Gaa n'Isiokwu

Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka

N’isiokwu ndị di ebe a, ị ga-enweta ndụmọdụ si na Baịbụl ga-enyere ndị nọ n’ezinụlọ aka. a Ị chọọ ịhụ ebe e depụtara isiokwu dị iche iche maka ezinụlọ, gaa n’ebe a kpọrọ Alụmdi na Nwunye na Ezinụlọ.

a A gbanwere aha ụfọdụ ndị e dere ihe ha kwuru.

Alụmdi na Nwunye

Otú Ka Mma Ị Ga-esi Na-ele Àgwà Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Na-akpa nke Na-adịghị Gị Mma Anya

Kama ikwe ka àgwà na-adịghị gị mma di gị ma ọ bụ nwunye gị na-akpa butere unu esemokwu, gbalịa ka ị na-ele ya anya otú ka mma.

Otú Ị Ga-esi Na-enwekwu Ndidi

Mgbe mmadụ abụọ na-ezughị okè lụrụ, ha ga-enwe nsogbu dị iche iche. Inwe ndidi bụ ihe dị mkpa ga-eme ka di na nwunye na-ebi n’udo.

Ihe Ga-eme Ka Di na Nwunye Na-enwe Obi Ụtọ: Na-akwanyerenụ Ibe Unu Ùgwù

Baịbụl ga-enyeliri unu aka ịmụta ịna-akwanyere ibe unu ùgwù, ọ bụrụgodị na unu anaghị emebu otú ahụ.

Otú Ị Ga-esi Na-akwanyere Di Gị ma Ọ Bụ Nwunye Gị Ùgwù

N’alumdi na nwunye, nkwanye ùgwù abụghị ihe a na-eme mgbe ọ dabara, kama ọ bụ ihe e kwesịrị ịna-eme mgbe niile. Olee otú ị ga-esi na-akwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị ùgwù?

Otú Di na Nwunye Ga-esi Na-ekele Ibe Ha Maka Ihe Ọma Ha Mere

Ọ bụrụ na di na nwunye ana-agbalị na-ahụ ihe ọma onye nke ọzọ na-eme ma na-ekele ya maka ya, ọ ga-eme ka alụmdi na nwunye ha na-esikwu ike. Gịnị ga-enyere ha aka ịna-ekele ibe ha maka ihe ọma ha mere?

Otú Di na Nwunye Ga-esi Egosi na Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya

Olee otú ndị di na nwunye ga-esi gosi na ha hụrụ ibe ha n’anya? Lee ihe anọ Baịbụl kwuru ga-enyere unu aka.

Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Itisa

Nkwa i kwere di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ dị gị ka è kere gị agbụ ka ì chere na ọ na-eme ka unu ghara itisa?

Otú Unu Ga-esi Ghara Ịna-Emefusị Ego

Echela ka ego unu gwụchaa kpamkpam tupu gị elebara otú unu si azụ ihe anya. Gụọ ihe ga-enyere unu aka ka unu ghara ịna-emefusị ego unu.

Otú Gị na Nne na Nna Di Gị ma Ọ Bụ Nne na Nna Nwunye Gị Ga-esi Na-adị n’Udo

Ihe atọ ga-enyere gị aka ka nsogbu gị na nne na nna di gị ma ọ bụ nne na nna nwunye gị na-enwe ghara ime ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-ese okwu.

Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịna-ebu Iwe n’Obi

Ịgbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ pụtara na ị ga-eme ka à ga-asị na e nweghị ihe o mere?

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ejide Onwe Gị ma A Kpasuo Gị Iwe

Iwe iwe na ibu iwe n’obi nwere ike ịkpatara gị ọrịa. Oleezi ihe ị ga-eme ma di gị ma ọ bụ nwunye gị kpasuo gị iwe?

Mgbe Ụmụaka Gara Biri nke Ha

Ihe ụfọdụ ndị dị na nwunye na-agabiga na-akarị akarị ma ụmụ ha too ma si n’ụlọ pụọ. Olee ihe ndị nne na nna nwere ike ime ka ọnọdụ a bụrụ nke na-eweta obi ụtọ?

Ihe Ị Ga-eme ma E Nwee Onye Gị na Ya Dị n’Ezigbo Mma

Obi gị ọ̀ na-agwa gị na e nweghi ihe jikọrọ unu, naanị na unu dị ná mma. Gụọ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka.

Ị Hụwa Ihe Ị Na-atụghị Anya Ya n’Ebe Di Gị Nọ

Ike di gị ma ọ bụ nwunye gị ọ̀ gwụla gị? E nwere ihe ise nwere ike inyere unu aka.

