Ozi Ọma Luk Dere 10:1-42

  • Jizọs zipụrụ mmadụ iri asaa (1-12)

  • Obodo ndị na-echegharịghị ga-ata ahụhụ (13-16)

  • Mmadụ iri asaa Jizọs zipụrụ lọtara (17-20)

  • Jizọs toro Nna ya maka ịhọrọ ndị na-enweghị ihe ha bụ (21-24)

  • Ihe atụ gbasara onye Sameria bụ́ ezigbo onye agbata obi (25-37)

  • Jizọs gara leta Meri na Mata (38-42)

10  Mgbe ihe ndị a mechara, Onyenwe anyị họpụtakwuru mmadụ iri asaa ma zipụ ha abụọ abụọ+ ka ha buru ya ụzọ gaa n’obodo ọ bụla na ebe ọ bụla ọ ga-aga.  O wee sị ha: “N’eziokwu, ihe a ga-ewe n’ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole. N’ihi ya, na-arịọnụ onye nwe ubi ahụ ka o zite ndị ọrụ n’ubi ya.+  Gaanụ. M na-eziga unu dị ka ụmụ atụrụ nọ ebe anụ ọhịa wolf nọ.+  Unu ewerela akpa ego ma ọ bụ obere akpa nri ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ.+ Unu ekelekwala onye ọ bụla* n’okporo ụzọ.  N’ụlọ ọ bụla unu bara, burunụ ụzọ sị: ‘Udo dịrị ụlọ a.’+  Ọ bụrụ na onye udo anọghị ebe ahụ, udo unu ga-alọghachikwute unu. Ma ọ bụrụ na onye udo nọ ebe ahụ, ọ ga-enwe udo unu sị ka o nwee.  N’ihi ya, nọrọnụ n’ụlọ ahụ,+ na-erinụ ihe, na-aṅụkwanụ ihe ha nyere unu,+ n’ihi na e kwesịrị ịkwụ onye ọrụ ụgwọ ọrụ ya.+ Unu esikwala n’ụlọ e nyere unu gaa biri n’ụlọ ọzọ.  “N’obodo ọ bụla unu bara, ha anabata unu, rienụ nri ha nyere unu,  gwọọkwanụ ndị na-arịa ọrịa ebe ahụ, sịkwanụ ha: ‘Alaeze Chineke adịla nso.’+ 10  Ma n’obodo ọ bụla unu bara ma ha anabataghị unu, gaanụ n’okporo ámá ya, sị: 11  ‘Anyị na-etichapụrụ unu ájá anyị zọọrọ n’obodo unu.+ Ma, burunụ n’uche na Alaeze Chineke adịla nso.’ 12  Ana m asị unu na ọ ga-adịrị Sọdọm mfe n’ụbọchị ahụ karịa obodo ahụ.+ 13  “Korezin na Betsaịda, unu ga-ata ezigbo ahụhụ, n’ihi na ọ bụrụ na ọ bụ na Taya na Saịdọn ka a rụrụ ọrụ ebube ndị a rụrụ n’ime unu, ha gaara echegharị kemgbe, yiri ákwà iru uju nọdụ ọdụ ná ntụ.+ 14  N’ihi ya, ọ ga-adịrị Taya na Saịdọn mfe n’Ụbọchị Ikpe karịa unu. 15  Gịnwa kwa, Kapaniọm, à ga-ebuli gị elu ruo eluigwe? Ị ga-agbadaru n’ili.* 16  “Onye ọ bụla na-ege unu ntị na-ege m ntị.+ Onye ọ bụla na-eleda unu anya na-eledakwa m. Onye ọ bụla na-eleda m anya na-eledakwa onye zitere m.”+ 17  Mmadụ iri asaa ahụ wee lọta, na-aṅụrị ọṅụ, na-asị: “Onyenwe anyị, anyị ji aha gị mee ka ndị mmụọ ọjọọ rubere anyị isi.”+ 18  O wee sị ha: “Ahụrụ m Setan ka ọ dara+ dị ka àmụ̀mà nke si n’eluigwe. 19  Enyela m unu ikike ịzọkwasị agwọ na akpị ụkwụ na imeri ike niile nke onye iro.+ E nweghịkwa ihe ga-emerụ unu ahụ́. 20  Ma, unu aṅụrịla ọṅụ maka na ndị mmụọ ọjọọ na-erubere unu isi, kama ṅụrịanụ ọṅụ maka na e deela aha unu n’eluigwe.”+ 21  N’oge ahụ, mmụọ nsọ mere ka ọṅụ ju Jizọs obi, ya asị: “Nna, Onyenwe eluigwe na ụwa, ana m eto gị n’ihu ọha n’ihi na i zochiiri ndị ma ihe na ndị ọkachamara+ ihe ndị a nke ọma ma mee ka ụmụaka mara ha. Nna, ọ bụ otú ị chọrọ ya.