Ozi Ọma Matiu Dere 26:1-75

  • Ndị nchụàjà kpara nkata igbu Jizọs (1-5)

  • Otu nwaanyị wụrụ mmanụ na-esi ísì ọma n’isi Jizọs (6-13)

  • Ememme Ngabiga ikpeazụ na ịrara Jizọs nye (14-25)

  • Jizọs malitere Nri Anyasị nke Onyenwe Anyị (26-30)

  • Jizọs kwuru na Pita ga-agọnahụ ya (31-35)

  • Jizọs kpere ekpere na Getsemeni (36-46)

  • Mgbe e jidere Jizọs (47-56)

  • Mgbe a na-ekpe Jizọs ikpe na Sanhedrin (57-68)

  • Pita gọnahụrụ Jizọs (69-75)

26  Mgbe Jizọs kwuchara ihe a niile, ọ sịrị ndị na-eso ụzọ ya:  “Unu ma na ọ fọrọ abalị abụọ ka e mee Ememme Ngabiga,+ a ga-enyefekwa Nwa nke mmadụ ka e gbuo ya n’elu osisi.”+  Ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu wee zukọta na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà aha ya bụ Kayafas+  ma gbaa izu+ otú ha ga-esi jiri aghụghọ jide Jizọs, gbuokwa ya.  Ma, ha nọ na-asị: “Ọ bụghị n’oge ememme a, ka ndị mmadụ ghara ịgbawa aghara.”  Mgbe Jizọs nọ na Betani, n’ụlọ Saịmọn onye ekpenta,+  otu nwaanyị ji mkpọ̀ alabasta,* nke mmanụ na-esi ísì ọma dị n’ime ya, bịakwute ya. Mmanụ ahụ dịkwa oké ọnụ. Nwaanyị ahụ wee malite ịwụkwasị ya n’isi ya ka ọ nọ na-eri ihe.  Mgbe ndị na-eso ụzọ ya hụrụ ihe a, ha were iwe, sị: “Gịnị mere e ji laa mmanụ a n’iyi?  N’ihi na a gaara ereta ya ezigbo ego ma nye ya ndị ogbenye.” 10  Ebe Jizọs ma ihe ha na-ekwu, ọ sịrị ha: “Gịnị mere unu ji na-enye nwaanyị a nsogbu? O meere m ihe ọma. 11  N’ihi na unu na ndị ogbenye nọ mgbe niile,+ ma mụ na unu agaghị anọ mgbe niile.+ 12  Nwaanyị a tere m mmanụ a na-esi ísì ọma ka ọ kwadebe m maka olili.+ 13  N’eziokwu, ana m asị unu na n’ebe ọ bụla a na-ekwusa ozi ọma a n’ụwa niile, a ga na-akọ ihe nwaanyị a mere, jiri ya na-echeta ya.”+ 14  Otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, onye aha ya bụ Judas Iskarịọt,+ gakwuuru ndị isi nchụàjà+ 15  wee sị ha: “Gịnị ka unu ga-enye m ka m rara ya nye n’aka unu?”+ Ha wee kwekọrịta inye ya mkpụrụ ego ọlaọcha iri atọ.+ 16  N’ihi ya, malite mgbe ahụ gawa, ọ nọ na-achọ oge ga-adaba adaba ọ ga-eji rara ya nye. 17  N’ụbọchị mbụ nke Ememme Achịcha Na-ekoghị Eko,+ ndị na-eso ụzọ Jizọs bịakwutere ya, sị ya: “Olee ebe ị chọrọ ka anyị kwadebere gị ka ị nọrọ rie nri Ememme Ngabiga?”+ 18  O wee sị ha: “Banyenụ n’ime obodo, n’ụlọ onye dị otú a. Sịnụ ya, ‘Onye Ozizi sịrị: “Oge m a kara aka dị nso. Mụ na ndị na-eso ụzọ m ga-eme Ememme Ngabiga n’ụlọ gị.”’” 19  Ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe ọ gwara ha, kwadebekwa maka Ememme Ngabiga ahụ. 20  Mgbe o ruru ná mgbede,+ ya na ndị na-eso ụzọ ya iri na abụọ ahụ nọ na-eri ihe na tebụl.