Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Mkpughe E Kpugheere Jọn

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ihe Chineke si n’aka Jizọs kpughee (1-3)

    • Jọn kelere ọgbakọ asaa dị n’Eshia (4-8)

      • “Abụ m Alfa na Omega” (8)

    • Mmụọ nsọ mere ka Jọn nọrọ n’ụbọchị Onyenwe anyị (9-11)

    • Jọn hụrụ mgbe Jizọs dị ebube n’ọhụụ (12-20)

  • 2

    • Ihe a gwara ndị Efesọs (1-7), ndị Smeana (8-11), ndị Pagamọm (12-17), na ndị Tayataịra (18-29)

  • 3

    • Ihe a gwara ndị Sadis (1-6), ndị Filadelfịa (7-13), na ndị Leodisia (14-22)

  • 4

    • Jọn hụrụ ọhụụ ebe Jehova nọ n’eluigwe (1-11)

      • Jehova nọ ọdụ n’ocheeze ya (2)

      • Ndị okenye iri abụọ na anọ nọ ọdụ n’ocheeze (4)

      • Ndị mmụọ ozi anọ (6)

  • 5

    • Akwụkwọ mpịakọta e ji ihe asaa e ji aka ihe akara mechie (1-5)

    •  Nwa Atụrụ ahụ gara nara akwụkwọ mpịakọta (6-8)

    • Nwa Atụrụ ahụ ruru eru imeghe ihe ndị e ji mechie akwụkwọ mpịakọta (9-14)

  • 6

    • Nwa Atụrụ ahụ meghere ihe ndị e ji mechie akwụkwọ mpịakọta, malite na nke mbụ ruo na nke isii (1-17)

      • Onye na-agba ịnyịnya ọcha nke na-emeri ndị iro ya (1, 2)

      • Onye na-agba ịnyịnya na-acha uhie uhie ga-ewepụ udo n’ụwa (3, 4)

      • Onye na-agba ịnyịnya ojii ga-eme ka e nwee ụkọ nri n’ụwa (5, 6)

      • Aha onye na-agba ịnyịnya na-acha ntụ ntụ bụ ọnwụ (7, 8)

      • Ọbara ndị e gburu egbu dị n’okpuru ebe ịchụàjà (9-11)

      • E nwere oké ala ọma jijiji (12-17)

  • 7

    • Ndị mmụọ ozi anọ jidesiri ifufe na-ebibi ihe ike (1-3)

    • A kara mmadụ 144,000 akara (4-8)

    • Oké ìgwè mmadụ ndị yi uwe mwụda na-acha ọcha (9-17)

  • 8

    • E meghere nke asaa n’ime ihe ndị e ji mechie akwụkwọ mpịakọta (1-6)

    • A fụrụ opi nke mbụ ruo nke anọ (7-12)

    • E kwuru na a ga-ata ndị bi n’ụwa ahụhụ atọ (13)

  • 9

    • A fụrụ opi nke ise (1-11)

    • Otu ahụhụ agafeela, ahụhụ abụọ ọzọ ka na-abịa (12)

    • A fụrụ opi nke isii (13-21)

  • 10

    • Otu mmụọ ozi dị ike nke ji obere akwụkwọ mpịakọta n’aka (1-7)

      • “A gaghịzi egbu oge” (6)

      • A ga-emezu ihe nzuzo dị nsọ (7)

    • Jọn tara obere akwụkwọ mpịakọta (8-11)

  • 11

    • Ndị àmà abụọ ndị buru amụma (1-13)

      • Ndị amụma ga-eyi ákwà iru uju buo amụma ụbọchị 1,260 (3)

      • A ga-egbu ndị amụma, a gaghịkwa eli ha (7-10)

      • Ụbọchị atọ na ọkara gafee, Chineke ga-akpọlite ndị amụma n’ọnwụ (11, 12)

    • Ahụhụ nke abụọ agafeela, ahụhụ nke atọ ga-abịakwa (14)

    • A fụrụ opi nke asaa (15-19)

      • Alaeze nke Chineke na nke Kraịst ya (15)

      • Chineke ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa (18)

  • 12

    • Otu nwaanyị na nwa ya nwoke na otu dragọn (1-6)

