Jeremaya 29:1-32

  • Akwụkwọ ozi Jeremaya degaara ndị Izrel a dọọrọ n’agha laa Babịlọn (1-23)

    • Afọ iri asaa gachaa, ndị Izrel ga-alọghachi n’obodo ha (10)

  • Ihe a ga-agwa Shemaya (24-32)

29  Ihe ndị a bụ ihe dị n’akwụkwọ ozi Jeremaya onye amụma si Jeruselem zigara ndị okenye fọdụrụ n’ime ndị a dọọrọ n’agha, ndị nchụàjà, ndị amụma, na mmadụ niile, bụ́ ndị Nebukadneza si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn.  O zigara ya mgbe Jekonaya+ bụ́ eze si na Jeruselem pụọ,+ ya na nne eze+ na ndị na-eje ozi n’obí eze, ndị isi Juda na Jeruselem, nakwa ndị omenkà na ndị na-akpụ ụ́zụ́.*  Ndị o nyere akwụkwọ ozi ahụ ka ha ziga bụ Elesa nwa Shefan+ na Gemaraya nwa Hilkaya, bụ́ ndị Zedekaya+ eze Juda ziri ka ha gaa Babịlọn hụ Nebukadneza bụ́ eze Babịlọn. Ihe e dere n’akwụkwọ ozi ahụ bụ:  “E nwere ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, gwara ndị niile a dọọrọ n’agha, ndị o mere ka e si na Jeruselem dọrọ n’agha laa Babịlọn. Ọ gwara ha, sị,  ‘Rụọnụ ụlọ, birikwanụ na ya. Kọọnụ ubi, riekwanụ ihe si na ya.  Lụọnụ nwaanyị, mụọkwanụ ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwaanyị. Lụtakwaranụ ụmụ unu ndị nwoke nwaanyị, keekwanụ ụmụ unu ndị nwaanyị di, ka hanwa wee mụọkwa ụmụ ndị nwoke na ụmụ ndị nwaanyị. Mụbaanụ n’ebe ahụ, unu adịkwala ntakịrị.  Gbaakwanụ mbọ ka udo dịrị n’obodo ahụ m mere ka a dọrọ unu n’agha laa na ya. Rịọkwanụ Jehova arịrịọ n’isi ya, n’ihi na ọ bụrụ na udo adị na ya, udo ga-adịkwara ununwa.+  Mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “Unu ekwela ka ndị amụma unu na ndị na-agbara unu afa duhie unu.+ Unu egekwala ntị ná nrọ ndị ha na-akọrọ unu na ha rọrọ.  N’ihi na ‘ọ bụ amụma ụgha ka ha na-eburu unu n’aha m. Ọ bụghị m gwara ha ihe ha na-ekwu.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’” 10  “Jehova kwukwara, sị, ‘Ọ bụrụ na unu anọzuo afọ iri asaa na Babịlọn, m ga-emere unu ihe ọma,+ kpọlata unu ebe a otú m kwere unu ná nkwa.’+ 11  “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu.+ M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.+ 12  Unu ga-akpọku m, bịakwa rịọ m arịrịọ. M ga-egekwa unu ntị.’+ 13  “‘Unu ga-achọ m wee chọta m,+ n’ihi na unu ga-eji obi unu niile na-achọ m.+ 14  M ga-ekwe ka unu chọta m.’+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a. Jehova kwukwara, sị: ‘M ga-akpọkọta ndị obodo unu a dọọrọ n’agha. M ga-esikwa ná mba niile na ebe niile m chụsasịrị unu kpọkọta unu.+ M ga-akpọlatakwa unu n’ebe m mere ka e si dọrọ unu n’agha.’+ 15  “Ma, unu na-asị, ‘Jehova emeela ka anyị nwee ndị amụma na Babịlọn.’ 16  “E nwere ihe Jehova gwara eze nọ n’ocheeze Devid+ nakwa ndị niile bi n’obodo a, ya bụ, ụmụnne unu ndị na-ekweghị ka a dọrọ ha n’agha otú a dọọrọ unu. 17  ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, sị: “M ga-eji mma agha, ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-eme ha ihe.