Jeremaya 44:1-30

  • Jeremaya kwuru na ọdachi ga-adakwasị ndị Juu gara Ijipt (1-14)

  • Ndị Juu ekwetaghị ihe Chineke gwara ha (15-30)

    • Ndị Juu nọ na-efe “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” (17-19)

44  E nwere ihe Jeremaya kwuru gbasara ndị Juu niile bi n’Ijipt,+ ya bụ, gbasara ndị bi na Migdọl,+ Tapanhis,+ Nọf*+ nakwa Patrọs.+ Ọ sịrị:  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Unu ahụlanụ ọdachi niile m mere ka ọ dakwasị Jeruselem+ na obodo niile dị na Juda. Unu ahụla taa na a laala ha n’iyi. E nweghịkwa onye bi na ha.+  M mere ha ihe a n’ihi ihe ọjọọ ndị ha mere, nke kpasuru m iwe. Ha gara na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà,+ na-efekwa ha ofufe. Ha amaghị chi ndị ahụ. Unu na nna nna unu hà amaghịkwa ha.+  M nọ na-ezitere unu ndị ohu m niile bụ́ ndị amụma. M nọ na-ezite ha ugboro ugboro,* na-asị: “Biko, unu akpala ụdị arụ a m kpọrọ asị.”+  Ma, ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala. Ha ahapụghị ihe ọjọọ ha na-eme. Ha akwụsịghịkwa ịchụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà.+  M wee jiri iwe na ọnụma mee obodo ndị dị na Juda nakwa okporo ámá ndị dị na Jeruselem ihe, na-atakwa ha ahụhụ ruo mgbe a lara ha n’iyi. Ha atọgbọrọkwa nkịtị otú ha dị taa.’+  “Ugbu a, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Gịnị mere unu ji na-akpatara onwe unu* nnukwu ọdachi nke ga-eme ka a laa onye ọ bụla nọ na Juda n’iyi, ma nwoke ma nwaanyị ma nwatakịrị ma nwa na-aṅụ ara, nke na e nweghịzi onye ga-afọrọ unu?  Gịnị mere unu ji achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà n’Ijipt, bụ́ ebe unu gara biri, si otú ahụ na-akpasu m iwe? A ga-ala unu n’iyi. Mba niile dị n’ụwa ga na-eji unu eme ihe ọchị, jirikwa unu na-abụ mmadụ ọnụ.+  Ùnu echefuola ihe ọjọọ nna nna unu hà mere na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, nakwa ihe ọjọọ ndị eze Juda+ na ndị nwunye ha+ mere ebe ahụ, nakwa nke ununwa na ndị nwunye unu+ mere ebe ahụ? 10  Kemgbe ahụ, unu* echegharịbeghị* ruo taa. Unu anaghị atụ egwu ime ihe ọjọọ.+ Unu anaghị edebe iwu m. Unu anaghịkwa eso ntụziaka m nyere unu na nna nna unu hà.’+ 11  “N’ihi ya, Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘M ga-eme ka ọdachi dakwasị unu, iji laa ndị Juda niile n’iyi. 12  M ga-eme ka ndị fọrọ na Juda, ndị siri ọnwụ na ha ga-aga biri n’Ijipt, laa n’iyi ebe ahụ.+ Mma agha na ụnwụ ga-egbu ha. Mma agha na ụnwụ ga-egbu malite n’onye kacha nta n’ime ha ruo n’onye kacha ukwuu. Ihe m ga-eme ha ga-eme ka ụjọ tụwa ndị ọzọ. A ga-eji ha na-abụ mmadụ ọnụ. A ga na-eleda ha anya, na-akwakwa ha emo.+ 13  M ga-eji mma agha na ụnwụ na ọrịa na-efe efe taa ndị bi n’Ijipt ahụhụ otú ahụ m tara ndị bi na Jeruselem.+ 14  Ihe a ga-emerịrị ndị ahụ fọrọ na Juda, bụ́ ndị gara biri n’Ijipt. Ha agaghịkwa adị ndụ laghachi Juda. Ọ ga-agụsi ha agụụ ike ka ha laghachi birikwa ebe ahụ, ma ha agaghị alaghachili. Ọ gwụla naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-alaghachi.’” 15  Ụmụ nwoke niile ndị ma na ndị nwunye ha na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà nakwa ụmụ nwaanyị niile a lụ alụ nọ ebe ahụ karịrị akarị. Ha na ndị niile bi n’Ijipt,+ ya bụ, na Patrọs,+ gwara Jeremaya, sị: 16  “Anyị agaghị ege ntị n’ihe ị gwara anyị n’aha Jehova. 