Zekaraya 9:1-17

  • Ihe Chineke kpebiri ime mba ndị gbara Juda gburugburu (1-8)

  • Eze Zayọn na-abịa (9, 10

    • Eze dị umeala n’obi nọ n’elu jakị (9)

  • A ga-akpọpụta ndị Jehova a tụrụ mkpọrọ (11-17)

9  Ihe Chineke kpebiri ime: “Jehova ekwuola ihe ọ ga-eme ala Hedrak. Ọ bụ Damaskọs ka ọ ga-eme ya,+N’ihi na anya Jehova na-ahụ ụmụ mmadụ+Nakwa ebo niile e nwere n’Izrel.   Ọ ga-emekwa ya Hemat,+ nke ya na ya gbara ókè,Meekwa ya Taya+ na Saịdọn+ n’ihi na ha ma ihe nke ukwuu.+   Taya rụụrụ onwe ya mgbidi siri ike. O kpokọtara ọlaọcha ka ájá,Kpokọtakwa ọlaedo ka apịtị dị n’okporo ámá.+   Lee, Jehova ga-anapụ ya ihe ndị o nwere. Ọ ga-ebibi ndị agha ya n’oké osimiri,+Ọkụ ga-erepịakwa ya.+   Ashkelọn ga-ahụ ya ma tụọ egwu. Ọ ga-ewute Gaza nke ukwuu,Wutekwa Ekrọn maka na e menyela ihe ọ tụkwasịrị obi ihere. Eze Gaza ga-anwụ,E nweghịkwa onye ga-ebi n’Ashkelọn.+   Onye mba ọzọ ga-ebi n’Ashdọd,M ga-ebibikwa ihe onye Filistia ji anya isi.+   M ga-ewepụ ihe ndị dị ya n’ọnụ ọbara tetọrọ,Wepụkwa ihe ndị na-asọ oyi dị ya n’ezé. A ga-ahapụ ya ka ọ fọdụrụ Chineke anyị. Ọ ga-adị ka onyeisi na Juda,+Onye Ekrọn ga-adịkwa ka onye Jebus.+   M ga-eguzoro n’ihu ụlọ m na-eche ya nche,+Ka a ghara inwe onye ga-esi na ya na-apụ apụ ma ọ bụ na-abata abata. E nweghị onyeisi ọrụ* ga-esi na ya gafere ọzọ,+N’ihi na m jirila anya m hụ ya* ugbu a.   Zayọn,* ṅụrịa nnukwu ọṅụ. Jeruselem,* tie mkpu mmeri. Lee! Eze gị na-abịakwute gị.+ Ọ bụ onye ezi omume. Ọ na-eweta nzọpụta.* Ọ dị umeala n’obi,+ ọ nọkwa n’elu jakị,N’elu nwa jakị,* nwa nne jakị mụrụ.+ 10  M ga-ewepụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem,Wepụkwa ịnyịnya na Jeruselem. A ga-ewepụ ụta agha. Ọ ga-agwakwa mba dị iche iche na udo ga-adịrị ha.+ Ọchịchị ya ga-amalite n’oké osimiri ruo n’oké osimiri,Malitekwa n’Osimiri Yufretis ruo n’ebe niile ụwa sọtụrụ.+ 11  Ma gị, nwaanyị,* n’ihi ọbara ọgbụgba ndụ mụ na gị,M ga-akpọpụta ndị gị a tụrụ mkpọrọ n’olulu nke mmiri na-adịghị.+ 12  Unu ndị mkpọrọ ndị nwere olileanya, laghachinụ n’ebe a rụsiri ike.+ Taa, ana m asị gị,‘Nwaanyị, m ga-akwụ gị ụgwọ okpukpu abụọ.+ 13  M ga-ekwe Juda* ka ụta m. M ga-eji Ifrem mere akụ́ ụta m. Zayọn, m ga-akpọte ụmụ gị Ka ha megide ụmụ Gris,M ga-emekwa ka ị dị ka mma agha onye agha.’ 14  Jehova ga-eme ka a mara na ya nọnyeere ha,Akụ́ ọ ga-agba ga-apụ ngwa ngwa ka àmụ̀mà. Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-afụ opi,+Ọ ga-esorokwa ifufe nke si n’ebe ndịda gawa. 15  Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe ha. Ha ga-emeri ndị iro ha ndị ji èbè* na-agba ha nkume.+ Ha ga-aṅụrị ọṅụ ma na-eti mkpu ka à ga-asị na ha ṅụrụ mmanya. Ha ga-adị ka efere mmanya juru,Dịkwa ka akụkụ ebe ịchụàjà nke ọbara juru na ya.+ 16  Jehova bụ́ Chineke ha ga-azọpụta ha n’ụbọchị ahụOtú onye ọzụzụ atụrụ si azọpụta atụrụ ya;+N’ihi na ha ga na-egbuke egbuke n’ala ya ka ọmarịcha nkume ndị na-adị n’okpueze.+ 17  N’ihi na otú o si dị mma enweghị atụ,+Ọ makwara ezigbo mma. Nri ga-eme ka ụmụ okorobịa na-eme nke ọma,Mmanya ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ* na-eme nke ọma.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “onye mmegide.”
O nwere ike ịbụ ahụhụ ndị ya na-ata.
Na Hibru, “Ada bụ́ Zayọn.”
Na Hibru, “Ada bụ́ Jeruselem.”
Ma ọ bụ “Ọ na-emeri emeri.”
Ma ọ bụ “oké jakị.”
Ya bụ, Zayọn, ma ọ bụ Jeruselem.
Na Hibru, “ga-azọ Juda ụkwụ.”
Èbè bụ ihe yiri katapọt.
Na Hibru, “ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke.”