CAROL APPLEBY | AKỤKỌ NDỤ

Jehova Nyeere M Aka Ịzụ Ụmụ M Ise

Jehova Nyeere M Aka Ịzụ Ụmụ M Ise

 Kemgbe ụwa, m bi na Nọt Yọkshịa dị n’Ịngland. Ọ dị nso n’obodo a na-akpọ Maltọn. Ugwu, oké ọhịa, ahịhịa ndị na-acha akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, okporo ụzọ ndị mara mma, ụlọ ndị e ji okwute rụọ, nakwa ebe dị iche iche mara ezigbo mma mere ka obodo a bụrụ anya lere. Ọ bụ ebe dị mma ịnọ zụọ ụmụ m ise. Ma, ịzụ ha adịghị mfe mgbe niile. Ka m kọọrọ gị ihe mere m ji kwuo otú ahụ.

 Mụ na papa m, mama m, ụmụnne m ndị nwoke abụọ, na ụmụnne m ndị nwaanyị abụọ bi n’obere ugbo anyị ebe anyị na-azụ anụmanụ. Anyị na-esi n’anụ ndị anyị na-azụ enweta ọtụtụ ihe dị anyị mkpa. Anyị na-azụ ma ọkụkọ ma ézì ma ehi. N’agbanyeghị na ịzụ anụmanụ ndị ahụ abụghị obere ọrụ, anyị na-enwe obi ụtọ.

Ebe m nọ n’ugbo anyị mgbe m dị afọ iri na anọ

 Anyị na-aga Chọọchị Metọdist n’oge ahụ. Papa m nwere olu abụ, n’ihi ya, o so ná ndị na-ekwe ukwe na chọọchị anyị, ọ na-agakwa na chọọchị ndị ọzọ dị anyị nso abụrụ ha abụ. M na-esokarị ya aga. Ọ bụ nnukwu okwute ka e ji rụọ chọọchị ndị ahụ, ha na-atụkwa ezigbo oyi n’oge oyi. Papa m na-akwụ n’ihu chọọchị na-abụ abụ. Ọ bụ ndị a ma ama na-anọ n’oche ndị dị n’ihu, n’ihi ya, ọ bụ n’oche azụ ka m na-anọ. Ma, obi na-atọ m ụtọ ịnụ ka ọ na-abụ abụ.

 M na-akpọ mama papa m Grani, ọ na-abịakwa eleta anyị ụbọchị Sọnde ọ bụla. O wutere m mgbe ọ nwụrụ mgbe m dị afọ iri na isii. Obi gbawara m. M chọrọ ịma ebe ọ nọ nakwa ma m̀ ga-ahụ ya ọzọ. N’ihi ya, m gara na nke otu nwaanyị na-agba afa ọtụtụ ugboro iji mata ihe ndị a. Ụlọ ya na-atụ oyi, ruo unyi, na-atụkwa m ụjọ. Naanị ihe m chọrọ ịmata bụ ebe Grani nọ, ma nwaanyị ahụ enweghị ike ịgwa m ya.

 Ka afọ ole na ole gara, otu onye ikwu papa m bụ́ Onyeàmà Jehova gwara m ka m bịa ọmụmụ ihe. M kpebiri na m ga-aga n’agbanyeghị na m nụrụ na ihe Ndịàmà Jehova kweere dị iche n’ihe okpukpe ndị ọzọ kweere. Mgbe m gara ọmụmụ ihe ahụ, otu nwaanyị dị obiọma jụrụ m ma m̀ ga-achọ ka mụ na ya mụwa Baịbụl. Ọ bụ otú ahụ ka m si mụwa banyere Jehova. Na mbụ, ọ bụ Baịbụl King James nke m ka m ji amụ ihe maka na m kwetara ihe mama m gwara m. Ọ gwara m na a sụgharịtaghị Baịbụl Ndịàmà Jehova. Ma, m mechara chọpụta na ọ bụghị eziokwu.

