Rut 1:1-22

  • Ezinụlọ Elimelek kwagara Moab (1, 2)

  • Naomi, Ọpa, na Rut gbazi aka di (3-6)

  • Rut ekweghị ahapụ Naomi na Chineke Naomi (7-17)

  • Rut so Naomi laghachi Betlehem (18-22)

1  N’oge ndị ikpe+ na-ekpe ikpe, ụnwụ dara n’Izrel. Otu nwoke na nwunye ya na ụmụ ya ndị nwoke abụọ wee si Betlehem,+ nke dị na Juda, gawa ibi n’ala* Moab+ ka ha bụrụ ndị ọbịa n’ebe ahụ.  Aha nwoke ahụ bụ Elimelek.* Aha nwunye ya bụ Naomi.* Aha ụmụ ya ndị nwoke abụọ bụ Malọn* na Kilịọn.* Ha bụ ndị Efrata, ya bụ, ndị Betlehem nke dị na Juda. Ha ruru Moab, biri ebe ahụ.  Ka oge na-aga, Elimelek di Naomi nwụrụ, ya afọzie Naomi na ụmụ ya ndị nwoke abụọ.  E mechaa, ụmụ nwoke ahụ lụrụ ụmụ nwaanyị Moab. Aha otu bụ Ọpa, aha nke ọzọ bụ Rut.+ Ha biri ebe ahụ ihe dị ka afọ iri.  Ụmụ nwoke abụọ ahụ, bụ́ Malọn na Kilịọn, mechara nwụọ, nwaanyị ahụ agbara aka ụmụ, gbarakwa aka di.  Ya na ndị nwunye ụmụ ya wee si Moab lawa, n’ihi na ọ nọ na Moab nụ na Jehova agọziwela ndị ya, nyewe ha nri.*  Naomi na ndị nwunye ụmụ ya wee si ebe ha bi lawa Juda. Ka ha na-aga n’ụzọ,  ọ gwara ndị nwunye ụmụ ya ahụ, sị: “Lawanụ. Onye ọ bụla n’ime unu laghachi n’ụlọ nne ya. Ka Jehova hụ unu n’anya,*+ otú unu hụrụ mụ na ụmụ nwoke ndị ahụ nwụrụ anwụ.  Ka Jehova mee ka obi ruo onye ọ bụla n’ime unu ala* n’ụlọ di ya.”+ O wee susuo ha ọnụ,* ha ebesiwe ákwá ike. 10  Ha wee na-asị ya: “Mba, anyị ga-eso gị lakwuru ndị gị.” 11  Ma Naomi sịrị ha: “Laghachinụ, ụmụ m. Gịnị mere unu ga-eji soro m? M̀ ka nwere ike ịmụta ụmụ nwoke ndị ga-alụwa unu?+ 12  Laghachinụ, ụmụ m. Lawanụ, n’ihi na emeela m ezigbo agadi ịlụ di. Ọ bụrụgodị na m nwere olileanya ịlụ di n’abalị a, ọ bụrụkwa na m ga-amụtali ụmụ nwoke, 13  ùnu ga-anọ na-eche ha ruo mgbe ha toro? Ùnu ga-anọrọ n’alụghị di n’ihi ha? Mba, ụmụ m, otú ahụhụ Jehova na-ata m si rute unu na-ewute m.”+ 14  Ha besiwere ákwá ike ọzọ. E mechaa, Ọpa susuru nne di ya ọnụ lawa. Ma Rut ekweghị ahapụ ya. 15  Naomi wee sị ya: “Nwunye nwanne di gị di ya nwụrụ alakwurula ndị ya na chi ya. Soro nwunye nwanne di gị lawa.” 16  Ma, Rut sịrị ya: “Arịọla m ka m hapụ gị. Arịọkwala m ka m kwụsị iso gị, n’ihi na ebe ị gara ka m ga-aga. Ebe ị ga-arahụ ka m ga-arahụ. Ndị gị ga-abụ ndị m. Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.+ 17  Ebe ị nwụrụ ka m ga-anwụ. Ọ bụkwa n’ebe ahụ ka a ga-eli m. Ka Jehova taa m ahụhụ, ka ọ tasiekwa m ahụhụ ike* ma ọ bụrụ na ọ bụghị naanị ọnwụ ga-ekewa mụ na gị.” 18  Mgbe Naomi hụrụ na Rut kpebisiri ike na ọ ga-eso ya, ọ kwụsịrị ịgwa ya ihe ga-eme ka ọ lawa. 19  Ha abụọ wee na-aga ruo mgbe ha rutere Betlehem.+ Ozugbo ha rutere Betlehem, obodo ahụ niile malitere ịgba ghara ghara n’ihi ha. Ụmụ nwaanyị nọkwa na-asị: “Onye a ọ̀ bụ Naomi?” 20  Ma, ọ na-agwa ụmụ nwaanyị ahụ, sị: “Unu akpọzila m Naomi.* Kpọwanụ m Mera,* n’ihi na Onye Pụrụ Ime Ihe Niile emeela ka ndụ kwụsị ịtọ m ụtọ.+ 21  Aka m juru eju mgbe m pụrụ, ma Jehova emeela ka m gbara aka lọta. Gịnị mere unu ji akpọ m Naomi, ebe ọ bụ na Jehova emegidela m, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile akpatakwarala m ọdachi?”+ 22  Ọ bụ otú a ka Naomi si si Moab lọta,+ ya na Rut nwunye nwa ya, bụ́ onye Moab. Ha rutere Betlehem n’oge a malitere iwe ọka bali n’ubi.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “n’ọhịa.”
Elimelek pụtara “Chineke M Bụ Eze.”
Naomi pụtara “Obi Ụtọ M.”
O nwere ike ịbụ na o si n’okwu Hibru pụtara “agbasighị ike; ịrịa ọrịa.”
Kilịọn pụtara “Onye Na-esighị Ike; Onye Na-anwụ Anwụ.”
Na Hibru, “achịcha.”
Ma ọ bụ “gosi unu ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “ka onye ọ bụla n’ime unu nweta ebe izu ike.”
Otú e si ekele mmadụ n’oge ahụ bụ isusu ya ọnụ, dị ka isusu ya ọnụ na ntì.
Na Hibru, “Ka Jehova mee m otú a, ka ọ tụkwasịkwa ihe na ya.”
Naomi pụtara “Obi Ụtọ M.”
Mera pụtara “Ihe Ilu.”