụrụ Nwaanyị Hụrụ Jehova n’Anya
Mụ na Lidija obere oge tupu anyị agbaa akwụkwọ
Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta n’afọ 1984, m matara Lidija bụ́ nwa agbọghọ bi na Yukren, anyị alụọkwa. Ọ mara mma, jirikwa ofufe Jehova kpọrọ ihe. Mgbe anyị gbachara akwụkwọ, Lidija hapụrụ Yukren kwata Lituenia ka anyị abụọ biri. Mgbe ọ na-aga akwụkwọ, a kpagbukwara ya n’ihi na ya na ndị ezinụlọ ha bụ Ndịàmà Jehova. N’oge ahụ a na-akpagbu ya, ihe nyeere ya aka bụ akụkọ ụmụnna ndị tachiri obi oge a na-ata ha ahụhụ n’ogige ịta ahụhụ ndị Nazi nakwa akụkọ ụmụnna ndị tachiri obi n’oge a kpụgara ha Saịberịa.
N’afọ 1980, a ka machiri ọrụ Ndịàmà Jehova iwu na Lituenia. N’ihi ya, e nwee nwanna na-agba akwụkwọ, a na-eji ohere ahụ mee mgbakọ abalị abụọ. Ọ bụkwa ihe e mere oge anyị gbara akwụkwọ. N’oge ahụ, ndị bịara agbamakwụkwọ anyị so anyị ṅụrịa ọṅụ, ma anyị gekwara ọtụtụ okwu, bụọ ọtụtụ abụ, leekwa ihe nkiri anọ si na Baịbụl nke ndị mere ya jiri ejiji ka ndị bi n’oge a na-ede Baịbụl. M chetara na ihe dị ka narị mmadụ anọ na iri ise (450) bịara nnọkọ ahụ, ndị ikwu anyị ndị si ebe dị iche iche na Sọviet Yuniọn so na ha. Ndị uwe ojii nzuzo bịadịrị n’agbanyeghị na a kpọghị ha, ụfọdụ ụmụnna anyị matakwara ndị ha bụ.
E mere mgbakọ abalị abụọ ụbọchị anyị gbara akwụkwọ. E nwere di na nwunye abụọ nọ n’ikpo okwu n’ihi na nwa nwanne papa m gbakwara akwụkwọ otu ụbọchị ahụ
A Malitere Ikpe M Ikpe Ọzọ n’Ụlọikpe
Ọ bụrụ na mkpọrọ mbụ a tụrụ mmadụ emeghị ka o kweta ime ihe ndị ọchịchị Sọviet Yuniọn chọrọ ka o mee, mgbe ụfọdụ ha na-atụ onye ahụ mkpọrọ ọzọ. N’ihi ya, n’ime otu afọ anyị gbachara akwụkwọ, a malitere ikpe m ikpe ọzọ n’ụlọikpe. N’ụbọchị a nọ na-ekpe m ikpe ahụ, Lidija nwunye m nọ n’ụlọ ọgwụ n’ihi na ọ dị ime mgbe ahụ. E kweghị ka m gaa hụ ya n’oge ahụ a na-ekpe m ikpe. Ma, mgbe e nwere obere ezumike n’ụlọikpe, m gara n’ụlọ ọgwụ guzoro na windo ọnụ ụlọ ọ nọ na ya. O mepere windo ahụ, anyị ejiri obere oge gbaa ibe anyị ume. E mechara tụọ m mkpọrọ afọ atọ n’ụbọchị ahụ.
O wutere anyị na mgbe ụbọchị abụọ gachara, ime pụrụ Lidija. Ọ sịrị na ihe a wutere ya nke na ọ dị ya ka à mara ya mma n’obi. Ka Lidija nọ na-edi ihe a, ọ nọkwa na-agba mbọ ka ibi na Lituenia mara ya ahụ́ nakwa ka ọ mụta otú ya na papa m na mama m ga-esi na-ebi ebe ọ bụ na ha amachaghị asụ asụsụ Yukrenian na Rọshịan bụ́ asụsụ Lidija na-asụ. Ma ihe nyeere Lidija aka ná nsogbu a niile bụ na ọ tụkwasịrị Jehova obi kpamkpam, papa m na mama gbakwara mbọ otú ike ha hà jiri obiọma nyere ya aka ma na-eme ihe ndị ga-eme ka obi na-atọ ya ụtọ.
