Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 12

Ndị nwụrụ anwụ hà ga-adị ndụ ọzọ?

“Ka ihe a ghara iju unu anya, n’ihi na oge na-abịa mgbe ndị niile nọ n’ili ncheta ga-anụ olu ya wee pụta.”

Jọn 5:28, 29

“Chineke ga-akpọlite ndị ezi omume na ndị ajọ omume nwụrụ anwụ.”

Ọrụ Ndịozi 24:15

“Ahụkwara m ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ukwu ma ndị nta, ka ha guzo n’ihu ocheeze ahụ. E meghekwara akwụkwọ mpịakọta dị iche iche. Ma e meghere akwụkwọ mpịakọta ọzọ. Ọ bụ akwụkwọ mpịakọta nke ndụ. E jikwa ihe e dere n’akwụkwọ mpịakọta ndị ahụ kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe otú ha si kpaa àgwà. Oké osimiri hapụrụ ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, ọnwụ na ili hapụkwara ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ha. E kpekwara ndị ahụ ikpe otú ha si kpaa àgwà n’otu n’otu.”

Mkpughe 20:12, 13