Jeremaya 1:1-19

  • A họpụtara Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma (1-10)

  • Jeremaya hụrụ osisi almọnd n’ọhụụ (11, 12)

  • Jeremaya hụrụ ite nke ihe dị na ya na-agbọ agbọ (13-16)

  • E mere ka obi sie Jeremaya ike ịrụ ọrụ e nyere ya (17-19)

1  Ọ bụ Jeremaya* nwa Hilkaya, bụ́ otu n’ime ndị nchụàjà n’Anatọt,+ n’ala Benjamin, kwuru ihe ndị a.  Jehova gwara m okwu n’afọ nke iri na atọ n’ọchịchị Josaya+ nwa Emọn,+ bụ́ eze Juda.  Chineke gwakwara m okwu n’oge Jehoyakim+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, na-achị. Ọ gwagidere m okwu ruo n’afọ nke iri na otu n’ọchịchị Zedekaya+ nwa Josaya, bụ́ eze Juda, ruokwa mgbe a dọọrọ ndị bi na Jeruselem n’agha n’ọnwa nke ise.+   Jehova gwara m, sị:   “Tupu mụ akpụọ gị n’ime afọ, ama m* gị.+ Tupu a mụọ gị,* edoro m gị nsọ.*+ Ahọpụtara m gị ka ị na-ebu amụma gbasara mba dị iche iche.”   Ma m sịrị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Amaghị m okwu ekwu,+ n’ihi na abụ m nwata.”+   Jehova wee sị m: “Asịla na ị bụ nwata. Kama, gakwuru ndị niile m ga-ezi gị ka ị gakwuru,Kwuokwa ihe niile m ga-asị gị kwuo.+   Mụnwa, bụ́ Jehova, na-agwa gị ka ị ghara ịtụ ihu ha ụjọ,+N’ihi na anọnyeere m gị ka m napụta gị.”+  Jehova wee matịa aka ya metụ m n’ọnụ.+ Jehova gwakwara m, sị: “Etinyela m okwu m n’ọnụ gị.+ 10  Enyefeela m mba dị iche iche na alaeze dị iche iche n’aka gị. Ị ga na-efopụ ihe e kwesịrị ifopụ, na-akwada ihe e kwesịrị ịkwada, na-ebibi ihe e kwesịrị ibibi, na-etida ihe e kwesịrị itida, na-arụ ihe e kwesịrị ịrụ, na-akụkwa mkpụrụ e kwesịrị ịkụ.”+ 11  Jehova gwakwara m okwu ọzọ, sị: “Jeremaya, gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “M na-ahụ alaka osisi almọnd.”* 12  Jehova wee sị m: “Ị hụziri ya ahụzi, n’ihi na m mụ nnọọ anya iji mezuo ihe m kwuru.” 13  Jehova gwakwara m okwu nke ugboro abụọ, sị: “Gịnị ka ị na-ahụ?” Mụ asị ya: “M na-ahụ ite* nke ihe dị na ya na-agbọ agbọ,* ọnụ ya echeghịkwa ihu n’ebe ugwu.” 14  Jehova wee sị m: “Ọdachi ga-esi n’ebe ugwuDakwasị ndị niile bi n’ala a.+ 15  Jehova kwuru, sị, ‘M na-akpọkọta ezinụlọ niile si n’alaeze ebe ugwu.+ Ha niile ga-abịa. Eze nke ọ bụla n’ime ha ga-ebusakwa ocheeze yaN’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+ Ha ga-etida mgbidi ya niile gbaa gburugburu,Lụsokwa obodo niile dị na Juda agha.+ 16  M ga-ama ndị m ikpe n’ihi ihe ọjọọ niile ha na-eme,N’ihi na ha ahapụla m,+Na-achụrụ chi ọzọ dị iche iche àjà a na-esu ọkụ,+Na-akpọkwara ọrụ aka ha isiala.’+ 17  Ma gịnwa, jikere ime ihe i kwesịrị ime.* Gaa gwa ha ihe niile m ga-agwa gị ka ị gwa ha. Atụla ha ụjọ,+Ka m ghara ime ka ụjọ jide gị n’ihu ha. 18  Taa, emeela m ka ị dị ka obodo a rụsiri ike,Ogidi ígwè, na mgbidi ọla kọpa, ka i nwee ike kwụrụ ma kwuo ihe ga-eme ala a niile,+Ihe ga-eme ndị eze Juda na ndị isi ya,Nakwa ihe ga-eme ndị nchụàjà ya na ndị bi n’ala a.+ 19  Ha ga-alụso gị ọgụ,Ma ha agaghị emeri gị,N’ihi na anọnyeere m gị+ ka m napụta gị. Ọ bụ Jehova kwuru ihe a.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

O nwere ike ịbụ na Jeremaya pụtara “Jehova Na-ebuli Mmadụ Elu.”
Ma ọ bụ “ahọọrọ m.”
Na Hibru, “Tupu i si n’akpa nwa pụta.”
Ma ọ bụ “edoro m gị iche.”
Na Hibru, “onye tetara eteta.”
Ma ọ bụ “ite e ji esi nri nke nwere ọnụ obosara.”
Ma ọ bụ “nke a fụnwuru ọkụ n’okpuru ya.”
Na Hibru, “kee ájị̀ n’úkwù.”