Ozi Ọma Luk Dere 6:1-49

  • Jizọs bụ “Onyenwe Ụbọchị Izu Ike” (1-5)

  • Jizọs gwọrọ otu nwoke aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ (6-11)

  • Ndịozi iri na abụọ (12-16)

  • Jizọs ziri ndị mmadụ ihe, gwọọkwa ndị ọrịa (17-19)

  • Ndị na-enwe obi ụtọ na ndị ga-ata ahụhụ (20-26)

  • Hụnụ ndị iro unu n’anya (27-36)

  • Kwụsịnụ ikpe ikpe (37-42)

  • A na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla (43-45)

  • Ụlọ a rụrụ nke ọma na ụlọ na-enweghị ezigbo ntọala (46-49)

6  Ma o si n’ubi ọka wit na-agafe n’ụbọchị izu ike, ndị na-eso ụzọ ya nọkwa na-aghọrọ ụyọkọ ọka wit,+ na-agbachasị ha, na-ata.+  Ụfọdụ n’ime ndị Farisii wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-eme ihe iwu kwuru ka a ghara ime n’Ụbọchị Izu Ike?”+  Ma Jizọs sịrị ha: “Ọ̀ bụ na unu agụtụbeghị ihe Devid mere mgbe agụụ gụrụ ya na ndị so ya?+  Ọ banyere n’ụlọ Chineke were achịcha a na-enye Chineke taa. O nyekwara ndị so ya, ha ataa. Ma, iwu kwuru na o nweghị onye kwesịrị ịta ya ma e wezụga ndị nchụàjà.”+  Ọ gwakwara ha, sị: “Nwa nke mmadụ bụ Onyenwe Ụbọchị Izu Ike.”+  N’ụbọchị izu ike ọzọ,+ ọ banyere n’ụlọ nzukọ ma malite izi ihe. E nwekwara otu nwoke aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ ebe ahụ.+  Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ na-ele Jizọs anya ka ha hụ ma ọ̀ ga-agwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike, n’ihi na ha na-achọ ihe ha ga-eji bo ya ebubo.  Ma, ọ ma ihe ha na-atụgharị n’uche.+ N’ihi ya, ọ gwara nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, guzoro n’etiti.” O wee bilie guzoro ebe ahụ.  Jizọs sịziri ha: “Ka m jụgodị unu, Iwu ò kwuru ka a na-eme ihe ọma n’Ụbọchị Izu Ike ka ọ̀ bụ ihe ọjọọ, ịzọ ndụ* ka ọ̀ bụ ibibi ya?”+ 10  Mgbe o lechara ha niile anya, ọ sịrị nwoke ahụ: “Gbatịa aka gị.” O wee gbatịa aka ya, aka ya adị mma. 11  Ma ezigbo iwe were ha, ha amalite ịgba izu ihe ha ga-eme Jizọs. 12  Otu ụbọchị, ọ pụrụ gaa n’ugwu ka o kpee ekpere,+ ọ nọkwa na-ekpe ekpere abalị ahụ niile.+ 13  Mgbe chi bọrọ, ọ kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya ka ha bịakwute ya, ya ahọrọ mmadụ iri na abụọ n’ime ha, kpọọkwa ha ndịozi.