Ihe Unu Ga-eme Ka Unu Ghara Ịgba Alụkwaghịm n’Agadi

Gịnị mere ndị di na nwunye ji agba alụkwaghịm ma ha mee agadi? Gịnị ka ị ga-eme ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị ghara ịgba alụkwaghịm ma unu mee agadi?

Ànyị Kwesịrị Ibiri Tupu Anyị Alụọ Di na Nwunye?

Ụfọdụ ndị chọrọ ịlụ di na nwunye na-eche na ha ibiri tupu ha alụọ ga-enyere ha aka ijikere maka alụmdi na nwunye. Ọ̀ dị mma iche otú ahụ, ka è nwere otú ọzọ ka mma isi jikere?

Nkwụrịta Okwu

Na-ewepụtanụ Ezigbo Oge Unu Ga-eji Na-anọrị

Di na nwunye nwere ike ịnọ n’otu ọnụ ụlọ ma ghara ịna-ekwurịta okwu otú ha kwesịrị. Olee ihe di na nwunye ga-eme ka oge ha ji anọrị bakwuoro ha uru?

Ihe Unu Ga-eme Ka Ekwentị Ghara Ibutere Unu Nsogbu

Ekwentị ma ọ bụ ihe ndị yiri ya nwere ike ịbara gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị uru ma ọ bụ butere unu nsogbu. Olee nke ọ na-emere unu?

Otú Di na Nwunye Kwesịrị Isi Na-ekwurịta Nsogbu

Ihe na-adị ụmụ nwoke mkpa ma ha kwurịtawa okwu dị iche n’ihe na-adị ụmụ nwaanyị mkpa. Dị na nwunye agaghị na-ese okwu ma ha ghọta ya otú a.

Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịna-ege Ntị nke Ọma

Ọ bụrụ na ị na-ege ntị mgbe nwunye gị na-agwa gị okwu, ọ ga-egosi na ị hụrụ ya n’anya. Gụọ ihe ga-enyere gị aka ịna-ege ntị nke ọma.

Otú Unu Ga-esi Na-ekpebi Ihe Ga-adị Unu Abụọ Mma

E nwere ihe anọ ga-enyere gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị aka ịgbakọ aka kpebie ihe unu ga-eme kama ịna-arụ ụka.

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agbachi Ibe Ha Nkịtị

Gịnị mere o ji abụ ụfọdụ di na nwunye setụ okwu ha akwụsị ighe ibe ha ọnụ? Gịnị ga-enyere ha aka ikpezi ma ha see okwu?

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-esekarị Okwu

Gị na di gị ma ọ bụ gị na nwunye gị ọ̀ na-esekarị okwu? Gụọ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere unu aka.

Otú Di na Nwunye Ga-esi Kwụsị Ịna-agwa Ibe Ha Okwu Ọjọọ

Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na gị na di gị ma ọ bụ gị na nwunye gị na-agwakarị ibe unu okwu ọjọọ?

Di na Nwunye Ịrịọ Ibe Ha Mgbaghara

M̀ kwesịrị ịrịọ mgbaghara ma ọ bụrụ na ọ bụghị m chọrọ okwu?

Ihe Ga-enyere Di na Nwunye Aka Ịna-agbaghara Ibe Ha

Gịnị mere o ji esiri di na nwunye ụfọdụ ike ịgbaghara ibe ha? Gụọ ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka.

Ịzụ Ụmụ

Otú Ị Ga-esi Abụ Ezigbo Nna

Ụdị di ị bụ ugbu a ga-egosi ụdị nna ị ga-abụ ma nwunye gị mụọ nwa.

Ihe Ndị Nne na Nna Kwesịrị Ịma Gbasara Ebe Ndị A Na-elekọta Ụmụaka

Jụọ onwe gị ajụjụ anọ ga-enyere gị aka ịmata ma ì kwesịrị ịkpọga nwa gị ebe a na-elekọta ụmụaka.

Nwa M Ò Kwesịrị Inwe Ekwentị Bụ́ Ọkpọka?

Jụọ onwe gị ajụjụ ndị a ka ị mara ma gị na nwa gị ùnu ga-emeli ihe dị na ya.

Ihe Mere Ịgụ Ihe Ji Dịrị Ụmụaka Mkpa​—Nke 1: Ịgụ Akwụkwọ Ka Ọ̀ Bụ Ile Vidio?

