Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 16

Olee Ihe Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Ịna-echegbu Onwe Gị?

“Bunye Jehova ibu na-anyịgbu gị. Ọ ga-enyere gị aka. E nweghị mgbe ọ ga-ahapụ onye ezi omume ka ọ daa.”

Abụ Ọma 55:22

“Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya, ma ndị niile ọ na-adị ngwa ngwa na-ada ogbenye.”

Ilu 21:5

“Atụla egwu, n’ihi na m nọnyeere gị. Echegbula onwe gị, n’ihi na abụ m Chineke gị. M ga-eme ka ị dị ike. M ga-enyekwara gị aka. M ga-eji aka nri m, bụ́ aka m ji eme ihe ziri ezi, jidesie gị ike.”

Aịzaya 41:10

“Ònye n’ime unu ga-agbakwụnyeli otu kubit n’afọ ndụ ya maka na ọ na-echegbu onwe ya?”

Matiu 6:27

“N’ihi ya, unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na a ga-enwe ihe unu ga-eche banyere ya echi. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuorola ya.”

Matiu 6:34

 “Na-achọpụta ihe ndị ka mkpa.”

Ndị Filipaị 1:10

“Unu echegbula onwe unu banyere ihe ọ bụla, kama n’ihe niile, na-ekpenụ ekpere, na-arịọsikwanụ Chineke arịrịọ ike ma na-ekele ya. Ọ bụ otú unu ga-esi mee ka ọ mara ihe unu na-arịọ. Udo Chineke na-enye, nke karịrị nghọta mmadụ, ga-esi n’aka Kraịst Jizọs chee obi unu na echiche unu nche.”

Ndị Filipaị 4:6, 7