Jeremaya 32:1-44

  • Jeremaya zụrụ ala (1-15)

  • Ekpere Jeremaya kpere (16-25)

  • Ihe Jehova gwara Jeremaya (26-44)

32  Ihe a ka Jehova gwara Jeremaya n’afọ nke iri n’ọchịchị Zedekaya bụ́ eze Juda. Afọ ahụ bụkwa afọ nke iri na asatọ n’ọchịchị Nebukadneza.*+  N’oge ahụ, ndị agha eze Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, e jikwa Jeremaya onye amụma eji n’Ogige Ndị Nche+ nke dị n’ụlọ* eze Juda.  Ọ bụ Zedekaya eze Juda jichiri ya,+ sị: “Gịnị mere i ji na-ebu ụdị ihe a n’amụma? Ị na-asị, ‘Jehova kwuru, sị: “M ga-enyefe obodo a n’aka eze Babịlọn. Ọ ga-ewegharakwa ya.+  Zedekaya eze Juda agaghị agbapụ n’aka ndị Kaldia, n’ihi na a ga-enyeferịrị ya n’aka eze Babịlọn. Ha abụọ ga-ahụ ibe ha, kwuokwa okwu ihu na ihu.”’+  Jehova kwuru, sị, ‘Eze Babịlọn ga-akpụrụ Zedekaya laa Babịlọn, n’ebe ahụkwa ka ọ ga-anọ ruo mgbe m ga-ekpebi ihe m ga-eme ya. Ọ bụ eziokwu na unu na-alụso ndị Kaldia agha, unu agaghị emeri ha.’”+  Jeremaya kwuru, sị: “Jehova gwara m, sị,  ‘Hanamel nwa Shalọm, bụ́ nwanne nna gị, ga-abịakwute gị, sị: “Zụrụ ala m dị n’Anatọt,+ n’ihi na ọ bụ gị bụ onye mbụ nwere ikike ịgbara ya.”’”+  Hanamel nwa nwanne nna m bịakwutekwara m otú Jehova kwuru, bata n’Ogige Ndị Nche, wee sị m: “Biko, zụrụ ala m dị n’Anatọt, nke dị n’ala Benjamin, n’ihi na ọ bụ gị nwe ikike iketa ihe m. Ọ bụkwa gị nwe ikike ịgbara ya. Zụrụ ya.” Mgbe ahụ ka m ji mara na ọ bụ ihe Jehova chọrọ ka m mee.  M wee kwụọ Hanamel nwa nwanne nna m ụgwọ ala ahụ dị n’Anatọt. M tụrụ ego m ji kwụọ ya ụgwọ ahụ atụ̀.+ Ọ dị shekel* asaa na mkpụrụ ọlaọcha iri. 10  M dekwara ihe anyị kwekọrịtara n’akwụkwọ,+ pịakọta ya, kaakwa ya akara. M kpọkwara ndị akaebe,+ tụọkwa ego ahụ atụ̀. 11  M weere akwụkwọ ahụ m ji zụọ ya, ma nke a pịakọtara kaa akara otú iwu kwuru ka e mee ma a zụọ ala, ma nke a na-apịakọtaghị apịakọta, 12  nye Barọk+ nwa Neraya+ nwa Masaya. Ndị nọ mgbe m nyere ya akwụkwọ ndị ahụ bụ Hanamel nwa nwanne nna m, ndị akaebe ahụ bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ m ji zụọ ala, na ndị Juu niile nọ ọdụ n’Ogige Ndị Nche ahụ.+ 13  M nọkwa n’ihu ha gwa Barọk, sị: 14  “Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘Were akwụkwọ ndị a m ji zụọ ala tinye n’ite ụrọ, ka ha wee dịtee aka, ma akwụkwọ nke a pịakọtara kaa akara ma nke a na-apịakọtaghị apịakọta.’ 15  N’ihi na Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị, ‘A ga-emecha na-azụ ụlọ na ala na ubi vaịn n’obodo a.’”