Ọtụtụ ụmụaka na-achọkarị ile vidio. Olee otú ndị nne na nna ga-esi agba ụmụ ha ume ka ha na-agụkwu akwụkwọ?

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Jụọ Gị Ajụjụ Gbasara Ọnwụ

Gụọ gbasara ihe anọ ga-enyere gị aka ịza ajụjụ ụmụ gị nwere ike ịjụ gị gbasara onye unu nwụrụ anwụ nakwa ihe ga-enyere ha aka idi ọnwụ ya.

Gịnị Ka M Ga-eme Ma Obi Na-ajọ Nwa M Njọ Maka na Ọ Nọ Nkịtị n’Ụlọ?

Ọ bụrụ na nwa gị nọ nkịtị n’ụlọ, lee ihe ụfọdụ ị ga-echebara echiche.

Uru Ịrụ Ọrụ Dị n’Ụlọ Bara

Ndị nne na nna, ọ̀ na-ara unu ahụ́ ikenye ụmụ unu ọrụ ha ga-arụ n’ụlọ? Gụọnụ ihe a ka unu hụ na ikenye ụmụaka ọrụ ga-eme ka ha mata uru ịrụ ọrụ bara na obi ụtọ ọ na-enye.

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-agba Mbọ

Ị hụ ka nwa gị na-agba mbọ ịrụ ọrụ na-esiri ya ike, ì kwesịrị ịga rụọrọ ya ọrụ ahụ ozugbo? Ka ì nwere ike ịkụziri ya otú ọ ga-esi rụọ ọrụ ahụ na-esiri ya ike?

Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ma O Mejọọ Ihe

Anyị niile na-emejọ ihe mgbe ụfọdụ. Kụziere ụmụ gị ka ha ghara ikwe ka ihe ha mejọrọ mee ka ha daa mbà. Kụziekwara ha otú ha ga-esi emezi ha.

Otú Ị Ga-esi Enyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Na-emekwu nke Ọma n’Ule

Chọpụta otú ị ga-esi amata ihe mere nwa gị ji na-ada n’ule ma nyere ya aka ịmụ ihe.

Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Mata Mgbanwe Ndị A Na-enwe n’Ahụ́

O nwere ihe ise Baịbụl kwuru i nwere ike ime iji nyere nwa gị aka ka obi ghara ịna-ajọ ya njọ ma ahụ́ ya gbanwewe.

Kụziere Ụmụ Gị Banyere Mmekọ Nwoke na Nwaanyị

Ọtụtụ ndị na-eto eto taa na-ebido mgbe ha ka dị ezigbo ntakịrị matawa ihe ndị gbasara mmekọ nwoke na nwaanyị. Gụọ ihe a ka ị mata ihe ndị i kwesịrị ịma na otú ị ga-esi nyere ụmụ gị aka ka ha ghara ịdaba ná nsogbu?

Ịkụziri Nwa Gị Ihe O Kwesịrị Ịma Banyere Mmanya Na-aba n’Anya

Olee mgbe na otú ndị mụrụ ụmụ kwesịrị isi gwa ụmụ ha banyere ịṅụ mmanya na-aba n’anya?

Kụziere Ụmụ Gị Ịdị Umeala n’Obi

Kụziere ha ịdị umeala n’obi otú ga-eme ka ha ghara ileda onwe ha anya.

Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-erube Isi

Ọ bụrụ na nwa gị anaghị ekwe eme ihe ị gwara ya, e nwere aro ise ga-enyere gị aka ka ị kụziere ya ka ọ na-erube isi.

Otú Ị Ga-esi Na-akwụsi Ike n’Ihe I Kwuru

Gịnị ka ị ga-eme ma nwa gị siwe ọnwụ ma ọ bụ bewe ákwá ka i wee meere ya ihe ọ chọrọ?

Ihe I Nwere Ike Ime ma Nwa Gị Bido Ime Isi Ike Ụmụaka

Gịnị ka i nwere ike ime ma nwa gị bido ime isi ike ụmụaka? Ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ịma ihe i kwesịrị ime.

Ihe Ị Ga-eme ma Nwa Gị Na-agha Ụgha

Gịnị ka i kwesịrị ime ma nwa gị na-agha ụgha? Isiokwu a kwuru ụfọdụ ihe si na Baịbụl ndị ga-enyere gị aka ịkụziri nwa gị na ikwu eziokwu bara uru.

Ịzụ Ndị Na-eto Eto

Nyere Nwa Gị Nwaanyị Aka

Nsogbu ọtụtụ ụmụ agbọghọ na-enwe ma ha na-eto na-echegbu ha. Olee otú papa ha na mama ha nwere ike isi nyere ha aka?