+ 22  Nna m enyefeela m ihe niile, o nweghịkwa onye ma m* ma e wezụga Nna m.+ O nweghịkwa onye ma Nna m ma e wezụga m na onye ọ bụla m chọrọ ịkụziri gbasara ya.”+ 23  O wee gwa ndị na-eso ụzọ ya mgbe naanị ya na ha nọ, sị: “Ndị na-ahụ ihe ndị unu na-ahụ na-enwe obi ụtọ.+ 24  N’ihi na ana m asị unu, ọtụtụ ndị amụma na ndị eze chọrọ ịhụ ihe ndị unu na-ahụ, ma ha ahụghị ha,+ ha chọkwara ịnụ ihe ndị unu na-anụ, ma ha anụghị ha.” 25  Ma, otu nwoke ma Iwu biliri ka ọ nwaa ya, wee sị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?”+ 26  Ya asị ya: “Gịnị ka e dere n’Iwu? Gịnị ka ị gụtara?” 27  Ya azaa, sị: “‘Jiri obi gị niile na mkpụrụ obi* gị niile na ike gị niile na uche gị niile hụ Jehova* bụ́ Chineke gị n’anya,+ hụkwa ‘onye agbata obi gị n’anya otú ị hụrụ onwe gị.’”+ 28  O wee sị ya: “Ị zatara ya. Na-eme ya, ị ga-enwetakwa ndụ ebighị ebi.”+ 29  Ma, ebe nwoke ahụ chọrọ igosi na ya bụ onye ezi omume,+ ọ sịrị Jizọs: “Ònye n’eziokwu bụ onye agbata obi m?” 30  Jizọs asị: “Otu nwoke si Jeruselem na-agbada Jeriko ma daba n’aka ndị ohi. Ha agbaa ya ọtọ, kụọkwa ya ihe, wee pụọ, hapụ ya ọdị ndụ ọnwụ ka mma. 31  Ma ọ dabara na otu onye nchụàjà nọ na-agbada n’okporo ụzọ ahụ. Ma mgbe ọ hụrụ ya, ya esi n’akụkụ nke ọzọ gafere. 32  Mgbe onye Livaị rutekwara ebe ahụ hụ ya, ya esi n’akụkụ nke ọzọ gafere. 33  Ma otu onye Sameria+ nke si n’ụzọ ahụ na-agafe rutere ebe ọ nọ. Mgbe ọ hụrụ ya, ya emetere ya ebere. 34  N’ihi ya, ọ gakwuuru ya wee kechie ọnyá ndị dị ya n’ahụ́, wụkwasị ha mmanụ na mmanya. O wee kukwasị ya n’elu anụmanụ ya ma bute ya n’ụlọ ndị njem wee lekọta ya. 35  N’echi ya, o wepụtara mkpụrụ ego dinarịọs* abụọ, nye onye na-elekọta ụlọ ndị njem ahụ, sị ya: ‘Lekọtawa ya. M ga-akwụ gị ihe ọ bụla i mefuru n’elu nke a mgbe m ga-abịaghachi ebe a.’ 36  Ònye n’ime mmadụ atọ a ka i chere gosiri na ọ bụ onye agbata obi+ nwoke ahụ dabara n’aka ndị ohi?” 37  O wee sị ya: “Ọ bụ onye nke meteere ya ebere.”+ Jizọs asịzie ya: “Gawa, na-emekwa otú ahụ.”+ 38  Ma ka ha nọ na-aga, ọ banyere n’otu obodo. N’ebe a, otu nwaanyị aha ya bụ Mata+ nabatara ya n’ụlọ ya. 39  Nwaanyị a nwekwara nwanne nwaanyị. Aha ya bụ Meri. Ọ nọdụrụ ala n’akụkụ ụkwụ Onyenwe anyị ma na-ege ntị n’ihe ọ na-ekwu. 40  Ma ọtụtụ ihe Mata nọ na-eme mere ka ọ ghara ige ntị n’ihe Jizọs na-ekwu. N’ihi ya, ọ gakwuuru Jizọs wee sị ya: “Onyenwe anyị, ọ̀ bụ na ị hụghị na nwanne m nwaanyị hapụụrụ naanị m ihe niile ka m mewe? Gwa ya ka ọ bịa nyere m aka.” 41  Onyenwe anyị asị ya: “Mata, Mata, ị na-echegbu onwe gị, na-esogbukwa onwe gị n’ihi ọtụtụ ihe. 42  Ma, ọtụtụ ihe adịghị anyị mkpa. Otu ihe ezuola. Meri họọrọ ihe ka mma,+ a gaghịkwa anapụ ya nke ahụ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “amakụkwala onye ọ bụla mgbe unu na-ekele ya.”
Ma ọ bụ “na Hedis.” Gụọ Nkọwa Okwu.
Na Grik, “Ọkpara ahụ.”
Gụọ A5.
Gụọ B14.