ABỤ NKE 134
Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke
-
1. Jehova bụ Chi n’enye nwa.
Mgbe di na nwunye mụtara nwa,
Ha g’echeta n’ọ bụ Jehova
Nyere ha ya ka ha zụọ ya.
Jehova bụ Onye n’enyen-dụ.
Ọ n’egosi n’ọ hụr’anyị n’anya.
O nwer’iwu bar’ezigb’uru
O nyeren-dị niile mụr’ụmụ.
(UKWE)
O nyer’unu onyinye dịn-sọ,
Nk’unu ga n’elekọta.
Kụziere ha iwu Chineke.
Ọ g’akacha baara h’uru.
-
2. Iwu dum Chineke nyere
Ga n’adị n’obi gị n’oge niile.
Mee k’ụmụ gị mụta ha niile.
Ọ bụọ-rụ gị. Gbalịa mee ya.
Ị g’eme ya n’og’ị n’ezui-ke,
N’emekwa ya n’og’ị n’aga n’ụzọ.
N’ọdịnihu, ka ha cheta ya.
Ha debe ya, ọ g’agọzi ha.
(UKWE)
O nyer’unu onyinye dịn-sọ,
Nk’unu ga n’elekọta.
Kụziere ha iwu Chineke.
Ọ g’akacha baara h’uru.
(Gụọkwa Diut. 6:6, 7; Efe. 6:4; 1 Tim. 4:16.)