+ 21  Mgbe ha nọ na-eri ihe, ọ sịrị ha: “N’eziokwu, ana m asị unu, otu onye n’ime unu ga-arara m nye.”+ 22  Ihe a wutere ha nke ukwuu. Ha niile n’otu n’otu amalite ịsị ya: “Onyenwe anyị, ọ bụghị m, ka ọ̀ bụ m?” 23  O wee sị ha: “Ọ bụ onye mụ na ya ga-amanyekọ aka n’efere ga-arara m nye.+ 24  N’eziokwu, Nwa nke mmadụ na-ahapụ unu, otú e dere banyere ya. Ma, onye ga-arara Nwa nke mmadụ nye+ ga-ata ahụhụ.+ Ọ gaara akara onye ahụ mma ma a sị na a mụghị ya amụ.”+ 25  Judas, onye na-aga ịrara ya nye, wee sị ya: “Onye Ozizi,* ọ̀ bụ m?” Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.”* 26  Mgbe ha nọ na-eri ihe, Jizọs weere otu ogbe achịcha. Mgbe ọ gọzichara ya, ọ nyawara ya,+ nye ya ndị na-eso ụzọ ya, sị ha: “Naranụ, taa. Nke a pụtara ahụ́ m.”+ 27  O bukwaara iko, kelee Chineke, bunyekwa ha ya, sị: “Unu niile, ṅụọnụ ihe dị na ya,+ 28  n’ihi na nke a pụtara ọbara m,+ bụ́ ‘ọbara ọgbụgba ndụ’+ nke a ga-awụpụ ka e wee gbaghara ọtụtụ ndị+ mmehie ha.+ 29  Ma ana m asị unu na agaghị m aṅụ mmanya si ná mkpụrụ vaịn ọzọ ruo ụbọchị ahụ mụ na unu ga-aṅụ nke ọhụrụ n’Alaeze Nna m.”+ 30  N’ikpeazụ, mgbe ha bụchara abụ otuto,* ha gawara n’Ugwu Oliv.+ 31  Jizọs gwaziri ha, sị: “Unu niile ga-ahapụ m n’abalị a, n’ihi na e dere, sị: ‘M ga-egbu onye ọzụzụ atụrụ, ìgwè atụrụ ya ga-agbasasịkwa.’+ 32  Ma, a kpọlitechaa m n’ọnwụ, m ga-ebu unu ụzọ gaa Galili.”+ 33  Ma Pita sịrị ya: “Ọ bụrụgodị na ndị ọzọ niile ahapụ gị, o nweghị ihe ga-eme ka m hapụ gị.”+ 34  Jizọs wee sị ya: “N’eziokwu, ana m asị gị, n’abalị a, tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ 35  Pita asị ya: “Ọ bụrụgodị na m ga-eso gị nwụọ, e nweghị ihe ga-eme ka m gọnahụ gị.”+ Ndị ọzọ niile na-eso ụzọ ya kwukwara otu ihe ahụ. 36  Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya bịaziri ebe a na-akpọ Getsemeni.+ O wee sị ha: “Nọdụnụ ala ebe a ka m gaa ebe nke ọzọ kpee ekpere.”+ 37  Ọ kpọọrọ Pita na ụmụ Zebedi abụọ. Ọ malitekwara ichegbu onwe ya nke ukwuu.+ 38  O wee sị ha: “Ọ na-ewutesi m ike.* Nọrọnụ ebe a, sorokwanụ m na-eche nche.”+ 39  Mgbe ọ gatụrụ n’ihu, o gburu ikpere n’ala, kpudo ihu n’ala, kpee ekpere, sị:+ “Nna m, ọ bụrụ na o kwe mee, ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a.