Jehova Ka Na-enyekwara Anyị Aka
Ihe ndị m mụtara mgbe m gara mkpọrọ nke mbụ nyeere m aka mgbe m gara nke abụọ. Otu ihe nyeere m aka ịtachi obi bụ ịna-ezi ndị ọzọ ozi ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe e bu m na-aga n’ụlọ mkpọrọ, e nwere ọtụtụ ndị ọzọ a tụrụ mkpọrọ e bujuru n’ụgbọala nakwa n’ụgbọ okporo ígwè dị iche iche. Mgbe ụfọdụ, a na-afaju ụmụ nwoke iri na ise ma ọ bụ iri abụọ n’ebe kwesịrị ịba naanị mmadụ ise ma ọ bụ isii. M ji oge ahụ gwa ndị mkpọrọ ibe m ihe ụfọdụ si na Baịbụl. M kọwaara ha ihe mere na anaghị m etinye aka n’agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa na ọ bụ ya mere e ji nwụchie m ma tụọ m mkpọrọ. M gwakwara ha ihe mere m ji kwere na Chineke dị.
Ọ bụ n’obodo a na-akpọ Marijampolė a ka ụlọ mkpọrọ m nọ na ya dị. Ọ dị ka ọ̀ bụ naanị m bụ Onyeàmà Jehova n’ụlọ mkpọrọ ahụ bụ́ ebe e nwere puku mmadụ abụọ bụ́ ndị omekome obi tara mmiri. Ndị mkpọrọ na-eyikarị ibe ha egwu, na-eti ibe ha ihe, ma ọ bụdị gbuo ibe ha, ma ọ bụ naanị otu ugboro ka ha tiri m ezigbo ihe. N’agbanyeghị ihe ndị jọgburu onwe ha mụ na ha nọ na-alụ n’ụlọ mkpọrọ, m gbara mbọ na-agba ndị ike ụwa gwuru ume, na-egosikwa ha na ihe banyere ha na-emetụ m n’obi. Ndị mkpọrọ anaghị ahụkarị ndị na-emere ha ụdị ihe a.
Ndị uwe ojii nzuzo gbakwara mbọ imegharị anyị anya n’ụlọ mkpọrọ ka anyị gharazie ịma ihe bụ́ eziokwu. Ha na-amata ihe ndị ezinụlọ m na-ekwurịta n’ụlọ, bịazie gwa m ihe ndị ha kwuru. Ma ha na-agbanwe ihe ndị ahụ ka o yie ka ndị ezinụlọ m hà na-ese okwu ma ọ bụ na ha adịghị n’otu. N’eziokwu, e nweghị mgbe m kwetara ihe ndị uwe ojii ahụ na-ekwu, ma, ọ bụ mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta ka m bịara hụ ihe dị iche n’ihe ndị uwe ojii ahụ nọ na-agwa m na ihe ndị ezinụlọ m kwuru n’eziokwu.—Matiu 10:16.
E nwere oge otu nwanna nwaanyị gwara otu onye nche bụ́ onye agbata obi ya ọ ma nke ọma ka o zobatara m otu obere Baịbụl Rọshịan. N’abalị, m na-eji obere mpempe akwụkwọ depụta amaokwu ole na ole si n’ihe Jizọs kwuru n’oge ọ na-akụzi ihe n’elu ugwu, ka ọ ga-abụ eruo echi ya, mụ anọrọ ebe anyị na-arụ ọrụ gụghachiwa amaokwu ndị ahụ mgbe onye ọ bụla na-agaghị ahụ m. Ọ bụ otú a ka m si bute ihe niile Jizọs nọ n’elu ugwu kụzie n’isi n’asụsụ Rọshịan n’agbanyeghị na ọ bụghị asụsụ m kacha asụ. Ndị nche ụlọ mkpọrọ mechara hụ Baịbụl ahụ nara m ya. Ma eburula m ihe ahụ Jizọs kụziri n’isi tupu mgbe ahụ.
