Ozi Ọma Mak Dere 7:1-37

  • Ọ gbara ọdịnala ụmụ mmadụ n’anwụ (1-13)

  • Ihe na-emerụ mmadụ na-esi n’obi apụta (14-23)

  • Okwukwe nwaanyị Finishia (24-30)

  • Ọ gwọrọ onye ntị chiri (31-37)

7  Ndị Farisii na ụfọdụ ndị odeakwụkwọ ndị si Jeruselem bịa gbakọtara n’ebe ọ nọ.+  Ha hụrụ ka ụfọdụ ndị na-eso ụzọ ya ji aka rụrụ arụ, ya bụ, aka a na-akwọghị akwọ, na-eri nri.*  (N’ihi na ndị Farisii na ndị Juu niile anaghị eri ihe, ọ gwụla ma hà kwọruru aka n’ikpere aka maka na ha na-eso ọdịnala ndị oge gboo.  Ha si ahịa lọta, ha anaghị eri ihe, ọ gwụla ma hà ji mmiri sachaa onwe ha. E nwekwara ọtụtụ ọdịnala ndị ọzọ e nyefere ha ha na-esosi ike, dị ka imikpu iko, udu, na arịa ndị e ji ọla kọpa kpụọ ná mmiri.*)+  Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ ahụ wee jụọ ya, sị: “Gịnị mere na ndị na-eso ụzọ gị anaghị eso ọdịnala ndị oge gboo, kama ha na-eji aka rụrụ arụ eri nri?”+  Ọ sịrị ha: “Ndị ihu abụọ, ihe Aịzaya buru n’amụma banyere unu dabara adaba. O dere, sị, ‘Ndị a na-asị na ha na-asọpụrụ m, ma obi ha adịghị n’ebe m nọ.+  Ọ bụ n’efu ka ha na-efe m n’ihi na ihe ha na-akụzi bụ ihe mmadụ nyere n’iwu.’+  Unu na-ahapụ iwu Chineke ma na-eso ọdịnala ụmụ mmadụ.”+  Ọ gwakwara ha, sị: “Unu ji aghụghọ* na-eleghara iwu Chineke anya ka unu wee debe ọdịnala unu.+ 10  Dị ka ihe atụ, Mosis sịrị, ‘Sọpụrụ nne gị na nna gị.’+ Ọ sịkwara, ‘A ga-egbu onye kpọrọ nne ya ma ọ bụ nna ya iyi.’*+ 11  Ma unu na-asị, ‘Ọ bụrụ na mmadụ asị nne ya ma ọ bụ nna ya: “Ihe ọ bụla m nwere nke m gaara eji nyere gị aka bụ kọban (ya bụ, onyinye m kwere Chineke ná nkwa),”’ 12  unu anaghịzi ekwe ka o meere nne ya ma ọ bụ nna ya otu mkpụrụ ihe.+ 13  Unu si otú a eji ọdịnala unu nke unu nyefere ndị ọzọ eme ka okwu Chineke bụrụ ihe efu.+ Unu na-emekwa ọtụtụ ihe yiri ya.”+ 14  N’ihi ya, ọ kpọrọ ìgwè mmadụ ahụ ọzọ ka ha bịakwute ya. O wee sị ha: “Geenụ m ntị, unu niile, ghọtakwanụ ihe m na-ekwu.+ 15  E nweghị ihe banyere n’ọnụ mmadụ nke nwere ike imerụ ya, kama ọ bụ ihe na-esi n’obi mmadụ apụta na-emerụ ya.”+ 16 * —— 17  Mgbe ọ hapụrụ ìgwè mmadụ ahụ banye n’ụlọ, ndị na-eso ụzọ ya malitere ịjụ ya ajụjụ banyere ihe atụ ahụ.+ 18  O wee sị ha: “Ùnu bụkwu ndị na-anaghị aghọta ihe ka ha? Ọ̀ bụ na unu amaghị na e nweghị ihe ọ bụla banyere mmadụ n’ọnụ nwere ike imerụ ya, 19  ebe ọ bụ na ọ naghị abanye ya n’obi, kama ọ na-abanye n’afọ ya, sizie n’afọ ya banye n’olulu nsị?” O si otú a kwuo na ihe oriri niile dị ọcha. 20  Ọ sịkwara: “Ọ bụ ihe na-esi n’obi mmadụ apụta na-emerụ ya.