 Ihe m na-amụta na Baịbụl nọ na-atọ m ụtọ. Nke kacha masị m bụ ịmata na Grani nọ n’ili “na-ehi” ụra nakwa na m ga-ahụ ya ọzọ ma a kpọlite ya n’ọnwụ. a Ka m na-amụ ihe, m chọpụtara na e nweghị ihe ọ bụla m ma gbasara Chineke nakwa Baịbụl. Papa m, onye garala chọọchị ọtụtụ afọ, enweghịkwa ọtụtụ ihe ọ ma gbasara Chineke. Anyị abụọla abụ isiokwu ya bụ “Duzie M Jehova Onye Ukwu” ọtụtụ ugboro, ma anyị amaghị onye anyị na-abụ gbasara ya.

M Lụrụ Di, Ya Emechaa Malite Imegide M

 Enyi m nwoke bụ́ Ian malitere inwe mmasị n’ihe m na-amụ, mechaakwa malite ịmụ Baịbụl. O bidoro ime ihe ụfọdụ ọ na-amụta, kwụsịdị ịṅụ sịga. Anyị gbara akwụkwọ na Septemba afọ 1971. Ma, obere oge anyị gbachara akwụkwọ, nne di m nwụrụ. Ihe a bụụrụ anyị ezigbo ọnwụnwa. Ndị ikwu na ibe anyị kpọrọ anyị ka anyị sonyere ha n’ememme ụfọdụ ha haziri n’oge e liri nne di m. N’ememme ndị ahụ, ọtụtụ n’ime ha ṅụrụ sịga, ṅụọkwa oké mmanya. Ihe a mere ka ihe ndị ahụ Ian kwụsịrịla ime gụsiwekwa ya agụụ ike.

 O wutere m na o mechakwara mewe ha, ha emezie ka ime ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl siere ya ike. Ọ kwụsịrị ịna-amụ ihe, kwụsịkwa ịgachi ọmụmụ ihe anya. Ma mụnwa ejighị ịmụ Baịbụl, ịga ọmụmụ ihe, na ịga ozi ọma egwu egwu. M mere baptizim n’abalị itoolu n’ọnwa Mach afọ 1972. Ian bịara jiri anya ya hụ mgbe m mere baptizim. Ma, o ji nwayọọ nwayọọ malite imegide m. Ná mbụ, ọ chọghịzi ịna-ahụ akwụkwọ anyị ọ bụla. Ka oge na-aga, ọ chọghịzi ka m na-aga ozi ọma. N’ikpeazụ, ọ bịaziri siwe ọnwụ na m ga na-eso ya aga n’ebe a na-aṅụ mmanya n’oge ememme krismas na ememme ụbọchị ọmụmụ. Ebe ọ bụ ya bụ onyeisi ezinụlọ anyị, m na-eso ya aga oge ụfọdụ iji kwanyere ya ùgwù. Ma, m na-akpachapụ anya ka m ghara ime ihe ọ bụla na-adịghị Jehova mma. b Ọ na-abụ m nọtụ mụ agaa n’ebe a na-anyụ mamịrị kpee ekpere ọtụtụ ugboro na-arịọ Jehova ka o nyere m aka ịna-erubere ya isi nakwa ka m ghara ime ihe ọ bụla ga-eme ka akọnuche m nyewe m nsogbu. M hụkwara na Jehova nọ na-enyere m aka.

 Mụ na di m bụ́ Ian mụtara ụmụ nwoke atọ. Ha bụ Philip, Nigel, na Andrew. Di m na-anya nnukwu ụgboọla, ọ naghịkwa anọkarị n’ụlọ n’ihi na ọ na-anya ụgbọala aga ebe ndị dị ezigbo anya. M gbara mbọ ka m bụrụ ezigbo nwunye ma na-efekwa Jehova otú m nwere ike. M na-aga ozi ọma oge ndị ọ na-anọghị n’ụlọ, ma soro ya nọrịa ná ngwụcha izu. M gbakwara mbọ ka m ghara ịna-agwa ụmụ anyị ihe na-adịghị mma gbasara ya.

 M metere ọtụtụ ndị ọgbakọ anyị enyi, na-akpọkwa ụfọdụ n’ime ha aga eleta mama m na papa m. Ka oge na-aga, papa m na mama m bịara hụwa ha n’anya. Mgbe otu nwanna nwoke nwụrụ n’ọgbakọ anyị, mama m bịara okwu olili ya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. O teghị aka, mama m, papa m, Stanley nwanne m nwoke, na nwunye ya bụ́ Averil malitere ịmụ Baịbụl, mechaakwa mee baptizim.