Lidija nyekwaara m ezigbo aka. Ọ fọrọ obere ka ọ bụrụ ụbọchị ọ bụla ka ọ na-edetara m akwụkwọ ozi iji gbaa m ume. Ma ọ bụ naanị ugboro abụọ n’ọnwa ka e kwere ka m na-edegara ya akwụkwọ ozi. N’agbanyeghị ya, ọ gwara m na akwụkwọ ozi ndị ahụ m detaara ya mere ka obi sie ya ike na m dị ndụ, na m ka jisiri Jehova aka ike, nakwa na m ka hụrụ ya n’anya.
Jehova Na-eji Ekpere M Ọ Na-aza Enyere M Aka
N’otu oge, ụfọdụ ndị mkpọrọ gwara ndị ọchịchị ka ha mezitụ ihe ụfọdụ ga-eme ka ọrụ ha na-arụ n’ụlọ mkpọrọ dịtụrụ ha mfe. Ha jụkwara ịrụ ọrụ ọ bụla ruo mgbe ndị ọchịchị ga-emere ha ihe ahụ. A tara ndị mkpọrọ ahụ ezigbo ahụhụ maka ihe a ha mere. Ndị ọchịchị mechaziri gwa mụ na ụfọdụ ndị mkpọrọ ọzọ na anyị ga-anọchi ndị ahụ mere isi ike ma rụwazie ọrụ ha.
M jụ iso rụwa ọrụ ọhụrụ a, ha ga-ata m ezigbo ahụhụ. Ọ bụrụkwa na mụ ekweta iso rụwa ya, ndị mkpọrọ ahụ mere isi ike ga-ewere m ka onye iro ha ma mesiwe m ike. Ha nwere ike tie m ihe ma ọ bụdị jiri ihe magbuo m. Ihe a mere ka obi koro m n’elu, amaghịkwa m ihe m ga-eme eme. (2 Ihe E Mere 20:12) N’ihi ya, m na-ekpe ekpere mgbe niile na-arịọ Jehova ka o nyere m aka.
N’oge m na-atụghị anya ya, otu onye mkpọrọ mụ na ya na-arụkọbu ọrụ gwara m ka m soro ya gaa hụ onyeisi ndị na-ahazi ọrụ. Mụ na onye mkpọrọ a abụghị enyi, naanị na anyị rụkọrọ ọrụ n’otu ìgwè. Ma, ọ gwara onyeisi ahụ ka ọ hapụ m ka m soro ndị mụ na ha na-arụbu ọrụ rụwakwa. Ihe a mere ka ya na onyeisi ahụ malite ịrụ ụka. N’agbanyeghị na e nweghị ihe na-eme ka onyeisi ahụ gbanwee obi ya, o mechara kweta ka mụ na ìgwè nke mbụ ahụ rụwakwa, ya achụpụzie anyị n’ọfis ya. Ọ bụ otú a ka Chineke si zaa ekpere m. (2 Pita 2:9) N’oge niile m nọ n’ụlọ mkpọrọ, ahụtụghị m ebe onye mkpọrọ gbasiri mbọ ike otú ahụ ka o nyere onye mkpọrọ ọzọ aka. Ihe a kụziiri m na Jehova nwere ike isi n’aka onye ọ bụla nyere anyị aka iji zaa ekpere anyị.
Jehova Nyeere Lidija Aka
Ka m kọọrọ unu otú Lidija na ije si gaa mgbe ahụ m nọ n’ụlọ mkpọrọ. Ọ nọ na-achọ ọrụ. Ma ebe ọ bụ na a tụrụ m mkpọrọ, ọtụtụ ndị ekweghị ewe ya n’ọrụ maka na ha na-atụ ụjọ na ndị uwe ojii nzuzo ga-enye ha nsogbu. Ma, o mechara nweta ọrụ ilekọta ụmụaka dị iri atọ. Ọ na-eji awa iri na abụọ n’ụbọchị arụ ya. Ọrụ a na-eme ka ezigbo ike na-agwụ ya. Ma Jehova nyere ya ike o ji na-aga ọrụ ahụ kwa ụbọchị. Ihe ọzọ nyeere ya aka bụ na ụmụnna anyị na-esi ebe dị iche iche na Lituenia gbaa ọtụtụ kilomita bịa kasie ya obi, soro ya nọrịa, wetakwara ya akwụkwọ anyị dị iche iche n’asụsụ Rọshịan. E nweghị mgbe ọ dị ya ka ọ̀ nọ naanị ya.
