Ozi Ọma Luk Dere 24:1-53

  • Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ (1-12)

  • Mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-aga Emeọs (13-35)

  • Jizọs pụtara n’ihu ndị na-eso ụzọ ya (36-49)

  • Chineke kpọọrọ Jizọs laa eluigwe (50-53)

24  Ma, n’ụbọchị mbụ n’izu,* ụmụ nwaanyị ahụ ji ihe na-esi ísì ọma ha kwadebere+ gaa n’ili* ahụ n’isi isi ụtụtụ.  Ma ha hụrụ na a kwapụla nkume e ji mechie ili* ahụ.+  Mgbe ha banyere, ha ahụghị ozu Onyenwe anyị Jizọs.+  Ka ihe a nọ na-eju ha anya, ụmụ nwoke abụọ ndị yi uwe na-enwu gbaa bịara guzo n’akụkụ ha.  Ụjọ jidere ụmụ nwaanyị ahụ, ha ekpudo ihu n’ala. Ụmụ nwoke ahụ asị ha: “Gịnị mere unu ji gaa n’ili na-achọ onye dị ndụ?+  Ọ nọghị ebe a, kama a kpọlitela ya. Chetanụ ihe ọ gwara unu mgbe ọ ka nọ na Galili.  O kwuru na a ga-enyefe Nwa nke mmadụ n’aka ndị mmehie, nakwa na a ga-egbu ya n’elu osisi. Ma ọ ga-ebili n’ụbọchị nke atọ.”+  Ha wee cheta ihe ndị o kwuru,+  si n’ili* ahụ laghachi ma kọọrọ ndịozi iri na otu ahụ na ndị ọzọ niile ihe ndị a niile.+ 10  Ụmụ nwaanyị ndị ahụ bụ Meri Magdalin, Joana, na Meri nne Jems. Ụmụ nwaanyị ndị ọzọ ndị so ha nọkwa na-akọrọ ndịozi ihe ndị a. 11  Ma, ha ekwetaghị ihe ụmụ nwaanyị ahụ kwuru. Ọ dara ha ka okwu na-enweghị isi. 12  Ma Pita biliri, gbara ọsọ gaa n’ili* ahụ. Mgbe o hulatara lee anya, ọ hụrụ naanị ákwà e ji kechie ozu Jizọs. N’ihi ya, ọ pụwara, na-atụgharị uche n’ihe ahụ merenụ. 13  Ma n’ụbọchị ahụ, mmadụ abụọ n’ime ndị na-eso ụzọ Jizọs nọ na-aga otu obodo a na-akpọ Emeọs, nke dị ihe dị ka kilomita iri na otu* ma e si Jeruselem gawa ya. 14  Ha nọ na-ekwurịta banyere ihe ndị a niile merenụ. 15  Ma ka ha na-akparịta ihe ndị a, Jizọs bịara ha nso wee soro ha na-aga. 16  Ma, ha amataghị onye ọ bụ.+ 17  O wee sị ha: “Gịnị ka unu na-akpa gbasara ya?” Ha wee kwụsị, gbarụọ ihu. 18  Onye nke aha ya bụ Kliopas asị ya: “Ị̀ bụ onye ọbịa na Jeruselem nke mere na ị maghị ihe ndị mere na ya n’oge a?”* 19  Ya ajụọ ha, sị: “Ihe ndị dị ka gịnị?” Ha asị ya: “Ihe ndị gbasara Jizọs onye Nazaret.+ Ọ bụ onye amụma. Okwu ya na ọrụ ebube ndị ọ rụrụ masịkwara Chineke na mmadụ niile.+ 20  Ndị isi nchụàjà na ndị na-achị anyị nyefere ya ka e gbuo ya.+ Ha kpọgidekwara ya n’osisi. 21  Ma anyị nọ na-atụ anya na nwoke a ga-anapụta Izrel.+ E wezụgakwa ihe ndị a, nke a bụ ụbọchị nke atọ kemgbe ihe ndị a mere. 22  Ihe ụmụ nwaanyị ụfọdụ, bụ́kwa ndị na-eso ụzọ Jizọs, kọọrọ anyị juru anyị anya, n’ihi na ha gara n’ili* ya n’isi ụtụtụ,+ 23  ma ha ahụghị ozu ya. Ha bịakwara na-ekwu na ha hụrụ ihe dị ebube, ya bụ, ndị mmụọ ozi, ndị sịrị na ọ dị ndụ. 24  Ụfọdụ n’ime ndị anyị na ha nọ gakwara n’ili* ahụ,+ hụkwa na ọ tọgbọ chakoo otú ụmụ nwaanyị ahụ kwuru. Ha ahụghị ozu Jizọs.” 25  N’ihi ya, ọ sịrị ha: “Unu ndị na-amaghị ihe, ndị obi ha kpọchikwara akpọchi, gịnị mere unu ekwereghị ihe niile ndị amụma kwuru? 26  Ọ̀ bụ na ihe ndị a ekwesịghị ime Kraịst,+ ka e nwee ike ime ka ọ dị ebube?”+ 27  Ọ kọwaara ha ihe ndị e dere n’Akwụkwọ Nsọ gbasara onwe ya, malite n’ihe Mosis dere ruo n’Akwụkwọ Ndị Amụma niile.