    • Maịkel lụsoro dragọn agha (7-12)

      • A chụdatara dragọn ahụ n’ụwa (9)

      • Ekwensu ma na oge ya fọrọ ntakịrị (12)

    • Dragọn ahụ kpagburu nwaanyị mụrụ nwa nwoke (13-17)

  • 13

    • Otu anụ ọhịa nwere isi asaa si n’oké osimiri pụta (1-10)

    • Otu anụ ọhịa nwere mpi abụọ si n’ala pụta (11-13)

    • Ihe a kpụrụ akpụ nke yiri anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa (14, 15)

    • Akara na nọmba anụ ọhịa ahụ (16-18)

  • 14

    • Nwa Atụrụ ahụ na 144,000 (1-5)

    • Ozi ọma dị iche iche ndị mmụọ ozi atọ ziri (6-12)

      • Otu mmụọ ozi nọ n’etiti eluigwe na-ezisa ozi ọma (6, 7)

    • Ndị ha na Onyenwe anyị dị n’otu ha anwụọ ga-enwe obi ụtọ (13)

    • Ugboro abụọ e were ihe ubi n’ụwa (14-20)

  • 15

    • Mmụọ ozi asaa ndị ji ihe asaa a ga-eji ata ndị mmadụ ahụhụ (1-8)

      • Abụ Mosis na nke Nwa Atụrụ ahụ (3, 4)

  • 16

    • Efere asaa ihe juru na ha bụ iwe Chineke (1-21)

      • A wụpụrụ ihe dị n’efere ndị ahụ n’ụwa (2), n’oké osimiri (3), n’osimiri na n’isi mmiri dị iche iche (4-7), n’anyanwụ (8, 9), n’elu ocheeze anụ ọhịa (10, 11), n’osimiri Yufretis (12-16), na n’ikuku (17-21)

      • Agha Chineke ga-alụ n’Amagedọn (14, 16)

  • 17

    • Ikpe a mara “Babịlọn Ukwu” (1-18)

      • Oké nwaanyị akwụna nke nọ n’elu otu anụ ọhịa na-acha uhie uhie (1-3)

      • Anụ ọhịa ahụ ‘dịbu adị, ọ dịghịzi, ma ọ ga-esikwa n’abis gbagote’ (8)

      •  Mpi iri ga-alụso Nwa Atụrụ ahụ agha (12-14)

      • Mpi iri ga-akpọ nwaanyị akwụna ahụ asị (16, 17)

  • 18

    • “Babịlọn Ukwu ahụ adaala!” (1-8)

      • “Ndị nke m, sinụ n’ime ya pụta” (4)

    • Ákwá a ga-ebere Babịlọn maka na ọ daala (9-19)

    • Ndị nọ n’eluigwe ṅụrịrị ọṅụ maka na Babịlọn adaala (20)

    • A ga-atụba Babịlọn n’oké osimiri dị ka à tụbara nkume (21-24)

  • 19

    • Toonụ Jaa maka ikpe o kpere (1-10)

      • Agbamakwụkwọ Nwa Atụrụ ahụ (7-9)

    • Onye na-agba otu ịnyịnya ọcha (11-16)

    • Nnukwu oriri Chineke kpọrọ (17, 18)

    • E meriri anụ ọhịa ahụ (19-21)

  • 20

    • A ga-eke Setan agbụ otu puku afọ (1-3)

    • Ndị ga-eso Kraịst chịa otu puku afọ (4-6)

    • A ga-atọpụ Setan na mkpọrọ, bibizie ya (7-10)

    • E kpere ndị nwụrụ anwụ ikpe n’ihu ocheeze na-acha ọcha (11-15)

  • 21

    • Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ (1-8)

      • Ọnwụ agaghịzi adị (4)

      • E mere ihe niile ka ha dị ọhụrụ (5)

    • A kọwara otú Jeruselem Ọhụrụ dị (9-27)

  • 22

    • Osimiri nke mmiri nke ndụ (1-5)

    • Ihe ikpeazụ e kwuru (6-21)

      • “Bịa ṅụọ mmiri nke ndụ n’efu” (17)

      • “Bịa, Onyenwe anyị Jizọs” (20)