+ Ma, ọ bụghị ka e mee ihe m chọrọ, kama ka ihe ị chọrọ mee.”+ 40  Ọ bịaghachiri n’ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ ma hụ ka ha na-ehi ụra. O wee sị Pita: “Ọ̀ bụ na unu enweghị ike iso m chee nche ọ bụrụgodị otu awa?+ 41  Na-echenụ nche,+ na-ekpekwanụ ekpere mgbe niile,+ ka a ghara ịnwata unu.+ N’eziokwu, ọ na-agụ mmadụ ime ihe dị mma,* ma anụ ahụ́ ya adịghị ike.”+ 42  Ọ gara ọzọ kpee ekpere nke ugboro abụọ, sị: “Nna m, ọ bụrụ na ọ gaghị ekwe omume ka m ghara ịṅụ ihe dị n’iko a, ka uche gị mee.”+ 43  Ọ bịaghachikwara hụ ka ha na-ehi ụra, n’ihi na ụra ji ha aka ọjọọ. 44  Ọ hapụrụ ha ọzọ pụọ gaa kpee ekpere nke ugbo atọ, kwughachi otu ihe ahụ. 45  Ọ bịaghachiri ebe ndị na-eso ụzọ ya nọ, sị ha: “N’ụdị oge dị otú a ka unu na-ehi ụra, na-ezukwa ike. Oge eruola ka a rara Nwa nke mmadụ nye n’aka ndị mmehie. 46  Bilienụ ka anyị pụọ. Lee, onye ga-arara m nye abịala nso.” 47  Mgbe ọ ka kpụ okwu n’ọnụ, Judas, otu n’ime ndịozi ya iri na abụọ, bịara, ya na ìgwè mmadụ ndị ji mma agha na okpiri. Ọ bụ ndị isi nchụàjà na ndị okenye ndị Juu dunyere ha.+ 48  Onye ga-arara ya nye nyere ha ihe àmà, sị: “Onye ọ bụla m susuru ọnụ, ọ bụ ya. Jidenụ ya.” 49  O wee gakwuru Jizọs, sị: “Onye Ozizi,* ndeewo.” O wee jiri nwayọọ susuo ya ọnụ. 50  Ma Jizọs sịrị ya: “Enyi, gịnị mere i ji bịa ebe a?”+ Ha wee bịa jide Jizọs, kpụrụ ya. 51  Ma, otu n’ime ndị so Jizọs mịịrị mma agha ya, gbuo ya ohu nnukwu onye nchụàjà, bepụ ya ntị.+ 52  Jizọs wee sị ya: “Mịghachi mma agha gị n’ọbọ ya,+ n’ihi na ndị niile na-egbu ndị ọzọ mma agha ga-esi ná mma agha laa n’iyi.+ 53  Ka ì chere na mụ agaghị arịọli Nna m ka o zitere m ọtụtụ puku* ndị mmụọ ozi ugbu a?+ 54  Ya dị otú ahụ, oleezi otú Akwụkwọ Nsọ, nke kwuru na ihe ga-esi otú a mee, ga-esi mezuo?” 55  Jizọs gwaziri ìgwè mmadụ ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa ijide m ka à ga-asị na unu bịara ijide onye ohi? M na-anọdụ ala kwa ụbọchị n’ụlọ nsọ, na-ezi ihe,+ ma unu ejideghị m.+ 56  Ma ihe a niile mere ka ihe ndị amụma dere n’Akwụkwọ Nsọ wee mezuo.”+ Ndị na-eso ụzọ ya niile wee hapụ ya gbaa ọsọ.+ 57  Ndị jidere Jizọs duuru ya gakwuru Kayafas,+ bụ́ nnukwu onye nchụàjà, ebe ndị odeakwụkwọ na ndị okenye zukọtara.+ 58  Ma Pita nọ ebe dị anya na-eso ya n’azụ, ruo na mbara èzí nnukwu onye nchụàjà ahụ. Mgbe ọ banyere n’ime, o so ndị na-eje ozi n’ụlọ nọrọ ọdụ ka ọ hụ ihe ga-emecha mee.