Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Jeremaya

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • A họpụtara Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma (1-10)

    • Jeremaya hụrụ osisi almọnd n’ọhụụ (11, 12)

    • Jeremaya hụrụ ite nke ihe dị na ya na-agbọ agbọ (13-16)

    • E mere ka obi sie Jeremaya ike ịrụ ọrụ e nyere ya (17-19)

  • 2

    • Ndị Izrel hapụrụ Jehova fewe chi ọzọ (1-37)

      • Ndị Izrel dị ka osisi vaịn ọhịa (21)

      • Ọbara ndị ogbenye gbasara n’uwe mwụda ya (34)

  • 3

    • Otú ndị Izrel meruru ihe ọjọọ (1-5)

    • Ma ndị Izrel ma ndị Juda na-akwa iko (6-11)

    • A gwara ndị Izrel ka ha chegharịa (12-25)

  • 4

    • A ga-agọzi ndị Izrel ma ha chegharịa (1-4)

    • A ga-esi n’ebe ugwu mee ka e nwee ọdachi (5-18)

    • Obi na-egbu Jeremaya mgbu n’ihi ọdachi ga-adakwasị ndị obodo ya (19-31)

  • 5

    • dị bi na Jeruselem anabataghị aka ná ntị Jehova dọrọ ha (1-13)

    • A ga-ebibi ndị Izrel, ma, a gaghị ebibi ha kpamkpam (14-19)

    • Jehova ga-eme ka ndị ya zaa ajụjụ maka ihe ha mere (20-31)

  • 6

    • Oge a ga-anọchibido Jeruselem eruwela (1-9)

    • Jehova ga-eweso Jeruselem iwe (10-21)

      • Ndị mmadụ na-asị, “Udo dị!” mgbe udo na-adịghị (14)

    • Ndị obi tara mmiri si n’ebe ugwu na-abịa ịlụso Zayọn agha (22-26)

    • Jeremaya ga-adị ka onye na-anụcha ọla (27-30)

  • 7

    • Ndị Izrel na-eme ihe ọjọọ ma chee na ụlọ Jehova ga-echebe ha (1-11)

    • Ụlọ nsọ ga-adị ka Shaịlo (12-15)

    • Chineke gwara ndị Juda na ya anaghị anabata onye na-efe arụsị (16-34)

      • Ndị Izrel na-efe chi a na-akpọ “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” (18)

      • Ndị Izrel na-akpọ ụmụ ha ọkụ iji chụọ àjà na Ndagwurugwu Nwa Hinọm (31)

  • 8

    • Ndị Izrel na-eso ndị ọzọ eme ihe ha na-eme (1-7)

    • Onye na-amaghị okwu Jehova amaghị ihe (8-17)

    • Ahụ́ ndị Juda merụrụ na-agbawa Jeremaya obi (18-22)

      • “Ọ̀ bụ na mmanụ balsam adịghị na Gilied?” (22)

  • 9

    • Obi jọrọ Jeremaya ezigbo njọ (1-3a)

    • Jehova ga-eme ka ndị Juda zaa ajụjụ ihe ha mere (3b-16)

    • A na-ebere Juda ákwá arịrị (17-22)

    • Ka onye na-eme ọnụ mewe ọnụ maka na ọ ma Jehova (23-26)

  • 10

    • Ihe Chineke dị ndụ ji ka chi mba dị iche iche (1-16)

    • A ga-ebibi Jeruselem, dọrọkwa ndị bi na ya n’agha (17, 18)

    • Jeremaya na-eru uju (19-22)

    • Ekpere Jeremaya onye amụma kpere (23-25)

      • Mmadụ enweghị ikike iduzi nzọụkwụ ya (23)

  • 11

    • Ndị Juda mebiri ọgbụgba ndụ ha na Chineke (1-17)

      • Chi ndị Juda na-efe dị ọtụtụ ka obodo ndị dị na Juda (13)

    • E ji Jeremaya tụnyere nwa atụrụ a chọrọ igbu egbu (18-20)

    • Ndị obodo Jeremaya na-emegide ya (21-23)

  • 12

    • Jeremaya kwuru ihe na-enye ya nsogbu n’obi (1-4)

    • Ihe Jehova gwara Jeremaya (5-17)

  •  13

    • Ájị̀ ákwà linin mebiri emebi (1-11)

    • A ga-akụwa ite mmanya dị iche iche (12-14)

    • A dọọrọ ndị Juda na-ekweghị mmekwata n’agha (15-27)

      • Onye Kush ọ̀ ga-agbanweli akpụkpọ ahụ́ ya? (23)

  • 14

    • Ụkọ mmiri ozuzo, ụkọ nri, na mma agha (1-12)

    • A ga-egbu ndị amụma ụgha (13-18)

    • Jeremaya kwetara na ndị obodo ya mere ihe ọjọọ (19-22)

  • 15

    • Jehova agaghị agbanwe ihe o kpebiri ime ndị Izrel (1-9)

    • Jeremaya kwuru ihe na-enye ya nsogbu n’obi (10)

    • Ihe Jehova gwara Jeremaya (11-14)

    • Ekpere Jeremaya kpere (15-18)

      • Obi tọrọ Jeremaya ụtọ na o riri okwu Chineke (16)

    • Jehova mere ka obi sie Jeremaya ike (19-21)

  • 16

    • Jeremaya agaghị alụ nwaanyị, ọ gaghị eru uju, ọ gaghịkwa eme oriri (1-9)