+ M ga-emekwa ka ha dị ka mkpụrụ osisi fig rere ere* nke na e nweghị onye nwere ike ịta ya n’ihi otú o si mebie.”’+ 18  “‘M ga-eji mma agha,+ ụnwụ, na ọrịa na-efe efe na-achụ ha ọsọ. M ga-emekwa ka alaeze niile dị n’ụwa tụwa ụjọ n’ihi ihe mere ha,+ ha aghọọ ndị a bụrụ ọnụ, dịrị ka ihe na-awụ akpata oyi n’ahụ́ na ihe a ga-afụrụ mkpọrọhịhị.+ Mba niile m ga-achụga ha ga na-akọchakwa ha.’+ 19  Jehova kwukwara, sị, ‘M ga-eme ha ihe ndị a n’ihi na m nọ na-ezitere ha ndị ohu m bụ́ ndị amụma m ugboro ugboro,*+ ma ha anaghị ege ha ntị mgbe ha na-agwa ha ihe m kwuru.’ “Jehova gwara ha, sị, ‘Unu egeghị ntị.’+ 20  “N’ihi ihe a, unu niile ndị a dọọrọ n’agha, ndị Jehova si Jeruselem chụga Babịlọn, nụrụnụ ihe m kwuru. 21  E nwere ihe mụnwa bụ́ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru gbasara Ehab nwa Kolaya na Zedekaya nwa Measaya, bụ́ ndị na-eburu unu amụma ụgha n’aha m.+ M sịrị, ‘M ga-enyefe ha n’aka Nebukadneza* bụ́ eze Babịlọn. Ọ ga-egbukwa ha n’ihu unu. 22  Ndị niile e si na Juda dọrọ n’agha laa Babịlọn ga-eji ha na-abụ ọnụ, sị: “Ka Jehova mee ka ị dị ka Zedekaya na Ehab, bụ́ ndị eze Babịlọn gbara ọkụ!” 23  A ga-eme ha ihe a n’ihi na ha kpara àgwà ka ndị nzuzu n’Izrel.+ Ha na nwunye ndị agbata obi ha na-akwa iko. Ha na-ekwukwa okwu ụgha n’aha m, na-ekwu ihe m na-asịghị ha kwuo.+ “‘“Ama m ihe a, abụkwa m onye akaebe n’okwu a.”+ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.’” 24  “Gwa Shemaya+ onye Nehelam, sị, 25  ‘Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel, kwuru, sị: “I zigaara ndị niile nọ na Jeruselem nakwa Zefanaya+ nwa Measaya, bụ́ onye nchụàjà, na ndị nchụàjà niile akwụkwọ ozi n’aha gị, sị, 26  ‘Jehova emeela gịnwa, bụ́ Zefanaya onye nchụàjà, ka ị nọchie Jehoyada onye nchụàjà, ka ị na-elekọta ụlọ Jehova, nakwa ka i jide nwoke ọ bụla ara na-agba nke na-eme ka onye amụma, tinyekwa ya n’ọtọsị.+ 27  Gịnịzi mere na ị babereghị Jeremaya onye Anatọt+ mba, onye na-eme ka onye amụma n’ihu unu?+ 28  O zitedịịrị anyị ozi na Babịlọn, sị: “Unu ka ga-ebite ebe a aka. Rụọnụ ụlọ, biri n’ime ya. Kọọnụ ubi, riekwa ihe si na ya,+—”’”’” 29  Mgbe Zefanaya+ onye nchụàjà gụụrụ Jeremaya onye amụma akwụkwọ ozi a, 30  Jehova gwara Jeremaya, sị: 31  “Zigara ndị niile a dọọrọ n’agha ozi, sị, ‘E nwere ihe Jehova kwuru gbasara Shemaya onye Nehelam. Ọ sịrị: “Ebe ọ bụ na Shemaya ebuorola unu amụma m na-ezighị ya buo, gbalịakwa ime ka unu kwere okwu ụgha,+ 32  Jehova kwuru, sị, ‘M ga-ata Shemaya onye Nehelam na ụmụ ya ahụhụ. E nweghị onye si n’ezinụlọ ya ga-adị ndụ. Ọ gaghị ahụ ihe ọma m ga-emere ndị m, n’ihi na o mere ka ndị mmadụ nupụrụ Jehova isi.’ Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ, “ndị na-arụ mgbidi siri ike.”
O nwere ike ịbụ, “gbawara agbawa.”
Na Hibru, “m na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezitere ha ndị ohu m, bụ́ ndị amụma.”
Na Hibru, “Nebukadreza.” Ọ bụ otú ọzọ e si ede aha a.