+ 59  N’oge ahụ, ndị isi nchụàjà na ndị ọzọ so ná ndị Sanhedrin* nọ na-achọgharị ebubo ha ga-ebo Jizọs ka ha wee gbuo ya.+ 60  Ma ha achọtaghị, ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị akaebe ụgha pụtara.+ E mechaa, mmadụ abụọ pụtara 61  wee sị: “Nwoke a sịrị, ‘Enwere m ike ịkwatu ụlọ nsọ Chineke ma jiri ụbọchị atọ rụghachi ya.’”+ 62  Nnukwu onye nchụàjà wee bilie ọtọ, sị ya: “Ị̀ gbara nkịtị? Ị́ nụghị ebubo ndị a na-ebo gị?”+ 63  Ma Jizọs gbachiri nkịtị.+ N’ihi ya, nnukwu onye nchụàjà ahụ sịrị ya: “Eji m Chineke dị ndụ na-eme ka ị ṅụọ iyi na ị ga-agwa anyị ma ọ̀ bụ gị bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”+ 64  Jizọs asị ya: “Ọ bụ gị kwuru ya.* Ma ana m asị unu: Si ugbu a gawa, unu ga-ahụ Nwa nke mmadụ+ ka ọ nọ ọdụ n’aka nri Chineke dị ike*+ ma na-abịa n’ígwé ojii nke eluigwe.”+ 65  Nnukwu onye nchụàjà wee dọwaa uwe elu ya, sị: “O kwuluola Chineke! Ànyị ka kwesịrị ịchọwa ndị akaebe? Unu anụlanụ na o kwuluola Chineke. 66  Gịnị ka unu chere?” Ha asị: “O kwesịrị ịnwụ.”+ 67  Ha gbụrụ ya asọ mmiri n’ihu+ ma suo ya ọkpọ.+ Ndị ọzọ mara ya ụra n’ihu,+ 68  sị ya: “Kraịst, buoro anyị amụma. Ònye tiri gị ihe?” 69  Pita nọkwa ọdụ na mbara èzí ahụ. Otu nwa agbọghọ na-eje ozi ebe ahụ wee bịakwute ya, sị: “Gị na Jizọs onye Galili na-anọ.”+ 70  Ma ọ gọrọ agọ n’ihu ha niile, sị: “Amaghị m ihe ị na-ekwu.” 71  Mgbe ọ gara n’ọnụ ụzọ ámá, nwa agbọghọ ọzọ matara na ọ bụ ya wee gwa ndị nọ ebe ahụ, sị: “Nwoke a na Jizọs onye Nazaret na-anọ.”+ 72  Ọ gọkwara agọ, ṅụọ iyi, sị: “Amaghị m nwoke ahụ.” 73  Mgbe obere oge gachara, ndị guzo gburugburu bịara sị Pita: “O doro anya na ị bụ otu n’ime ha, n’ihi na n’eziokwu, asụsụ gị agbaala gị àmà.” 74  Ọ maliteziri ịbụ onwe ya ọnụ na ịṅụ iyi, na-asị: “Amaghị m nwoke ahụ.” Ozugbo ahụ, oké ọkpa akwaa. 75  Pita wee cheta na Jizọs sịrị: “Tupu oké ọkpa akwaa, ị ga-agọnahụ m ugboro atọ.”+ O wee pụọ n’èzí bee ezigbo ákwá.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Grik, “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Ma ọ bụ “abụ ọma.”
Na Grik, “Ọ na-ewute mkpụrụ obi m nke ukwuu, ọbụna ruo ọnwụ.”
Na Grik, “mmụọ dị njikere.”
Na Grik, “Rabaị.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “ụsụụ iri na abụọ.” Otu ụsụụ ndị agha ndị Rom n’oge ochie na-adị malite n’ihe dị ka puku anọ ruo puku isii. Na Baịbụl, “ụsụụ” nwere ike ịbụ ihe a na-agaghị agụtali ọnụ.
Ọ bụ akpaala okwu ndị Juu nke na-egosi na mmadụ kwetara ihe e kwuru.
Na Grik, “n’aka nri nke ike.”