Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 2

Olee Otú Ị Ga-esi Mara Chineke?

“Akwụsịla ịna-ekwu gbasara ihe e dere n’akwụkwọ Iwu a. I kwesịrị ịna-agụ ya ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị, ka i wee lezie anya na-eme ihe niile e dere na ya. Ime ihe ndị a ga-eme ka ihe na-agaziri gị, meekwa ka ị na-akpa àgwà onye ma ihe.”

Joshụa 1:8

“Ha wee na-agụpụta ihe dị n’akwụkwọ ahụ, ya bụ, ihe dị n’Iwu ezi Chineke. Ha nọ na-akọwa ya nke ọma, na-emekwa ka o doo anya. Ha wee nyere ndị mmadụ aka ịghọta ihe a na-agụpụta.”

Nehemaya 8:8

“Onye ọ bụla nke na-anaghị eso ndụmọdụ ndị ajọ omume . . . na-enwe obi ụtọ. Iwu Jehova na-atọ ya ụtọ, ọ na-agụkwa iwu ya ma na-atụgharị uche na ya ehihie na abalị. . . . Ihe ọ bụla ọ na-eme ga-aga nke ọma.”

Abụ Ọma 1:1-3

“Filip wee gbara ọsọ gaa n’akụkụ ụgbọ ahụ ma nụ ka nwoke ahụ na-agụpụta akwụkwọ Aịzaya onye amụma. Filip asị ya: ‘Ị̀ na-aghọta ihe ị na-agụ?’ Ya asị: ‘Olee otú m ga-esi ghọta ihe m na-agụ ma ọ bụrụ na o nweghị onye kọwaara m ya?’”

Ọrụ Ndịozi 8:30, 31

 “E leruo otú e si kee ụwa anya, a na-ahụ àgwà ya ndị a na-anaghị ahụ anya. Ihe ndị o kere na-eme ka a ghọta ụdị onye ọ bụ. Ha na-eme ka a mata na ike ya na-adịru ebighị ebi nakwa na ọ bụ Chineke. Ndị na-eleghara ihe ndị a anya enweghị ihe mere ha ga-eji kwuo na Chineke adịghị.”

Ndị Rom 1:20

“Na-echebara ihe ndị a echiche. Ka obi gị niile dịrịkwa na ha, ka mmadụ niile wee hụ na ị na-eme nke ọma n’ọgbakọ.”

1 Timoti 4:15

“Ka anyị na-echebakwara ibe anyị echiche n’ihi na ọ ga-eme ka anyị na-ahụrịta ibe anyị n’anya ma na-arụ ezigbo ọrụ. Ka anyị ghara ịhapụ nzukọ anyị.”

Ndị Hibru 10:24, 25

“Ọ bụrụkwa na e nwere onye n’ime unu chọrọ amamihe, ya na-arịọ Chineke n’ihi na Chineke na-emesapụrụ mmadụ niile aka. Ọ gaghị ewesa ya iwe, kama ọ ga-emere ya ihe ọ rịọrọ.”

Jems 1:5