 Stanley na Averil mụtara otu nwoke na otu nwaanyị. Ọ na-atọ mụ na Averil ezigbo ụtọ ịkpọ ụmụ anyị aga ozi ọma. Mụ na Averil enweghị ụgbọala, n’ihi ya, anyị na-eji ụkwụ aga ọtụtụ kilomita, kwara ụmụ anyị n’ihe e ji akwagharị ụmụaka, obi na-abụkwa anyị so aṅụrị. M na-ekunye Andrew n’ime ihe ahụ e ji ebu ụmụaka, Nigel anọrọ ọdụ n’ebe elu ya, Philip ejidezie ya aka, anyị ana-aga.

Mgbe mụ na Philip, Nigel, na papa m gara mgbakọ ukwu

Otú M Si Zụọ Ụmụ M

 Mụ na Ian mechara mụta ụmụ abụọ ọzọ. Ha bụ Caroline na Debbie. M kpebisiri ike na m ga-azụ ụmụ anyị ka ha mara Jehova ma na-efe ya. M chọrọ nnọọ ịgba mbọ na-eme ihe ọ bụla Baịbụl kwuru ndị nne na nna kwesịrị ịna-eme. M nyefeela Jehova onwe m, m chọkwara ịna-eme ihe Jehova chọrọ iji gosi ụmụ m na ejighị m nkwa m kwere ya mgbe m nyefere ya onwe m egwu egwu.

 Otu n’ime amaokwu Baịbụl ndị m bu ụzọ bute n’isi bụ 1 Ndị Kọrịnt 15:33, ebe kwuru na “mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.” N’otu mgbakọ anyị gara, otu nwanna nwaanyị kwuru na ya gbara ụmụ ya ume ka ha na ụmụ akwụkwọ ibe ha ghara ịna-anọrị ma a gbasaa akwụkwọ. M chọrọ ka ụmụ m mee otú ahụ, ma ọ dịghịrị ha mfe. Mgbe ụfọdụ, ụmụ m ndị nwoke na-ezoro ezoro si n’ụlọ pụọ gaa soro ụmụ klas ha na-agba bọl. Ọtụtụ n’ime ndị enyi ha ndị ahụ na-akpa àgwà ọma, ma ha anaghị efe Jehova. Ihe ndị ha na-ekwu na ihe ndị ha na-eme na-egosi ya.

 E nwere otu oge m gwara ụmụ m na mụ na ha ga-agba bọl ma ha chọọ ịgba bọl ma ha gbasaa akwụkwọ. Ma o mechaghị nwee isi n’ihi na amaghị m agba bọl. Ma, akwụsịghị m inyere ụmụ m aka ịghọta na ha kwesịrị ịsa anya ná mmiri tupu ha ahọrọ ndị ha na ha ga na-akpa. Ha mechakwara mụta iji ihe ndị na-agaghị eme ka ha ndị na-anaghị efe Jehova na-akpa na-atụrụ ndụ.

 Amaokwu Baịbụl ọzọ m na-echeta mgbe niile bụ 1 Jọn 2:17, ebe sịrị: “Ụwa na-agafe agafe, ya na ihe na-agụ ya agụụ, ma onye na-eme uche Chineke ga-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.” M ma na ụwa Setan ga-agafe, n’ihi ya, mkpa m bụ inyere ụmụ m aka ka ha lekwasị anya n’adịm ná mma ha na Jehova ka ha nwee ike ịna-eme ihe dị ya mma ruo mgbe ebighị ebi. Mgbe ọ bụla nsogbu bịaara anyị, ọ bụrụgodị obere nsogbu, m na-ekpe ekpere rịọ Jehova ka o nyere anyị aka, m na-achọtakwa ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka. M gosi ụmụ m ihe Baịbụl kwuru, ha na-aghọta na ọ bụghị mụnwa na-edu ha, kama na ọ bụ Jehova. M gbara mbọ si n’ihe m na-ekwu na ihe m na-eme na-akụziri ha ihe, ha mụtakwara ihe ndị m kụziiri ha. Dị ka ihe atụ, malite mgbe ha ka dị obere, ha niile nwechara ndị ha na-aga nletaghachi na nke ha, ihe a na-eme ha obi ụtọ, meekwa ka ha na-eme nke ọma.

