Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ndị Eze nke Abụọ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ịlaịja kwuru na Ehazaya ga-anwụrịrị (1-18)

  • 2

    • Oké ifufe bugoro Ịlaịja n’eluigwe (1-18)

      • Ịlaịsha chịịrị uwe e ji mara Ịlaịja (13, 14)

    • Ịlaịsha mere ka mmiri Jeriko dị mma (19-22)

    • Anụ ọhịa bea abụọ dọriri ụmụaka ndị Betel (23-25)

  • 3

    • Jehoram malitere ịchị Izrel (1-3)

    • Ndị Moab nupụụrụ ndị Izrel isi (4-25)

    • E meriri ndị Moab (26, 27)

  • 4

    • Ịlaịsha mere ka mmanụ nwaanyị isi mkpe mụbaa (1-7)

    • Nwaanyị Shunem lere Ịlaịsha ọbịa (8-16)

    • E ji nwa nwoke kwụọ otu nwaanyị ụgwọ ihe ọma o mere, nwa ahụ emechaa nwụọ (17-31)

    • Ịlaịsha kpọlitere nwa ahụ nwụrụ anwụ (32-37)

    • Ịlaịsha mere ka ofe dị mma ọrịra (38-41)

    • Ịlaịsha mere ka achịcha mụbaa (42-44)

  • 5

    • Ịlaịsha gwọrọ Neeman ekpenta ọ na-arịa (1-19)

    • Gehezaị rịawara ekpenta maka na ọ dị anyaukwu (20-27)

  • 6

    • Ịlaịsha mere ka isi anyụike see n’elu mmiri (1-7)

    • Ịlaịsha na ndị Siria (8-23)

      • E meghere anya onye na-ejere Ịlaịsha ozi (16, 17)

      • E mere ka ndị Siria kpuo ìsì (18, 19)

    • Oké ụnwụ dara na Sameria mgbe ndị Siria nọchibidoro ya (24-33)

  • 7

    • Ịlaịsha buru amụma mgbe oké ụnwụ ahụ ga-akwụsị (1, 2)

    • Ndị Izrel hụrụ nri ndị Siria hapụrụ ebe ha mara ụlọikwuu gbaa ọsọ (3-15)

    • Amụma Ịlaịsha buru mezuru (16-20)

  • 8

    • E nyeghachiri nwaanyị Shunem ala ya (1-6)

    • Ịlaịsha, Ben-hedad, na Hazel (7-15)

    • Jehoram malitere ịchị Juda (16-24)

    • Ehazaya malitere ịchị Juda (25-29)

  • 9

    • E tere Jihu mmanụ ka ọ bụrụ eze Izre (1-13)

    • Jihu gburu Jehoram na Ehazaya (14-29)

    • E gburu Jezibel, nkịta erie anụ ya (30-37)

  • 10

    • Jihu gburu ndị ezinụlọ Ehab (1-17)

      • Jehonadab nyeere Jihu aka (15-17)

    • Jihu gburu ndị na-efe Bel (18-27)

    • Otú ọchịchị Jihu si gaa (28-36)

  • 11

    • Atalaya weghaara ọchịchị (1-3)

    • E chiri Jehoash eze na nzuzo (4-12)

    • E gburu Atalaya (13-16)

    • Jehoyada mere ka ihe ka mma (17-21)

  • 12

    • Jehoash malitere ịchị Juda (1-3)

    • Jehoash rụziri ụlọ nsọ (4-16)

    • Obodo ndị Siria lụsoro agha (17, 18)

    • E gburu Jehoash (19-21)

  • 13

    • Jehoahaz malitere ịchị Izrel (1-9)

    • Jehoash malitere ịchị Izrel (10-13)

    • Ịlaịsha gwara Jehoash ihe ọ ga-eme ka ọ mara ma ọ̀ na-anụ ọkụ n’obi (14-19)

    • Ịlaịsha nwụrụ, ọkpụkpụ ya mekwara ka otu nwoke si n’ọnwụ bilie (20, 21)

    • Amụma ikpeazụ Ịlaịsha buru mezuru (22-25)

  • 14

    • Amazaya malitere ịchị Juda (1-6)

