Joel 2:1-32

  • Ụbọchị Jehova na ìgwè ndị agha ya (1-11)

  • Jehova gwara ndị ya ka ha lọghachikwute ya (12-17)

    • “Dọwaanụ obi unu” (13)

  • Ihe Jehova zara ndị ya (18-32)

    • ‘M ga-awụkwasị mmụọ m n’ahụ́ mmadụ’ (28)

    • Ihe ebube n’eluigwe na n’ụwa (30)

    • A ga-azọpụta ndị na-akpọku aha Jehova (32)

2  “Fụọnụ opi na Zayọn.+ Tienụ mkpu agha n’ugwu nsọ m. Ka ndị niile bi n’ala a* maa jijijiMaka na ụbọchị Jehova na-abịa.+ Ọ dị nso.   Ọ bụ ụbọchị ọchịchịrị na itiri,+Ụbọchị ígwé ojii na oké ọchịchịrị.+ Ọ dị ka ìhè nke na-enwu n’ugwu mgbe chi na-abọ. E nwere mba nke ndị ya dị ọtụtụ ma dị ike.+ E nwetụbeghị mba dị ka ya,E nweghịkwa mgbe a ga-enwe ọzọ dị ka yaN’afọ niile nke ọgbọ niile.   Ọkụ na-erepịa ihe niile dị n’ihu ya,Ire ọkụ na-erepịakwa ihe niile dị n’azụ ya.+ Ala dị n’ihu ya dị ka ogige Iden,+Ma ihe dị n’azụ ya bụ ala ịkpa nke a na-enweghị ihe dị na ya,E nweghịkwa ihe na-afọ ndụ.   Ọ dị ka ịnyịnya,Ha na-agbakwa ọsọ ka ịnyịnya agha.+   Mkpọtụ ha na-eme mgbe ha na-awụgharị n’elu ugwu dị ka nke ụgbọ ịnyịnya.+ Ọ dị ka mkpọtụ ọkụ nke na-erepịa ahịhịa ọka. Ọ dị ka mba dị ike, nke a haziri ahazi maka ịlụ agha.+   Ndị mmadụ ga-ahụsi anya n’ihi ha. Ihu niile ga-achagharị.   Ha na-ebu agha ka ndị dike. Ha na-arịfere mgbidi ka ndị agha. Onye nke ọ bụla na-anọ n’ebe o kwesịrị ịnọ,Ha anaghịkwa ahapụ ụzọ ha.   Ha anaghị enupụ ibe ha. Onye nke ọ bụla na-aga n’ebe o kwesịrị ịga. Ọ bụrụgodị na akụ́* atụta ụfọdụ, ha adaa,Ndị nke ọzọ anaghị akwụsị ịga ebe ha na-aga.   Ha ji ọsọ abanye n’ime obodo. Ha na-agba ọsọ ná mgbidi. Ha na-arịgo n’elu ụlọ. Ha na-esi na windo abanye ka ndị ohi. 10  Ha bịawa, ala na-ama jijiji, eluigwe na-amakwa jijiji. Anyanwụ na ọnwa agbaala ọchịchịrị.+ Kpakpando anaghịzi enye ìhè ha. 11  Jehova ga-ekwu okwu n’ihu ndị agha ya+ n’ihi na ndị agha ya dị nnọọ ọtụtụ.+ N’ihi na Chineke na-emezu ihe o kwuru, ọ dịkwa ike;* N’ihi na ụbọchị Jehova bụ ụbọchị ukwu, ndị mmadụ ga-atụkwa egwu n’ụbọchị ahụ.+ Ònye ga-edili ya?”+ 12  Ihe a bụ ihe Jehova kwuru: “Ma ugbu a, jirinụ obi unu niile+Lọghachikwute m. Buonụ ọnụ,+ beenụ ákwá, beekwanụ ákwá arịrị. 13  Dọwaanụ obi unu,+ ọ bụghị uwe unu.+ Lọghachikwutenụ Jehova bụ́ Chineke unu,N’ihi na o nwere ọmịiko,* na-emekwa ebere. Ọ naghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ ịhụnanya ya dịkwa ukwuu.+ Ọ ga-agbanwe obi ya, hapụzie iweta ọdachi ahụ.* 14  Ònye manụ ma ọdachi ahụ ọ̀ ga-ewute ya, ya agbanwee obi ya+ Ma gọzie unu,Ka unu wee chụọrọ Jehova bụ́ Chineke unu àjà ọka na àjà mmanya? 15  Fụọnụ opi na Zayọn. Kwuonụ ka e buo ọnụ. Maanụ ọkwa ka e nwee nzukọ pụrụ iche.+ 16  Kpọkọtanụ mmadụ niile. Doonụ ọgbakọ ahụ nsọ.+ Kpọkọtanụ ndị agadi.* Kpọkọtanụ ụmụaka na ụmụ na-aṅụ ara.+ Ka nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ si n’ọnụ ụlọ ya dị n’ime pụta, ka nwaanyị a lụrụ ọhụrụ sikwa n’ọnụ ụlọ ya pụta. 17  Ka ndị nchụàjà, bụ́ ndị na-ejere Jehova ozi, bee ákwáN’agbata ebe e si abanye n’ụlọ nsọ na ebe ịchụàjà+ ma sị: ‘Jehova, meere ndị gị ebere. Emela ka ndị i ketara bụrụ ihe e ji eme ihe ọchị. Ekwela ka ndị mba ọzọ chịwa ha. Gịnị mere ndị mmadụ ga-eji kwuo, sị: “Ebee ka Chineke ha nọ?”’