Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 17

Olee Ihe Baịbụl Kwuru Ga-enyere Ezinụlọ Gị Aka?

NDỊ BỤ́ DI NA NDỊ BỤ́ NNA

“Ndị bụ́ di kwesịkwara isi otú ahụ hụ nwunye ha n’anya otú ha si hụ ahụ́ nke ha n’anya. Onye hụrụ nwunye ya n’anya hụrụ onwe ya n’anya. N’ihi na ọ dịghị mmadụ ọ bụla kpọtụrụla ahụ́ ya asị, kama ọ na-azụ ahụ́ ya, na-elekọtakwa ya . . . Onye ọ bụla n’ime unu hụ nwunye ya n’anya otú ọ hụrụ onwe ya.”

Ndị Efesọs 5:28, 29, 33

“Ndị nna, unu akpasula ụmụ unu iwe, kama na-azụnụ ha, na-agbazikwanụ ha otú Jehova chọrọ.”

Ndị Efesọs 6:4

NDỊ BỤ́ NWUNYE

“Nwunye kwesịkwara ịna-akwanyere di ya ezigbo ùgwù.”

Ndị Efesọs 5:33

“Ndị nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di unu. Ọ bụ ihe Onyenwe anyị chọrọ.”

Ndị Kọlọsi 3:18

 NDỊ BỤ́ ỤMỤ

“Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi otú dị Onyenwe anyị mma, n’ihi na ọ bụ ihe Chineke chọrọ. ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị’ bụ iwu mbụ e nyere nke ga-eme ka i nweta ngọzi a: ‘Ka ihe wee gaziere gị, gị adịkwa ogologo ndụ n’ụwa.’”

Ndị Efesọs 6:1-3

“Ụmụ, na-eruberenụ ndị mụrụ unu isi n’ihe niile, n’ihi na ọ na-amasị Onyenwe anyị.”

Ndị Kọlọsi 3:20