Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 AJỤJỤ NKE 7

Olee Amụma Ndị Dị na Baịbụl Gbasara Oge Anyị A?

“Mba ga-alụso mba ọzọ agha, alaeze ga-alụsokwa alaeze ọzọ agha . . . Ihe ndị a niile bụ mmalite ihe mgbu.”

Matiu 24:7, 8

“A ga-enwe ọtụtụ ndị amụma ụgha, ha ga-eduhiekwa ọtụtụ ndị. Ịhụnanya ọtụtụ ndị ga-ajụkwa oyi n’ihi otú mmebi iwu si ju ebe niile.”

Matiu 24:11, 12

“Mgbe unu na-anụkwa mkpọtụ agha na akụkọ agha, unu atụla ụjọ. Ihe ndị a ga-emerịrị. Ma ọgwụgwụ erubeghị.”

Mak 13:7

“A ga-enwe oké ala ọma jijiji, ụkọ nri na ọrịa na-efe efe ga-adịkwa n’ebe dị iche iche. A ga-ahụkwa ihe ndị na-atụ egwu, nweekwa oké ihe àmà dị iche iche n’eluigwe.”

Luk 21:11

 “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, ndị na-ekwulu ndị ọzọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, ndị na-enweghị obi mmadụ, . . . ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị, ndị na-eme ndị enyi ha ihe ọjọọ, ndị isi ike, ndị onwe ha na-ebu isi, ndị ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya, ndị na-eme ka hà ji ife Chineke kpọrọ ihe, ma ha anaghị erubere ya isi.”

2 Timoti 3:1-5