+ 16  Mgbe m nyechara Barọk nwa Neraya akwụkwọ ahụ m ji zụọ ala, m kpere ekpere gwa Jehova, sị: 17  “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ọ bụ gị ji ike gị na-enweghị atụ+ na aka gị siri ike kee eluigwe na ụwa. E nweghị ihe nyịrị gị ime. 18  Ị na-egosi ọtụtụ puku mmadụ ịhụnanya,* ma ị na-akwụ ndị bụ́ ụmụ ụgwọ mmehie ndị nna ha mere.+ Ị bụ ezi Chineke, Onye ukwu, na Dike. Aha gị bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha. 19  Nzube gị dị ebube. Ị na-arụkwa nnukwu ọrụ.+ I ji anya gị ahụ ihe niile ụmụ mmadụ na-eme,+ iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ otú o si kpaa àgwà.+ 20  I mere ihe àmà, rụọkwa ọrụ ebube dị iche iche n’Ijipt, nke ndị mmadụ ma ruo taa. I si otú ahụ mee ka ndị Izrel na ndị ọzọ niile mara aha gị+ otú a ma ya taa. 21  I ji ihe àmà, ọrụ ebube, ike gị na aka gị siri ike nakwa ihe ndị na-emenye ezigbo ụjọ si n’Ijipt kpọpụta ndị gị bụ́ ndị Izrel.+ 22  “Ka oge na-aga, i nyere ha ala a ị ṅụụrụ ndị nna nna ha iyi na ị ga-enye ha.+ Ala a bụ ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya.*+ 23  Ha batara n’ala a nweta ya, ma ha emeghị ihe i kwuru. Ha edebeghịkwa iwu gị. Ha emeghịkwa ihe niile i nyere ha iwu ka ha mee, i wee mee ka ọdachi a niile dakwasị ha.+ 24  Ndị mmadụ abịala jiri ájá rụọ mgbidi gburugburu obodo anyị, ka ha weghara ya.+ Ndị Kaldia, ndị nọ na-alụso anyị agha, ga-ewegharakwa obodo anyị n’ihi mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe+ na-akpa anyị aka ọjọọ. Ihe ị na-ahụ na-eme anyị na-egosi na ihe niile i kwuru na ha ga-eme emezuola. 25  Ma, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova, ị gwara m ka m gaa zụọ ala, ka m nọrọkwa n’ihu ndị akaebe kwụọ ụgwọ ya ebe ị makwa na a ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia.” 26  Jehova wee gwa Jeremaya, sị: 27  “Abụ m Jehova, Chineke mmadụ niile.* È nwere ihe nyịrị m? 28  Mụnwa bụ́ Jehova kwuru, sị: ‘M ga-enyefe obodo a n’aka ndị Kaldia nakwa n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn. Ọ ga-ewegharakwa ya.+ 29  Ndị Kaldia, ndị nọ na-alụso obodo a agha, ga-abata mụnye ya ọkụ, ya agbaa ọkụ.+ Ebe ndị ọzọ ha ga-agba ọkụ bụ ụlọ ndị obodo a na-anọ n’elu ha achụrụ Bel àjà, na-achụkwara chi ọzọ dị iche iche àjà mmanya. Àjà ndị a ha na-achụ na-akpasu m iwe.’+ 30  “Jehova kwuru, sị, ‘Ndị Izrel na ndị Juda na-eme naanị ihe dị njọ n’anya m, malite mgbe ha bụ ụmụaka.+ Ndị Izrel ji ọrụ aka ha na-akpasu m iwe. 31  Obodo a na-akpasu m iwe, na-emekwa ka ọnụma ju m obi malite n’ụbọchị ọ ghọrọ obodo ruo taa.+ Ọ bụ ihe mere m ga-eji ewepụ ya n’ihu m.+ 32  M ga-ewepụkwa ya n’ihi ihe ọjọọ niile ndị Izrel na ndị Juda mere, nke ha ji akpasu m iwe, ha na ndị eze ha,+ ndị isi ha,+ ndị nchụàjà ha, ndị amụma ha,+ nakwa ndị Juda na ndị bi na Jeruselem. 