+ Ha bụ: 14  Saịmọn, onye ọ gụkwara Pita, Andru nwanne ya, Jems, Jọn, Filip,+ Batolomiu, 15  Matiu, Tọmọs,+ Jems nwa Alfiọs, Saịmọn onye a na-akpọ “onye na-anụ ọkụ n’obi,” 16  Judas nwa Jems, na Judas Iskarịọt, onye mechara rara ya nye. 17  Ya na ha wee gbadata, ya eguzoro n’ebe dị larịị, ìgwè ndị na-eso ụzọ ya nọkwa ya, ha na oké ìgwè mmadụ ndị si Judia na Jeruselem nakwa Taya na Saịdọn bụ́ obodo ndị dị n’ụsọ osimiri. Ha bịara ka ha nụrụ okwu ya nakwa ka ọ gwọọ ha ọrịa ha. 18  Ọ gwọkwara ndị mmụọ ọjọọ* ji. 19  Ìgwè mmadụ ahụ niile nọkwa na-achọ ibitụ ya aka, n’ihi na ike si n’ahụ́ ya na-apụ+ wee na-agwọ ha niile. 20  O wee lee ndị na-eso ụzọ ya anya ma malite ịsị: “Unu ndị bụ́ ogbenye na-enwe obi ụtọ, n’ihi na Alaeze Chineke bụ nke unu.+ 21  “Unu ndị agụụ na-agụ ugbu a na-enwe obi ụtọ, n’ihi na afọ ga-eju unu.+ “Unu ndị na-ebe ákwá ugbu a na-enwe obi ụtọ, n’ihi na unu ga-achị ọchị.+ 22  “Unu na-enwe obi ụtọ mgbe ọ bụla ndị mmadụ kpọrọ unu asị,+ nakwa mgbe ọ bụla ha chụpụrụ unu,+ kọchaa unu ma mebie aha unu wee kwuo na unu bụ ndị ọjọọ, n’ihi Nwa nke mmadụ. 23  Ọ bụ ihe ndị ahụ ka ndị nna nna ha mere ndị amụma. Ṅụrịanụ ọṅụ n’ụbọchị ahụ, maliekwanụ elu, n’ihi na ụgwọ ọrụ unu dị ukwuu n’eluigwe.+ 24  “Ma unu ndị bara ọgaranya ga-ata ahụhụ,+ n’ihi na unu enwetazuola ihe niile unu ga-enweta.+ 25  “Unu ndị afọ juru ugbu a ga-ata ahụhụ, n’ihi na agụụ ga-agụ unu. “Unu ndị na-achị ọchị ugbu a ga-ata ahụhụ, n’ihi na unu ga-eru uju ma bee ákwá.+ 26  “Mmadụ niile kwuwe okwu ọma banyere unu, unu ga-ata ahụhụ,+ n’ihi na ụdị ihe a ka ndị nna nna ha mere ndị amụma ụgha. 27  “Ma ana m asị unu ndị na-ege ntị: Unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-emekwaranụ ndị kpọrọ unu asị ihe ọma.+ 28  Na-agọzinụ ndị na-abụ unu ọnụ, na-ekpekwanụ ekpere maka ndị na-akparị unu.+ 29  Onye maa gị ụra n’otu ntì, tụgharịara ya ntì nke ọzọ. Onye nara gị uwe elu gị, ajụla inye ya uwe ime gị.+ 30  Onye ọ bụla rịọrọ gị ihe, nye ya,+ agwakwala onye naara gị ihe gị ka o nyeghachi gị ihe ahụ. 31  “Na-emesokwanụ ndị mmadụ otú unu chọrọ ka ha na-emeso unu.+ 32  “Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị hụrụ unu n’anya ka unu hụrụ n’anya, olee oké ihe unu mere? N’ihi na ndị mmehie hụkwara ndị hụrụ ha n’anya n’anya.+ 33  Ọ bụrụkwa na ọ bụ ndị na-emere unu ihe ọma ka unu na-emere ihe ọma, olee oké ihe unu mere? Ndị mmehie na-emekwa otu ihe ahụ. 34  Ọ bụrụkwa na ndị unu na-agbazinye ihe* bụ ndị unu na-atụ anya ka ha kwụghachi unu, olee oké ihe unu mere?+ Ndị mmehie na-agbazinyekwa ndị mmehie ihe, na-atụkwa anya na ha ga-akwụghachi ha. 35  Kama nke ahụ, unu akwụsịla ịhụ ndị iro unu n’anya, na-emekwanụ ihe ọma. Na-agbazinyekwanụ ihe n’atụwaghị anya inweta ihe ọ bụla.