+ 18  Jehova ga-anụrụ ala ya ọkụ n’obi,Ọ ga-emetekwara ndị ya ebere.*+ 19  Jehova ga-aza ndị ya, sị ha: ‘Lee, ana m ezitere unu ọka* na mmanya ọhụrụ na mmanụ,Unu ga-erijukwa afọ.+ Agaghịzi m eme ka mba dị iche iche kparịa unu.+ 20  M ga-achụpụ ndị si n’ebe ugwu ka ha nọrọ n’ebe dị anya n’ebe ị nọ;M ga-achụsasị ha, chụga ha n’ala kpọrọ nkụ ọ na-enweghị ihe dị na ya,Chụga ndị nọ n’ihu* n’oké osimiri dị n’ebe ọwụwa anyanwụ*Ma chụga ndị nọ n’azụ n’oké osimiri dị n’ebe ọdịda anyanwụ.* Ísì ọjọọ ha ga-esi n’ala ahụ. Ísì ha nke jọgburu onwe ya ga na-esi n’ala ahụ,+N’ihi na Chineke ga-eme oké ihe.’ 21  Ala, atụla egwu. Nwee obi ụtọ, ṅụrịakwa ọṅụ n’ihi na Jehova ga-eme oké ihe. 22  Anụ ọhịa, atụla egwu,N’ihi na ahịhịa ndụ ga-eju n’ebe anụmanụ na-ata ahịhịa n’ala ịkpa,+Osisi ga-amịkwa mkpụrụ.+ Osisi fig na osisi vaịn ga-amịzucha mkpụrụ ha.+ 23  Unu ụmụ Zayọn, nweenụ obi ụtọ, ṅụrịakwanụ ọṅụ n’ihi ihe Jehova bụ́ Chineke unu ga-eme;+N’ihi na ọ ga-eme ka ụbịa mmiri zooro unu otú o kwesịrị,Ọ ga-emekwa ka oké mmiri ozuzo zooro unu,Ma ụbịa mmiri ma ụla mmiri, otú ha na-ezobu.+ 24  Ezigbo ọka* ga-eju n’ebe a na-azọcha ọka, Mmanya ọhụrụ na mmanụ ga-ejukwa n’ebe a na-azọchapụta mmanya.+ 25  M ga-enyeghachi unu ihe ndị funahụrụ unu n’afọ ndị ahụIgurube ndị na-abịa n’ìgwè richapụrụ ihe unu, ha na igurube ndị na-enweghị nku, igurube ndị na-erichapụ ihe ọ bụla ha hụrụ nakwa igurube ndị na-eri ihe ọsọ ọsọ,Bụ́ ìgwè ndị agha m m zitere ka ha mesie unu ike.+ 26  N’eziokwu, unu ga-eri ihe, rijuo afọ.+ Unu ga-etokwa aha Jehova bụ́ Chineke unu,+Onye meere unu ihe ndị dị ebube. A gaghị eme ka ihere mee ndị m ọzọ.+ 27  Unu ga-amarakwa na m nọnyeere Izrel*+Nakwa na m bụ Jehova bụ́ Chineke unu,+ e nweghị Chineke ọzọ. A gaghị eme ka ihere mee ndị m ọzọ. 28  Mgbe e mechara, m ga-awụkwasị mmụọ m+ n’ahụ́ ụdị mmadụ ọ bụla. Ụmụ unu ndị nwoke na ụmụ unu ndị nwaanyị ga-ebukwa amụma,Ndị agadi nwoke unu ga-arọ nrọ,Ụmụ okorobịa unu ga-ahụkwa ọhụụ.+ 29  N’oge ahụ, m ga-awụkwasịkwa mmụọ mN’ahụ́ ndị ohu m ndị nwoke nakwa n’ahụ́ ndị ohu m ndị nwaanyị. 30  M ga-emekwa ihe ndị dị ịtụnanya* n’eluigwe na n’ụwa,Meekwa ka e nwee ọbara na ọkụ na ogidi anwụrụ ọkụ.+ 31  A ga-eme ka anyanwụ ghọọ ọchịchịrị, meekwa ka ọnwa ghọọ ọbara+Tupu oké ụbọchị Jehova, bụ́ ụbọchị dị egwu, abịa.+ 32  A ga-azọpụta onye ọ bụla na-akpọku aha Jehova.+ N’ihi na a ga-enwe ndị a ga-echebe n’Ugwu Zayọn nakwa na Jeruselem,+ otú Jehova kwuru,Bụ́ ndị lanahụrụnụ, ndị Jehova na-akpọ.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “n’ụwa.”
Ma ọ bụ “ngwá ọgụ.”
O nwere ike ịbụ, “N’ihi na onye na-emezu okwu Chineke dị ike.”
“Ma ọ bụ “ọ na-eme amara.”
Ma ọ bụ “Ọdachi ahụ ga-ewute ya.”
Ma ọ bụ “ndị okenye.”
Ma ọ bụ “ga-enwekwara ndị ya ọmịiko.”
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Na Hibru, “Chụga ihu ya.”
Ya bụ, Oké Osimiri Nnu.
Ya bụ, Oké Osimiri Mediterenian.
Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ma ọ bụ “m nọ n’etiti Izrel.”
Ma ọ bụ “ihe àmà.”