33  Ha nọ na-agbakụta m azụ. Ha echeghị ihu n’ebe m nọ.+ N’agbanyeghị na m nọ na-ezi ha ihe ugboro ugboro,* e nweghị onye n’ime ha nabatara aka ná ntị m na-adọ ha.+ 34  Ha dowekwara arụsị ha na-asọ oyi n’ụlọ ahụ a na-anọ eto aha m, si otú ahụ merụọ ya.+ 35  Ha rụkwaara Bel ebe dị elu na Ndagwurugwu Nwa Hinọm.*+ Ha na-anọ ebe ahụ akpọ ụmụ ha ndị nwoke na ụmụ ha ndị nwaanyị ọkụ iji chụọrọ Molek àjà.+ Ihe a ha na-eme abatatụbeghị m n’obi.* Ọ bụghịkwa mụnwa gwara ha+ kpawa arụ a, nke mere ka Juda mehie.’ 36  “N’ihi ya, e nwere ihe Jehova bụ́ Chineke Izrel kwuru gbasara obodo a unu na-ekwu na a ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe nyefee n’aka eze Babịlọn. Ọ sịrị, 37  ‘M ga-esi n’obodo niile m ji iwe na ọnụma na oké iwe chụga ha kpọkọta ha.+ M ga-akpọlata ha ebe a, meekwa ka ha biri na ya, obi eruokwa ha ala.+ 38  Ha ga-abụ ndị m, mụnwa ga-abụkwa Chineke ha.+ 39  M ga-eme ka ha nwee otu obi,+ na-akpakwa otu ụdị àgwà, ka ha wee na-atụ egwu m mgbe niile, ka ihe wee dịrị ha na ụmụ ha ná mma.+ 40  Mụ na ha ga-agba ndụ na agaghị m akwụsị imere ha ihe ọma.+ Ọgbụgba ndụ a ga-adịrukwa mgbe ebighị ebi.+ M ga-emekwa ka ịtụ m egwu dịrị ha n’obi, ka ha ghara ịgbakụta m azụ.+ 41  M ga na-enwe aṅụrị imere ha ihe ọma.+ M ga-eji obi m niile na mkpụrụ obi* m niile mee ka ha bigide n’ala a.’”+ 42  “Jehova kwuru, sị, ‘Otú ahụ m mere ka nnukwu ọdachi a niile dakwasị ndị a, ka m ga-emekwara ha ihe ọma niile m kwere ha ná nkwa.+ 43  A ga-ebidokwa ọzọ ịna-azụ ala n’ala a,+ n’agbanyeghị na unu na-asị: “Ọ tọgbọzi nkịtị. Mmadụ na anụ ụlọ anọghịzi na ya. E nyefeekwala ya n’aka ndị Kaldia.”’ 44  “Jehova kwukwara, sị, ‘Ndị mmadụ ga-eji ego na-azụ ala, na-edekwa akwụkwọ ndị e ji kwekọrịta na a zụọla ha, na-apịachi ha, na-akakwa ha akara, na-akpọkwa ndị akaebe. Ihe a ga na-eme n’ala Benjamin+ nakwa n’ebe niile gbara Jeruselem gburugburu nakwa n’obodo ndị dị na Juda+ nakwa n’obodo ndị dị n’ala bụ́ ugwu ugwu nakwa n’obodo ndị dị n’ala dị larịị+ nakwa n’obodo ndị dị n’ebe ndịda. Ihe a ga-eme n’ihi na m ga-akpọlata ndị ha a dọọrọ n’agha.’”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Ma ọ bụ “n’obí.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “ịhụnanya pụrụ iche.”
Ya bụ, ala na-eme nri nke ọma.
Na Hibru, “anụ ahụ́ niile.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.
Na Hibru, “na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezi ha ihe.”
Gụọ Nkọwa Okwu, “Gehena.”
Ma ọ bụ “agbatatụbeghị m n’uche.”