    • Amazaya lụsoro ndị Ịdọm na ndị Izrel agha (7-14)

    • Jehoash eze Izrel nwụrụ (15, 16)

    • Amazaya nwụrụ (17-22)

    • Jeroboam nke Abụọ malitere ịchị Izrel (23-29)

  • 15

    • Azaraya malitere ịchị Juda (1-7)

    • Ndị eze ikpeazụ chịrị Izrel bụ: Zekaraya (8-12), Shalọm (13-16), Menahem (17-22), Pekahaya (23-26), Pika (27-31)

    • Jotam malitere ịchị Juda (32-38)

  •  16

    • Ehaz malitere ịchị Juda (1-6)

    • Ehaz nyere ndị Asiria onyinye (7-9)

    • Ehaz rụrụ ụdị ebe ịchụàjà ọ hụrụ ndị na-ekpere arụsị rụrụ (10-18)

    • Ehaz nwụrụ (19, 20)

  • 17

    • Hoshia malitere ịchị Izrel (1-4)

    • E meriri ndị Izrel (5, 6)

    • A dọọrọ ndị Izrel n’agha maka na ha hapụrụ Chineke (7-23)

    • A kpọtara ndị obodo ọzọ ha ebichie n’obodo ndị dị na Sameria (24-26)

    • Ndị bi na Sameria na-atụ egwu Chineke, na-efekwa chi dị iche iche (27-41)

  • 18

    • Hezekaya malitere ịchị Juda (1-8)

    • Otú e si dọrọ ndị Izrel n’agha (9-12)

    • Senakerib lụsoro Juda agha (13-18)

    • Rabshake mara Jehova aka (19-37)

  • 19

    • Hezekaya si n’aka Aịzaya rịọ Chineke ka o nyere ya aka (1-7)

    • Senakerib bara mba ihe ha ga-eme ndị bi na Jeruselem (8-13)

    • Ekpere Hezekaya kpere (14-19)

    • Aịzaya gwara Hezekaya ihe Chineke kwuru (20-34)

    • Otu mmụọ ozi gburu ndị Asiria dị 185,000 (35-37)

  • 20

    • Hezekaya rịara ọrịa ma gbakee (1-11)

    • Eze Babịlọn zitere ndị bịara hụ Hezekaya (12-19)

    • Hezekaya nwụrụ (20, 21)

  • 21

    • Manase malitere ịchị Juda. O gburu ọtụtụ mmadụ (1-18)

      • A ga-ebibi Jeruselem (12-15)

    • Emọn malitere ịchị Juda (19-26)

  • 22

    • Josaya malitere ịchị Juda (1, 2)

    • Otú a ga-esi rụzie ihe ndị mebiri n’ụlọ nsọ (3-7)

    • A hụrụ akwụkwọ e dere Iwu Mosis (8-13)

    • Họlda buru amụma ihe ga-eme Juda (14-20)

  • 23

    • Ihe ọma ndị Josaya mere (1-20)

    • Ndị Juda mere Ememme Ngabiga (21-23)

    • Ihe ọma ndị ọzọ Josaya mere (24-27)

    • Josaya nwụrụ (28-30)

    • Jehoahaz malitere ịchị Juda (31-33)

    • Jehoyakim malitere ịchị Juda (34-37)

  • 24

    • Mgbe Jehoyakim nupụrụ isi na mgbe ọ nwụrụ (1-7)

    • Jehoyakin malitere ịchị Juda (8, 9)

    • Ndị mbụ a dọọrọ n’agha laa Babịlọn (10-17)

    • Mgbe Zedekaya malitere ịchị Juda na mgbe o nupụrụ isi (18-20)

  • 25

    • Nebukadneza nọchibidoro Jeruselem (1-7)

    • E bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ a rụrụ na ya, dọrọkwa ndị nke abụọ n’agha (8-21)

    • A họpụtara Gedalaya ka ọ bụrụ gọvanọ (22-24)

    • E gburu Gedalaya, ndị mmadụ agbaga Ijipt (25, 26)

    • A kpọpụtara Jehoyakin n’ụlọ mkpọrọ na Babịlọn (27-30)