+ Ụgwọ ọrụ unu ga-adịkwa ukwuu, unu ga-abụkwa ụmụ nke Onye Kacha Elu, n’ihi na obiọma ya na-erute ma ndị ọjọọ ma ndị na-anaghị ekele ndị meere ha ihe.+ 36  Na-emenụ ebere otú Nna unu na-eme ebere.+ 37  “Kwụsịkwanụ ikpe ikpe, a gaghịkwa ekpe unu ikpe.+ Kwụsịkwanụ ịma ndị mmadụ ikpe, a gaghịkwa ama unu ikpe. Na-agbagharanụ* ndị mmadụ, a ga-agbagharakwa* unu.+ 38  Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.+ Ha ga-awụjukwa uwe unu n’ọnụ, ihe ha wụnyere ga na-awụfukwa n’agbanyeghị na ha bịara ya aka, yọkọọkwa ya ọnụ. N’ihi na ihe unu ji atụ̀ ihe ka ha ga-eji tụọrọ unu ihe.” 39  O wee meere ha otu ihe atụ, sị: “Onye ìsì ò nwere ike idu onye ìsì? Ọ̀ bụ na ha abụọ agaghị adaba n’olulu?+ 40  Nwa akwụkwọ* anaghị aka onye nkụzi ya. Ma, onye ọ bụla a kụziiri ihe nke ọma ga-adị ka onye nkụzi ya. 41  Gịnịzi mere i ji ele irighiri ahịhịa dị n’anya nwanna gị, ma ị hụghị ogologo osisi dị n’anya gị?+ 42  Gịnị mere ị ga-eji asị nwanna gị, ‘Nwanna m, chere ka m wepụ irighiri ahịhịa dị n’anya gị,’ ebe gịnwa na-ahụghị ogologo osisi dị n’anya nke gị? Onye ihu abụọ, buru ụzọ wepụ ogologo osisi dị n’anya gị, ka i nwee ike ịhụ nke ọma otú ị ga-esi wepụ irighiri ahịhịa n’anya nwanna gị. 43  “N’ihi na o nweghị osisi ọma na-amị mkpụrụ rere ure, o nweghịkwa osisi ọ bụla rere ure na-amị mkpụrụ ọma.+ 44  N’ihi na a na-eji mkpụrụ osisi amata osisi ọ bụla.+ Dị ka ihe atụ, ndị mmadụ anaghị aghọta mkpụrụ fig n’ogwu, ha anaghịkwa aghọta mkpụrụ vaịn n’osisi ogwu. 45  Ezigbo mmadụ na-esi n’ezigbo akụ̀ dị n’obi ya ewepụta ihe ọma, ma ajọ mmadụ na-esi n’ajọ akụ̀ ya ewepụta ihe ọjọọ. N’ihi na ọ bụ ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.+ 46  “Gịnịzi mere unu ji akpọ m ‘Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,’ ma unu anaghị eme ihe m na-ekwu?+ 47  Onye ọ bụla nke na-abịakwute m ma na-anụ okwu m, na-emekwa ha, m ga-agwa unu onye o yiri.+ 48  O yiri onye chọrọ ịrụ ụlọ, nke gwuru ala gwumie ya egwumie, tọọkwa ntọala n’elu oké nkume. Mgbe e nwere idei mmiri, osimiri asọkwasịkwa ụlọ ahụ, ma o nweghị ike ime ka ọ maa jijiji n’ihi na a rụrụ ya nke ọma.+ 49  Ma, onye na-anụ ma ọ naghị eme ya eme+ yiri onye rụrụ ụlọ n’elu ala n’atọghị ntọala. Osimiri sọkwasịrị ya, ụlọ ahụ wee dakpọọ ozugbo, laakwa n’iyi.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “mkpụrụ obi.”
Na Grik, “ndị mmụọ na-adịghị ọcha.”
Ya bụ, n’anaghị ọmụrụ nwa.
Ma ọ bụ “Na-atọhapụnụ.”
Ma ọ bụ “a ga-atọhapụkwa.”
Ma ọ bụ “Onye na-eso ụzọ.”