Job 30:1-31

  • Job kwuru otú ihe si gbanweere ya (1-31)

    • O kwuru na ndị na-abaghị uru na-akwazi ya emo (1-15)

    • Ọ dị ya ka Chineke anaghị enyere ya aka (20, 21)

    • “Akpụkpọ ahụ́ m na-ejizi oji” (30)

30  “Ugbu a, ndị m tọrọ atọNa-achị m ọchị,+Ndị m na-agaraghị ekwe ka nna haNa nkịta ndị na-eche ìgwè ewu na atụrụ m nche nọrọ.   Olee uru ike ha nwere baara m? Ike ha alaala n’iyi.   Agụụ na ụkọ nri emeela ka ha gharazie inwe ume. Ha na-ata ájá dị n’ala kpọrọ nkụ,Nke a lara n’iyi, mebisiekwa.   Ha na-aga n’ọhịa akụrụ ahịhịa na-atọ nnu nnu. Nri ha bụ mgbọrọgwụ osisi brum.*   A na-achụpụ ha n’obodo.+ Ndị mmadụ na-eti mkpu na-eso ha n’azụ otú e si eme onye ohi.   Ha na-ebi ná mkpọda ndagwurugwu,N’oghere ndị dị n’ala nakwa na nkume.   Ha na-anọ n’ọhịa na-eti mkpu,Ha ga-agbakọtakwa n’ebe e nwere ahịhịa akụwa.*   Ebe ha bụ ụmụ ndị nzuzu na ụmụ ndị na-enweghị aha, A chụpụla ha n’obodo.*   Ma ugbu a, ha na-akwadị m emo ma ha gụwa egwú.+ Abụzi m onye ha ji eme ihe ọchị.*+ 10  Ha kpọrọ m asị, ha anaghịkwa abịa m nso.+ Ha anaghị atụ ụjọ ịgbụ m asọ mmiri n’ihu.+ 11  E nweghị ihe ha na-anaghị eme n’ihu m,N’ihi na Chineke emeela ka ike gwụ m, wedakwa m ala. 12  Ha na-ebili ka ìgwè mmadụ n’aka nri m. Ha chụrụ m ọsọ,Rụchiekwa ihe n’ụzọ m si aga ka ha laa m n’iyi. 13  Ha emebisịala ụzọ m si agaMa mee ka nsogbu m na-akakwu njọ.+ E nweghị onye na-akwụsị ha.* 14  Ha na-abịa ka à ga-asị na ha si ná nnukwu oghere dị ná mgbidi abata. Ha nukọọrọ na-abata n’ebe e bibiri ebibi. 15  Ụjọ zuru m ahụ́. Ùgwù m alaala ka uzuzu ifufe bufuru ebufu. Enweghịzi m olileanya na a ga-azọpụta m. 16  Ugbu a, m na-anwụzi anwụ.+ M na-ata ahụhụ kwa ụbọchị.+ 17  N’abalị, ọkpụkpụ m na-afụgbu m afụgbu.+ Ahụ́ na-egbusi m mgbu ike. Ọ naghị akwụsị akwụsị.+ 18  A na-eji nnukwu ike ahịkọ uwe m yi.* Ọ na-atọchi m olu otú olu uwe si atọchi mmadụ olu. 19  Chineke atụbala m n’apịtị. Abụzi m naanị ájá na ntụ. 20  M na-ebesara gị ákwá ka i nyere m aka, ma ị naghị aza m.+ M na-ebili ọtọ, ma naanị ihe ị na-eme bụ ile m anya. 21  I ji obi ọjọọ emesi m ike.+ I ji ike gị niile alụso m ọgụ. 22  I ji ifufe bulite m bufuo,Jirizie oké ifufe na-ebugharị m. 23  N’ihi na ama m na ị ga-eme ka m nwụọ,Ka m gaa n’ụlọ ebe onye ọ bụla dị ndụ ga-emecha gaa. 24  Ma e nweghị onye ga-akụ nwoke ike ụwa gwụrụ ihe+Mgbe ọ na-ebe ákwá ka e nyere ya aka n’oge ọ nọ ná nsogbu. 25  Ọ̀ bụ na ebereghị m ndị ihe siiri ike ákwá? Ọ̀ bụ na erughịrị m* ndị ogbenye uju?+ 26  M tụrụ anya ihe ọma, ma ọ bụ ihe ọjọọ bịara. M tụrụ anya ìhè, ma ọ bụ ọchịchịrị bịara. 27  Obi ezughị m ike. Nsogbu na-abịara m ụbọchị niile. 28  M na-agagharị, ma obi adịghị m mma.+ Anaghị m ahụ ìhè anyanwụ. N’ebe ndị mmadụ zukọrọ, m na-ebili bee ákwá ka e nyere m aka. 29  Abụrụla m nwanne nkịta ọhịa,Bụrụkwa enyi ụmụ enyí nnụnụ.+ 30  Akpụkpọ ahụ́ m na-ejizi oji, na-erekapụsịkwa.+ Okpomọkụ* emeela ka ọkpụkpụ m na-ere ọkụ. 31  Ọ bụ naanị abụ iru uju ka e ji ụbọ akwara m abụ,Ọ bụkwa naanị ndị na-ebe ákwá ka a na-afụrụ ọjà m.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Osisi a na-adị n’ọzara.
Ma ọ bụ “ahịhịa ogwu.”
Na Hibru, “A pịara ha ihe pịapụ ha n’obodo.”
Na Hibru, “ji atụ ilu.”
O nwere ike ịbụ, “E nweghị onye na-enyere ha aka.”
O nwere ike ịbụ, “Nnukwu ahụhụ m na-ata agbanweela otú ahụ́ m dị.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi m erughịrị.”
O nwere ike ịbụ, “Ahụ́ ọkụ.”