Zekaraya 13:1-9

  • A ga-ewepụ arụsị niile na ndị amụma ụgha (1-6)

    • Ihere ga-eme ndị amụma ụgha (4-6)

  • A ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ (7-9)

    • A ga-anụcha otu ụzọ n’ime ụzọ atọ (9)

13  “N’ụbọchị ahụ, a ga-egwuru ụlọ Devid na ndị bi na Jeruselem olulu mmiri maka ịsachapụ ha mmehie na unyi.”+  Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “N’ụbọchị ahụ, m ga-ewepụ aha arụsị niile n’ala a,+ a gaghịkwa echeta ha ọzọ. M ga-ewepụkwa ndị amụma+ na ike ndị mmụọ ọjọọ n’ala a.  Ọ bụrụ na mmadụ ebuo amụma ọzọ, nne ya na nna ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-asị ya, ‘Ị gaghị adị ndụ n’ihi na i jirila aha Jehova ghaa ụgha.’ Nne ya na nna ya, bụ́ ndị mụrụ ya, ga-ama ya mma maka amụma o buru.+  “N’ụbọchị ahụ, ihere ga-eme onye amụma nke ọ bụla n’ihi ọhụụ ọ na-akọ mgbe ọ na-ebu amụma ya. Ha agaghịkwa eyi uwe ha ji ebu amụma, nke e ji ajị anụ mee,+ ka ha wee ghọgbuo ndị mmadụ.  Onye nke ọ bụla n’ime ha ga-asị, ‘Abụghị m onye amụma. Abụ m onye ọrụ ubi n’ihi na mmadụ zụụrụ m mgbe m bụ nwata ka m gbawara ya ohu.’  Ọ bụrụ na mmadụ ajụọ ya, sị, ‘Gịnị bụkwanụ ọnyá ndị a dị gị n’ahụ́?’* Ọ ga-aza, sị, ‘Ọ bụ ahụ́ e merụrụ m n’ụlọ ndị enyi m.’”*   Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị, “Mma agha, teta, gaa gbuo onye na-azụ atụrụ m,+Gaa gbuo nwoke bụ́ enyi m. Gbuo onye ọzụzụ atụrụ,+ ka ìgwè atụrụ ya gbasasịa.+ M ga-eweli aka m megide ndị a na-enweghị ihe e ji ha kpọrọ.”   Jehova kwuru, sị, “N’ime ndị bi n’ala niile,A ga-egbu ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ, bibiekwa ha.* Ma, a ga-ahapụ otu ụzọ n’ime ụzọ atọ ka ha fọdụ n’ime ya.   M ga-etinye otu ụzọ n’ime ụzọ atọ ahụ n’ọkụ. M ga-anụcha ha otú e si anụcha ọlaọcha,Nwaleekwa ha otú e si anwale ọlaedo.+ Ha ga-akpọku aha m,M ga-azakwa ha. M ga-asị, ‘Ha bụ ndị m.’+ Ha ga-asịkwa, ‘Jehova bụ Chineke anyị.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’agbata aka gị abụọ?” Ya bụ, n’obi ma ọ bụ n’azụ.
Ma ọ bụ “ndị hụrụ m n’anya.”
Ma ọ bụ “ha ga-anwụkwa.”