Job 33:1-33

  • Elaịhu baara Job mba maka na ọ na-ekwu na ya bụ onye ezi omume (1-33)

    • A hụrụ ihe mgbapụta (24)

    • Ka o nweghachi ike okorobịa (25)

33  “Ma ugbu a, Job, biko nụrụ okwu m. Gee ntị n’ihe niile m na-ekwu.   Biko, m ga-emegherịrị ọnụ m. Ire m* ga-ekwurịrị okwu.   Ihe m na-ekwu na-egosi na obi m dị ọcha,+Eji m obi ọcha na-ekwu ihe m ma.   Ọ bụ mmụọ Chineke kere m,+Ọ bụkwa ume Onye Pụrụ Ime Ihe Niile kupụtara mere ka m dị ndụ.+   Saa m okwu ma ọ bụrụ na i nwere ike. Kwuo ihe ndị ị chọrọ ikwu n’ihu m. Jikere ịzara ọnụ gị.   Mụ na gị bụ otu ihe n’anya ezi Chineke. Ọ bụkwa ájá ka e ji kpụọ m.+   N’ihi ya, i kwesịghị ịtụ m ụjọ,Ihe m na-ekwu ekwesịghịkwa ime ka ike gwụ gị.   Ma e nwere ihe i kwuru ná ntị m. N’eziokwu, m nọ na-anụ ka ị na-asị,   ‘Abụ m onye ezi omume. Anaghị m eme mmehie.+ Aka m dị ọcha. Anaghị m eme ihe ọjọọ.+ 10  Ma Chineke na-achọ ihe ọ ga-akụdo aka mesie m ike. O weere m ka onye iro ya.+ 11  Ọ na-etinye ụkwụ m n’ọtọsị. Ọ na-enyocha ụzọ m niile.’+ 12  Ma i kwuteghị ihe a i kwuru. Ọ bụ ya mere m ga-eji saa gị okwu: Chineke karịrị nnọọ mmadụ efu.+ 13  Gịnị mere i ji ekwu na ihe o mere adịghị mma?+ Ọ̀ bụ maka na ọ saghị gị ihe niile i kwuru?+ 14  N’ihi na Chineke na-ekwu okwu ugboro ugboro.* Ma e nweghị onye na-ege ya ntị. 15  Ná nrọ, n’ọhụụ a na-ahụ n’abalị,+Mgbe oké ụra ji ndị mmadụ,Mgbe ha na-ehi ụra n’àkwà* ha. 16  Ọ bụ mgbe ahụ ka ọ na-emeghe ntị ha,+Mee ka ndụmọdụ ya ruo ha n’obi, 17  Iji mee ka mmadụ hapụ omume ọjọọ,+Meekwa ka ọ kwụsị ịdị mpako.+ 18  Chineke na-azọ ya ndụ* ka ọ ghara ịbanye n’olulu,*+Ka a ghara iji mma agha* laa ndụ ya n’iyi. 19  Mmadụ na-amụtakwa ihe mgbe o dina n’àkwà* ya, ahụ́ ana-egbu ya mgbu,Nakwa mgbe ọkpụkpụ na-afụ ya ụfụ n’akwụsịghị akwụsị, 20  Nke mere na ọ* na-asọ nri oyi. Ọ naghịdị* ekwe eri nri dị mma.+ 21  Ọ taala ahụ́. A na-ahụzi ọkpụkpụ ya niile anya. 22  Ọ* na-abịa olulu* nso. Ọ ga-adaba n’aka ndị na-egbu mmadụ. 23  Ọ bụrụ na e nwere otu onye ozi* n’ime otu puku ndị oziNke ga-ekwuchite ọnụ ya,Bụ́ onye ga-agwa mmadụ ihe dị mma ọ ga-eme, 24  Mgbe ahụ, Chineke ga-emere ya amara, sị,‘Napụta ya ka ọ ghara ịbanye n’olulu.*+ Ahụla m ihe mgbapụta.+ 25  Ka ahụ́ ya dị ọhụrụ* karịa otú ọ dị mgbe ọ bụ nwata.+ Ka o nweghachi ike o nwere mgbe ọ bụ okorobịa.’+ 26  Ọ ga-arịọsi Chineke arịrịọ ike.+ Chineke ga-emere ya amara. Ọ ga-eti mkpu ọṅụ mgbe ọ ga-ahụ ihu Chineke. Chineke ga-emekwa ka mmadụ efu bụrụghachi onye ezi omume n’anya ya. 27  Onye ahụ ga-agwa ndị mmadụ,* sị,‘M mehiela.+ M meela ihe na-adịghị mma. Ma, a taghị m ahụhụ e kwesịrị ịta m.* 28  Ọ napụtala mkpụrụ obi* m ka m ghara ịbanye n’olulu.*+ M ka ga-anọ ndụ na-ahụ ìhè.’ 29  N’eziokwu, Chineke na-emere mmadụ ihe niile aUgboro ugboro,* 30  Ka o si n’olulu* kpọghachi ya,*Ka ìhè nke ndụ wee nwuoro ya.+ 31  Ṅaa ntị, Job. Gee m ntị. Gba nkịtị ka m gwakwuo gị okwu. 32  Ọ bụrụ na e nwere ihe ị ga-asa m, saa m ya. Kwuo okwu, n’ihi na achọrọ m igosi na aka gị dị ọcha. 33  Ọ bụrụ na e nweghị ihe ị ga-ekwu, i kwesịrị ige m ntị. Gba nkịtị. M ga-akụziri gị amamihe.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Ire m na okpo ọnụ m.”
Na Hibru, “otu ugboro nakwa ugboro abụọ.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “mkpụrụ obi ya.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “ngwá ọgụ.”
Ma ọ bụ “n’ihe ndina.”
Na Hibru, “ndụ ya.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya anaghịdị.”
Ma ọ bụ “Mkpụrụ obi ya; Ndụ ya.”
Ma ọ bụ “ili.”
Ma ọ bụ “mmụọ ozi.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “Ka ahụ́ gbasie ya ike.”
Na Hibru, “ga-abụrụ ndị mmadụ abụ.”
O nwere ike ịbụ, “Ma ọ baraghị m uru.”
Ma ọ bụ “ndụ.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Na Hibru, “Ugboro abụọ, ugboro atọ.”
Ma ọ bụ “n’ili.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”