 Ama m na ịga ọmụmụ ihe dị ezigbo mkpa. E nwere mgbe m chọpụtara na ike na-agwucha ụmụ m n’ọmụmụ ihe etiti izu. N’ihi ya, n’ụbọchị ọmụmụ ihe, m na-aga kpọlata ha n’ụlọ akwụkwọ, nye ha obere nri, anyị ehiekwa ụra ehihie. Ihe a mere ka ike gharazie ịna-agwụ ha. Naanị ihe na-eme ka anyị ghara ịga ọmụmụ ihe bụ ma ọ bụrụ na ahụ́ adịghị otu onye n’ime anyị, ya abụrụkwa na onye ahụ agaghị agali n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ daba otú ahụ, anyị na-amụ ihe e kwesịrị ịmụ n’ọmụmụ ihe n’ụlọ. Anyị anaghị agbanye tiivi anyị ma ọ bụrụ na anyị amụchabeghị ihe. Ma, oge ụfọdụ, Ian na-alọta mgbe anyị na-atụghị anya ya. Ọ lọta otú ahụ, anyị na-ezo akwụkwọ anyị niile ozugbo, gbanye tiivi.

 Ihe ọzọ anyị na-ejighị egwu egwu bụ ofufe ezinụlọ. Oge ụfọdụ, anyị na-ekwurịta ihe ụfọdụ gbasara Betel nakwa ngalaba ụmụ m ga-achọ ịrụ na ya na Betel.

Si n’aka ekpe gawa: Ọmarịcha ụmụ m​—Philip, Caroline, Debbie, Andrew, na Nigel

Anyị Kpebiri Ịsụ Ụzọ Oge Niile

 Mgbe ọkpara m bụ́ Philip dị afọ iri na isii, otu ụlọ ọrụ kpọrọ ya ka ọ bịa rụwara ha ọrụ ịna-edozi ụgbọ ala. Ọ ga na-arụ ya ụbọchị niile. Ụlọ ọrụ ọzọ kpọkwara ya ka ọ bịa na-eji ụbọchị ụfọdụ arụ ọrụ ihicha windo. Ọ chọghị ịrụ ọrụ nke ahụ ọ ga na-ehicha windo. O kwuru na ọ rụwa ọrụ nke ahụ ọ ga na-arụ ụbọchị niile, ọ ga na-enweta ego ọ ga-eji na-enye aka n’ụlọ. M nyeere ya aka ịghọta na ọ bụghị ọrụ ya ịna-egbo mkpa ezinụlọ anyị, kama na ọ bụ ọrụ papa ya. M gwakwara ya na anyị nwere ego na-ezuru anyị igbo mkpa anyị. M nyeere ya aka ịghọta na ọ bụrụ na ọ rụwa ọrụ nke ihicha windo ahụ, o nwere ike ịmalite ọrụ ịsụ ụzọ oge niile ozugbo.

 Philip malitere ịsụ ụzọ oge niile ozugbo ọ gachara akwụkwọ sekọndịrị, mụnwa malitekwara ịsụ ụzọ inye aka. Mgbe osote ọkpara m bụ́ Nigel malitere ịsụ ụzọ oge niile mgbe ọ gachara akwụkwọ sekọndịrị, mụnwa malitekwara ịsụ ụzọ oge niile. M gwara onwe m na ọ bụrụgodị otu afọ ka m ga-asụ ụzọ oge niile, m ga-akwado ụmụ m, gaakwa ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ. Mụ na Nigel mechara gakọọ ụlọ akwụkwọ ndị ọsụ ụzọ.