17  Kama anyị ga-eme ihe niile anyị ji ọnụ anyị kwuo. Anyị ga na-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ+ otú anyị na nna nna anyị hà na ndị eze anyị na ndị isi anyị mere n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem. N’oge ahụ, anyị nọ na-eriju afọ. Ihe dịkwaara anyị mma. Anyị enweghịkwa nsogbu ọ bụla. 18  Ma, kemgbe anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ, ihe niile akọla anyị. Mma agha na ụnwụ na-egbukwa anyị.” 19  Ụmụ nwaanyị kwukwara, sị: “Ndị di anyị kwere ka anyị na-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ, na-emekwa keeki e ji achụrụ ya àjà. Anyị na-akpụ keeki ndị ahụ otú ha ga-eyi eze nwaanyị ahụ.” 20  Jeremaya gwaziri mmadụ niile okwu, ma ndị nwoke ma ndị nwunye ha ma ndị niile nọ na-agwa ya okwu. Ọ gwara ha, sị: 21  “Jehova chetara àjà dị iche iche unu na nna nna unu hà, ndị eze unu, ndị isi unu, na ndị ala unu nọ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem na-achụ.+ O chefughị ha. 22  N’ikpeazụ, ihe ọjọọ unu na-eme nakwa arụ unu na-akpa gwụrụ Jehova ike, nke mere e ji laa ala unu n’iyi, ya abụrụ ihe na-asọ oyi na ihe e ji abụ mmadụ ọnụ. E nweghịkwa onye bi na ya ruo taa.+ 23  Ọdachi a dakwasịrị unu taa n’ihi àjà ndị a unu chụrụ nakwa n’ihi otú unu si mehie Jehova, na-enupụrụ Jehova isi, ghara ịna-edebe iwu ya, gharakwa ịna-eso ntụziaka ya na ịna-eme ihe ndị ọ na-echetara unu.”+ 24  Jeremaya gwakwara ụmụ nwaanyị niile na mmadụ niile, sị: “Ndị Juda niile nọ n’Ijipt, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. 25  Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Unu na ndị nwunye unu kwere nkwa, mezuokwa ya. Unu sịrị: “Anyị ga-emezurịrị nkwa anyị kwere na anyị ga-achụrụ Eze Nwaanyị nke Eluigwe* àjà mmanya na àjà ndị ọzọ.”+ Unu na ndị nwunye unu ga-emezurịrị nkwa unu kwere.’ 26  “N’ihi ya, ndị Juda niile bi n’Ijipt, nụrụnụ ihe Jehova kwuru. Jehova kwuru, sị: ‘“M ji aha m dị ebube na-aṅụ iyi na e nweghị onye Juda ọ bụla+ ga-akpọ aha m ọzọ n’Ijipt niile ma ọ ṅụwa iyi, sị, ‘Eji m Ọkaakaa Onyenwe anyị, bụ́ Jehova dị ndụ, na-aṅụ iyi.’+ 27  Ugbu a, ekpebiela m ime ka ọdachi dakwasị ndị Juda niile fọdụrụ n’Ijipt, ọ bụghị imere ha ihe ọma.+ Mma agha na ụnwụ ga na-egbu ha, ruo mgbe ha nwụchara.+ 28  Naanị mmadụ ole na ole n’ime ha ga-agbanahụ mma agha, si Ijipt laghachi Juda.+ Ndị Juda niile fọdụrụ, ndị gara biri n’Ijipt, ga-amata onye ihe o kwuru ga-emezu, ma ọ̀ bụ nke m kwuru ka ọ̀ bụ nke ha kwuru.”’” 29  “Jehova kwuru, sị, ‘M ga-eme ihe ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ ebe a. Unu ga-amarakwa na ọdachi m kwuru na ọ ga-adakwasị unu ga-adakwasịrịrị unu. 30  Jehova kwukwara, sị: “M ga-enyefe Fero Họfra, bụ́ eze Ijipt, n’aka ndị iro ya nakwa n’aka ndị na-achọ igbu ya,* otú ahụ m nyefere Zedekaya eze Juda n’aka Nebukadneza* eze Babịlọn, bụ́ onye iro ya na onye na-achọ igbu ya.”’”*+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “Memfis.”
Na Hibru, “m na-ebili n’isi ụtụtụ ezite ha.”
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi unu.”
Na Hibru, “ha.”
Ma ọ bụ “o wuteghị unu.”
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ọ bụ aha a na-etu chi ndị Izrel kwụsịrị ife Chineke na-efe. O nwere ike ịbụ chi nwaanyị ha weere ka chi na-enye nwa.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi ya.”