Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 10

Olee Ihe Baịbụl Kwere Anyị ná Nkwa Ga-eme n’Ọdịnihu?

“Ndị ezi omume ga-enweta ụwa, ha ga-ebikwa na ya ruo mgbe ebighị ebi.”

Abụ Ọma 37:29

“Ụwa na-adịru mgbe ebighị ebi.”

Ekliziastis 1:4

“Ọ ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị ruo mgbe ebighị ebi. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri dị n’ihu mmadụ niile.”

Aịzaya 25:8

“Mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya ndị ìsì, megheekwa ntị ndị ntị chiri. Mgbe ahụ ka onye ngwọrọ ga-awụli elu ka mgbada. Onye ogbi ga-etikwa mkpu ọṅụ. Mmiri ga na-agbapụta n’ala ịkpa. Iyi ga na-asọkwa n’ọzara.”

Aịzaya 35:5, 6

“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya. Ọnwụ agaghịzi adị. Iru uju ma ọ bụ ibe ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịzi adị. Ihe mbụ niile agafeela.”

Mkpughe 21:4

 “Ha ga-arụ ụlọ, birikwa na ha. Ha ga-akọ ubi vaịn, rie ihe si na ya. Ha agaghị arụ ụlọ, onye ọzọ ebichie ya, ha agaghị akụ mkpụrụ, onye ọzọ erie ihe si na ya. N’ihi na ndị m ga-anọ ogologo ndụ otú osisi si anọ. Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.”

Aịzaya 65:21, 22