+ 28  N’ikpeazụ, ha rutere nso n’obodo ahụ ha na-aga, o wee mee ka à ga-asị na ọ ka na-agakwu n’ihu. 29  Ma ha gwasiri ya ike ka ọ nọrọ. Ha sịrị ya: “Ka anyị na gị nọrọ, n’ihi na chi ejiwela.” O wee banye n’ụlọ ha ka ya na ha nọrọ. 30  Mgbe ya na ha nọ na-eri nri, o weere ogbe achịcha, gọzie ya, nyawaa ya, ma malite inye ha ya.+ 31  Mgbe ahụ ka ha matara onye ọ bụ. Ma, ọ pụrụ n’anya ha ozugbo.+ 32  Ha agwa ibe ha, sị: “Ka a sịkwa ihe mere okwu ya ji ruo anyị nnọọ n’obi mgbe ọ nọ na-agwa anyị okwu n’ụzọ, na-akọwakwara anyị Akwụkwọ Nsọ nke ọma.” 33  Ha biliri mgbe ahụ ma laghachi Jeruselem. Ha hụkwara ndịozi iri na otu ahụ na ndị ọzọ na-eso ụzọ Jizọs ha na ha zukọrọ. 34  Ndị ahụ wee sị ha: “N’eziokwu, a kpọlitela Onyenwe anyị, ọ pụtakwara n’ihu Saịmọn.”+ 35  Hanwa kọkwara ihe ahụ mere n’ụzọ na otú ha si mata onye Jizọs bụ mgbe ọ nyawara ogbe achịcha.+ 36  Ka ha nọ na-ekwu ihe ndị a, Jizọs bịara guzoro ebe ha nọ, sị ha: “Udo dịrị unu.”+ 37  Ma obi mapụrụ ha, ezigbo ụjọ tụkwara ha n’ihi na ha chere na ọ bụ mmụọ ka ha na-ahụ. 38  O wee sị ha: “Gịnị mere unu ji na-atụ ụjọ? Gịnịkwa mere unu ji na-enwe obi abụọ? 39  Ọ bụ m. Leenụ aka m na ụkwụ m. Metụnụ m aka ka unu chọpụta, n’ihi na mmụọ anaghị enwe anụ ahụ́ na ọkpụkpụ dị ka unu na-ahụ na m nwere.” 40  Mgbe o kwuru ihe a, o gosiri ha aka ya na ụkwụ ya. 41  Ma ha ekwetaghị n’ihi ọṅụ juru ha obi na otú ihe a si ju ha anya. Ọ sịziri ha: “Ùnu nwere ihe oriri ebe a?” 42  Ha wee nye ya otu ntakịrị azụ̀ a mịrị amị. 43  O wee nara ya, nọrọkwa n’ihu ha taa ya. 44  Ọ gwaziri ha, sị: “Ihe ndị a ka m gwara unu mgbe mụ na unu ka nọ,+ na ihe niile e dere gbasara m n’Iwu Mosis, n’Akwụkwọ Ndị Amụma, nakwa n’Abụ Ọma ga-emezurịrị.”+ 45  O nyeziiri ha aka ha aghọta ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nke ọma.+ 46  Ọ sịkwara ha, “Akwụkwọ Nsọ sịrị: na Kraịst ga-ata ahụhụ ma si n’ọnwụ bilie n’ụbọchị nke atọ,+ 47  malitekwa na Jeruselem+ ruo ná mba niile,+ a ga-eji aha ya kwusaara ndị mmadụ na ha kwesịrị ichegharị ka a gbaghara ha mmehie ha.+ 48  Unu ga-agba àmà gbasara ihe ndị a.+ 49  M ga-ezitere unu ihe Nna m kwere ná nkwa. Ma, nọrọnụ n’obodo a ruo mgbe unu ga-enweta ike si n’elu.”+ 50  O duuru ha garuo Betani, chịlie aka ya elu ma gọzie ha. 51  Mgbe ọ gọzichara ha, ọ hapụrụ ha, Chineke akpọrọ ya laa eluigwe.+ 52  Ha wee kpọọrọ ya isiala ma ṅụrụ ezigbo ọṅụ laghachi Jeruselem.+ 53  Ha na-anọkwa n’ụlọ nsọ kwa ụbọchị na-eto Chineke.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a na-akpọ ụbọchị a ugbu a bụ Sọnde. Ọ bụ ya bụ ụbọchị mbụ n’izu ndị Juu.
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “ili ncheta.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ihe dị ka maịl 7. Na Grik, “stediọm 60.” Otu stediọm bụ mita 185 (amaụkwụ 606.95). Stediọm a abụghị ámá egwuregwu. Gụọ B14.
O nwere ike ịbụ, “Ọ̀ bụ naanị gị bụ onye ọbịa na Jeruselem nke mere na ị maghị ihe ndị mere na ya n’oge a?”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”
Ma ọ bụ “n’ili ncheta.”