 Kemgbe m malitere ịsụ ụzọ oge niile, ọ na-atọ m ụtọ, m makwa na ife Jehova otú ahụ bụ otú dị mma m ga-esi akụziri ụmụ m ezigbo ihe. Jehova enyerela m aka mụ ana-asụ ụzọ oge niile kemgbe afọ iri atọ na ise ugbu a. Ian gaara egbochi m ịbụ ọsụ ụzọ oge niile ma a sị na ọ ma na ọ bụ ihe m chọrọ ime. Ma, m haziri oge m na-aga ozi ọma n’etiti izu mgbe ọ gara ọrụ ka mụ na ya nwee ike ịna-anọrị ma ọ lọta.

 Nigel nwa m mechara tinye akwụkwọ ịga Betel, a kpọọkwa ya. N’ebe ahụ, o metere ọtụtụ ezigbo ndị enyi, a zụọkwa ya n’ọtụtụ ihe. Ihe a nyeere ya aka ịbụ Onye Kraịst ụkwụ siri ike. Philip na Andrew gara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi. c Ụlọ akwụkwọ ha gara nyeere ha aka ịbụ ndị tozuru etozu. (1 Pita 5:10) Jehova na-akụziri ndị ya ihe na-enweghị atụ n’ụlọ akwụkwọ niile e nwere ná nzukọ ya. M na-ekele Jehova na ọgbakọ ya maka ọzụzụ a zụrụ ụmụ m.

Ebe Carol nọ n’ụzọ na-aga ozi ọma

Nsogbu Siri Ike Ndị Bịaara M

 N’afọ ndị a niile, nsogbu ndị siri ike abịarala m. Otu nke siiri m ezigbo ike bụ di m ịgba n’èzí. Ka anyị bichara afọ iri atọ na atọ, ọ hapụrụ m gaa binyere nwaanyị ọzọ. Ihe ọzọ siiri m ike bụ ịhụ ka nne na nna m na-aka nká. O wutere m mgbe papa m nwụrụ n’ọnwa Mach afọ 1997. Ihe a mere ka mama m biri naanị ya n’ụlọ, ọ maghịkwanụ anya ụgbọala. Ọnwụ papa m nọ na-ewute ya, meekwa ka owu na-ama ya. N’ihi ya, m na-akpọkarị ya jụọ ya sị: “Ị̀ ga-achọ ka m bịa jiri ụgbọala bugharịa gị, anyị agaakwa nletaghachi?” Mgbe ọtụtụ afọ gara, ọ malitere ịsụ ụzọ oge niile. Ịsụ ụzọ oge niile tọrọ ya ezigbo ụtọ, meekwa ka ọ mara na ọ ka bara uru. Ọ sụrụ ụzọ oge niile afọ iri tupu ya anwụọ.

 Ọ dịghịrị m mfe ịzụ ụmụ ise ha ana-efe Jehova. Ama m na ọ bụ ụmụ m ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-efe Jehova ma ọ̀ bụ na ha agaghị efe ya. Ọ bụ m ga-ekpebiri onwe m ihe m ga-eme, ma ọ bụghị m ga-ekpebiri ha ihe ha ga-eme. N’ihi ya, m mere ihe m ga-emeli, ya bụ ịna-eme ihe Chineke chọrọ ka m mee, gbaakwa mbọ si n’ihe ndị m na-ekwu na ihe ndị m na-eme kụziere ha ihe. Obi dị m ezigbo ụtọ na ụmụ m kpebiri ịna-efe Chineke. d N’eziokwu, ọ bụ Jehova nyeere m aka ịzụ ha.

Mụ na ụmụ m taa

b Gụọ ihe nke 5 e dere ná ngwụcha akwụkwọ Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi. Isiokwu ya bụ “Ememme Dị Iche Iche.”

c E ji Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze dochie ụlọ akwụkwọ a.

d Philip so ná ndị na-akụzi ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ndị E Nwere ná Nzukọ Jehova n’Ayaland. Nigel na-elekọta otu Ụlọ Mgbakọ anyị dị n’Ịngland. Andrew bụ okenye ọgbakọ, ọ na-asụkwa ụzọ oge niile kemgbe afọ iri atọ. Caroline sụrụ ụzọ oge niile afọ ise. Mụ na Debbie bi, ọ na-enyekwara m aka n’ozi m na-eje.