+ 21  N’ihi na ọ bụ n’obi mmadụ+ ka echiche ọjọọ ndị a na-esi apụta: ịkwa iko,* izu ohi, igbu mmadụ,* 22  di ma ọ bụ nwunye ịkwa iko, anyaukwu, omume ọjọọ, aghụghọ, ime ihe ọjọọ n’asọghị anya,* anyaụfụ, nkwulu, mpako, enweghị ezi uche. 23  Ihe ọjọọ a niile na-esi n’obi apụta, ha na-emerụkwa mmadụ.” 24  O si ebe ahụ pụọ ma banye n’ógbè Taya na Saịdọn.+ N’ebe ahụ, ọ banyere n’otu ụlọ, ọ chọghịkwa ka onye ọ bụla mata na ọ nọ ya. Ma, ndị mmadụ matara. 25  Ozugbo ahụ, otu nwaanyị nke mmụọ ọjọọ* ji obere nwa ya nwaanyị nụrụ banyere Jizọs ma bịa daa n’ala n’ụkwụ ya.+ 26  Nwaanyị ahụ bụ onye Grik, onye si n’obodo Finishia dị na Siria.* O wee na-arịọ Jizọs ka ọ chụpụ mmụọ ọjọọ ahụ n’ahụ́ nwa ya nwaanyị. 27  Ma Jizọs sịrị ya: “Ka ụmụaka buru ụzọ rijuo afọ n’ihi na e kwesịghị iwere nri ụmụaka tụpụrụ ụmụ nkịta.”+ 28  Ma, nwaanyị ahụ sịrị ya: “Ee, nna anyị ukwu. Ma, ụmụ nkịta ndị nọ n’okpuru tebụl na-eri iberibe ihe ndị si ná nri ụmụaka dapụ.” 29  Jizọs wee sị ya: “Ebe i kwuru ihe a, lawa. Mmụọ ọjọọ ahụ apụọla n’ahụ́ nwa gị nwaanyị.”+ 30  O wee laa n’ụlọ ya ma hụ nwatakịrị ahụ ka o dina n’àkwà.* Mmụọ ọjọọ ahụ ahapụla ya.+ 31  Mgbe Jizọs si n’ógbè Taya na-alaghachi, o si na Saịdọn nakwa ógbè Dikapọlis* gafere ruo n’Oké Osimiri Galili.+ 32  N’ebe a,* ha kpọtaara ya otu nwoke ntị chiri, nke ọ na-esikwara ike ikwu okwu.+ Ha rịọrọ ya ka ọ gwọọ ya.* 33  O wee kpọpụ ya n’ebe ìgwè mmadụ ahụ nọ ma rụnye mkpịsị aka ya n’ime ntị abụọ nwoke ahụ. Ọ gbụpụkwara asọ mmiri, metụ nwoke ahụ aka n’ire.+ 34  O leliziri anya n’eluigwe, kuda ume ma sị ya: “Efata,” ya bụ, “Meghee.” 35  Ntị ya wee meghee,+ nsogbu ọ na-enwe n’ikwu okwu lakwara. O wee malite ikwu okwu nke ọma. 36  Jizọs gwara ndị nọ n’ebe ahụ ka ha ghara ịkọrọ ya onye ọ bụla.+ Ma, ka ọ na-enyekwu ha iwu ka ha na-akọsakwu ya.+ 37  N’eziokwu, o riri ha ọnụ,+ ha asị: “Ihe niile o mere dị ezigbo mma. Ọ na-emedị ka ndị ntị chiri nụ ihe, na-emekwa ka ndị ogbi kwuo okwu.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, aka a na-akwọghị otú omenala ndị Juu kwuru.
Na Grik, “ime iko, udu, na arịa ndị e ji ọla kọpa kpụọ baptizim.”
Ma ọ bụ “akọ.”
Ma ọ bụ “onye kparịrị nne ya ma ọ bụ nna ya.”
Gụọ A3.
Grik, por·nei′a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Ma ọ bụ “igbu ọchụ.”
Ma ọ bụ “ime ihe ọjọọ n’emeghị ihere.” Grik, a·sel′gei·a. Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ma ọ bụ “onye a mụrụ n’obodo Finishia dị na Siria.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Ma ọ bụ “Obodo Nwere Obodo Nta Iri.”
Ya bụ, mgbe Jizọs nọ na Dikapọlis.
Na Grik, “ka o bikwasị ya aka.”