Otú Ị Ga-esi Kụziere Nwa Gị Ka Ọ Na-erubere Gị Isi

Ịgbazi nwatakịrị pụtara ịkụziri ya ihe. Baịbụl ga-enyere gị aka ịkụziri nwa gị ka ọ na-eme ihe ị sị ya mee.

Otú I Kwesịrị Isi Na-agwa Nwa Gị Ihe Ọ Ga-eme na Ihe Ọ Na-agaghị Eme

Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na ihe ọ bụla ị gwara nwa gị mee na-ewe ya iwe?

Nyere Nwa Gị Aka Ka Ọ Kpachara Anya n’Ịntanet

Olee otú ị ga-esi kụziere nwa gị ka o jiri aka ya na-amata ihe ndị dị mma na ihe ndị na-adịghị mma?

M̀ Kwesịrị Ịhapụ Nwa M Ka Ọ Na-aga Ebe A Na-ezirịta Ozi n’Ịntanet?

E nwere ajụjụ anọ nwere ike inyere gị aka ikpebi ihe dị mma.

Otú Ị Ga-esi Gwa Nwa Gị Banyere Ozi Iberiibe

Ekwela ka nwa gị banye ná nsogbu tupu gị agwa ya banyere iji ekwentị ezipụ foto ndị gba ọtọ. Gwa ya nsogbu ndị o nwere ike ịkpatara ya.

Young People

Otú Ị Ga-esi Merie Nsogbu Ndị Ọgbọ Gị Na-enye Gị

Ndị ọgbọ anyị nwere ike ime ka anyị mewe ihe na-adịghị mma. Gịnị ka i kwesịrị ịma banyere ya, olee otú ị ga-esi merie ya?

Ihe Ị Ga-eme ma A Dụọ Gị Ọdụ

Olee otú mba a baara gị ya ewee gị iwe nwere ike isi baara gị uru?

Ihe Ị Ga-eme ma E Zitere Gị Ozi n’Ekwentị

Ị sị mmadụ ya chere ka ị gụọ ozi e ziteere gị, ọ̀ dị njọ? Ọ bụrụ na ị hapụ ozi ahụ, gị na enyi gị ana-ekwu ihe unu na-ekwu, ọ̀ dị njọ?

Otú Ị Ga-esi Na-ezere Ọnwụnwa

Onye ọ bụla kwesịrị ịna-ezere ọnwụnwa. Gụọ ihe isii ga-enyere gị aka ịma otú ị ga-esi na-ezere ọnwụnwa.

Otú Ị Ga-esi Jide Onwe Gị ma Iwe Bịa Gị

Ụzọ ihe ise ga-enyere gị aka ijide onwe gị ma iwe bịa gị. E si na Baịbụl nweta ha.

Ihe Ị Ga-eme ma I Chee na Ndị Enyi Gị Na-agbara Gị Ọsọ

O nweghị ihe dị iche n’onye na-anọkarị naanị ya na onye na-aṅụ mkpụrụ sịga iri na ise n’ụbọchị. Gịnị ga-enyere gị aka?

Mgbe Mmadụ Abụọ Chọrọ Ịlụ Gbasara

Gịnị ga-enyere mmadụ aka idi ya ma ya na onye ọ chọrọ ịlụ gbasaa.

Ihe Ị Ga-eme ma Ị Laghachi n’Ụlọ Unu

Ò nwetụla mgbe ị hapụrụ ụlọ gaa biri nke onwe gị ma ihe emechaa siwere gị ike? Ihe e kwuru n’isiokwu a ga-enyere gị aka.

Ihe Ị Ga-eme ma Ihe Gbanweere Gị

Ihe nwere ike ịgbanwere onye ọ bụla n’ime anyị. Gụọ isiokwu a ka ị hụ ihe nyeere ụfọdụ ndị aka mgbe ihe gbanweere ha.

Otú Ị Ga-esi Edi Ọnwụ Nne ma Ọ Bụ Nna

Idi ọnwụ nne ma ọ bụ nna adịghị mfe. Ma, olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ma ọ bụrụ na mwute na obi ọjọọ ya na ya so abịa?

Egwuregwu Ndị Nwere Ike Ịta Isi Mmadụ Ọ̀ Dị Mma?

Ọtụtụ ndị na-eto eto na-enwetakarị obi ụtọ pụrụ iche ma ha mee ihe ndị dị ize ndụ. Ọ̀ na-agụ gị iso mee ụdị ihe ndị a?