Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 3

Ole Ndị Dere Baịbụl?

“Mosis deziri ihe niile Jehova kwuru ede.”

Ọpụpụ 24:4

“Daniel rọrọ nrọ ma hụ ọhụụ mgbe o dina n’àkwà ya. O wee dee nrọ ahụ n’akwụkwọ. O dechara ihe niile ọ hụrụ.”

Daniel 7:1

“Mgbe unu nụrụ okwu Chineke nke anyị gwara unu, unu nabatara ya, ọ bụghị ka okwu ụmụ mmadụ, kama ka okwu Chineke. N’eziokwu, ọ bụ okwu Chineke.”

1 Ndị Tesalonaịka 2:13

“Ihe niile dị n’Akwụkwọ Nsọ si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Ha bakwara uru iji ha akụzi ihe.”

2 Timoti 3:16

“O nwetụbeghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma, kama mmụọ nsọ na-edu ndị mmadụ, ha ana-ekwu ihe Chineke chọrọ ka ha kwuo.”

2 Pita 1:21