Mụ na Ndị Ezinụlọ M Na-efekọ Jehova Ọnụ
Mgbe m si n’ụlọ mkpọrọ pụta, m nyere aka n’ịhazi ọrụ ịsụgharị akwụkwọ anyị dị iche iche na nzuzo n’asụsụ Lituenian. Mgbe afọ ole na ole gachara, ọchịchị Sọviet Yuniọn dara, ndị ọchịchị Lituenia edebakwa aha anyị n’akwụkwọ na iwu akwadola ka anyị nwere onwe anyị ịna-arụ ọrụ anyị n’obodo ahụ. Ka oge na-aga, e hiwere ọfis ndị nsụgharị n’asụsụ Lituenian. Ọ na-ewe ihe karịrị otu awa na ọkara isi n’ụlọ anyị rute ọfis a, ma obi na-adị m ụtọ ịkwọ ụgbọala m aga na ya iji nye aka sụgharịa akwụkwọ dị iche iche. M mekwara ihe a kwa izu ruo afọ ise.
N’ọnwa Ọgọst afọ 1997, a kpọrọ mụ na Lidija ka anyị bịa jewe ozi n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Lituenia. A na-akpọkwa ya Betel. Ihe a mere anyị ezigbo obi ụtọ. Anyị amụọla ụmụ nwaanyị abụọ mgbe ahụ, nke nnukwu aha ya bụ Oksana dị afọ itoolu, nwanne ya aha ya bụ Svajūnė dị afọ ise. E nyere anyị abalị atọ ka anyị jiri kwabata n’ụlọ dị nso na Betel ma tinye Oksana n’ụlọ akwụkwọ ọhụrụ.
Ebe anyị na-eme ihe nkiri Ahazuirọs, Esta, na Mọdekaị n’ofufe ezinụlọ anyị n’ihi na anyị chọrọ ka a na-amụta ihe bara uru na ya, ya ana-atọkwa ụtọ
Olee otú anyị si na-elekọta ụmụ anyị ma na-arụkwa ọrụ Betel? M na-ama ụzọ gawa Betel ụbọchị ọ bụla, ụmụ anyị gachaa ụlọ akwụkwọ, Lidija abịawazie. Lidija na-emechikwa ọrụ n’oge ka o nwee ike nọrọ n’ụlọ ka ya na ha nọrọ ma ha lọta.
Ebe anyị yi uwe ndị Lituenia n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Lituenia mgbe e nyefere Jehova ụlọ ndị a rụnyekwuru na ya n’afọ 2003
Anyị anaghị eji abalị Fraịdee egwu egwu n’ezinụlọ anyị. Ọ bụ oge anyị na-esikọ nri ọnụ, debe ebe niile ọcha, nwee ofufe ezinụlọ, ma kporie ndụ. Anyị na-ahazi gaa kirie ugwu dị iche iche, oké osimiri, ma ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ndị ọzọ dị na Yurop. Ihe a na-eme ka ụmụ anyị hụ ihe ndị Jehova kere, matakwa ụmụnna anyị nọ ebe ndị ọzọ n’ụwa. Ụmụ anyị abụọ malitere ịsụ ụzọ mgbe ha dị afọ iri na ise, mụ na Lidija ji ha eme ọnụ. Oksana na di ya bụ́ Jean-Benoit na-eje ozi ugbu a n’ọfis ndị nsụgharị dị na Lituenian, Svajūnė na di ya bụ́ Nicolas ana-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ anyị dị na Frans.
N’eziokwu, mụ na Lidija nwunye m bụ “otu anụ ahụ́” maka na ihe kacha anyị abụọ mkpa ná ndụ kemgbe ụwa bụ ijere Jehova ozi. (Ndị Efesọs 5:31; Ekliziastis 4:12) N’agbanyeghị na ‘ọtụtụ nsogbu bịaara anyị,’ a kpagbuokwa anyị ọtụtụ afọ, “ọ pụtaghị na nke anyị na-eme agwụla,” e nweghịkwa mgbe Chineke hapụrụ anyị. (2 Ndị Kọrịnt 4:8, 9) Anyị ahụla otú Jehova si nyere anyị aka ugboro ugboro, o meekwala ka obi sie anyị ike na ọ ga na-enyere anyị aka mgbe niile.
Ọmarịcha nwunye m bụ́ Lidija
a Si n’afọ 1955 ruo 1990, ihe a na-akpọ ya bụ Kapsukas.