    • A ga-ata ndị Izrel ahụhụ, e mechaa, ha alọghachi n’ala ha (10-21)

  • 17

    • E ji mkpịsị akwụkwọ ígwè dee mmehie Juda (1-4)

    • A ga-agọzi onye tụkwasịrị Jehova obi (5-8)

    • Obi dị aghụghọ (9-11)

    • Jehova bụ onye ndị Izrel ji nwee olileanya (12, 13)

    • Ekpere Jeremaya kpere (14-18)

    • E kwesịrị ido Ụbọchị Izu Ike nsọ (19-27)

  • 18

    • Ụrọ dị n’aka ọkpụite (1-12)

    • Jehova gbakụtara ndị Izrel azụ (13-17)

    • Nkata ndị Izrel kpaara Jeremaya na ihe ọ rịọrọ ha (18-23)

  • 19

    • A gwara Jeremaya ka ọ kụwaa ite ụrọ (1-15)

      • Ndị Izrel na-eji ụmụ ha achụrụ Bel àjà (5)

  • 20

    • Pash-họ tiri Jeremaya ihe (1-6)

    • Jeremaya akwụsịghị izi ndị mmadụ ozi ọma (7-13)

      • Okwu Chineke dị ka ọkụ na-ere ere n’ime obi Jeremaya (9)

      • Jehova dị ka dike n’agha (11)

    • Jeremaya kwuru otú obi dị ya (14-18)

  • 21

    • Jehova emeghị ihe Zedekaya rịọrọ ya (1-7)

    • A gwara ndị Izrel ka ha họrọ ndụ ma ọ bụ ọnwụ (8-14)

  • 22

    • Ihe ndị e kwuru ga-eme ndị eze ọjọọ (1-30)

      • Banyere Shalọm (10-12)

      • Banyere Jehoyakim (13-23)

      • Banyere Konaya (24-30)

  • 23

    • Ezigbo ndị ọzụzụ atụrụ na ndị nke ọjọọ (1-4)

    • Obi ga-eru ndị mmadụ ala ma “eze, bụ́ onye ezi omume,” chịwa (5-8)

    • A ga-ata ndị amụma ụgha ahụhụ (9-32)

    • Ozi si n’aka Jehova bụ ibu arọ (33-40)

  • 24

    • Mkpụrụ fig ndị dị mma na ndị nke mebiri emebi (1-10)

  • 25

    • Ihe Jehova kwuru ọ ga-eme mba dị iche iche (1-38)

      • Mba dị iche iche ga-ejere Babịlọn ozi afọ iri asaa (11)

      • Iko mmanya nke iwe Chineke (15)

      • Ọdachi ga-esi n’otu mba ruo mba ọzọ (32)

      • Ndị Jehova gburu (33)

  • 26

    • Ndị Izrel chọrọ igbu Jeremaya (1-15)

    • E mechaghị gbuo Jeremaya (16-19)

      • E kwughachiri ihe Maịka buru n’amụma (18)

    • Yuraịja onye amụma (20-24)

  • 27

    • Yok eze Babịlọn (1-11)

    • A gwara Zedekaya ka o jewere eze Babịlọn ozi (12-22)

  • 28

    • Jeremaya na onye amụma ụgha bụ́ Hananaya (1-17)

  • 29

    • Akwụkwọ ozi Jeremaya degaara ndị Izrel a dọọrọ n’agha laa Babịlọn (1-23)

      • Afọ iri asaa gachaa, ndị Izrel ga-alọghachi n’obodo ha (10)

    • Ihe a ga-agwa Shemaya (24-32)

  •  30

    • Chineke kwere nkwa ịkpọlata ndị Izrel, gwọọkwa ha (1-24)

  • 31

    • Ndị fọdụrụ ná ndị Izrel ga-ebirighachi n’ala ha (1-30)

      • Rechel na-ebe ákwá maka ụmụ ya (15)

    • Ọgbụgba ndụ ọhụrụ (31-40)

  • 32

    • Jeremaya zụrụ ala (1-15)

    • Ekpere Jeremaya kpere (16-25)

    • Ihe Jehova gwara Jeremaya (26-44)

  • 33

    • Chineke kwere nkwa ịkpọghachi ndị Izrel (1-13)

    • Obi ga-eru ndị mmadụ ala ma “onye ezi omume si n’ezinụlọ Devid” chịwa (14-16)

    • Ọgbụgba ndụ gbasara Chineke na Devid na ndị nchụàjà (17-26)

      • Ọgbụgba ndụ nke na-achị ehihie na nke na-achị abalị (20)

  • 34

    • Ihe Chineke kpebiri ime Zedekaya (1-7)

    • Ndị Izrel mebiri ndụ ha gbara na ha ga-ahapụ ndị ohu ha ka ha laa (8-22)

  • 35

    • Ndị Rikab rubeere nna nna ha isi (1-19)

  • 36

    • Jeremaya gwara Barọk ihe ọ ga-ede, ya edee ya n’akwụkwọ mpịakọta (1-7)

    • Barọk gụpụtaara ndị mmadụ ihe dị n’akwụkwọ mpịakọta (8-19)

    • Jehoyakim gbara akwụkwọ mpịakọta ahụ ọkụ (20-26)

    • E deghachiri ihe Jeremaya kwuru n’akwụkwọ mpịakọta ọzọ (27-32)

  • 37

    • Ndị Kaldia hapụrụ ịlụso ndị Izrel agha, mechaa bịaghachi (1-10)

    • A tụrụ Jeremaya mkpọrọ (11-16)

    • Zedekaya na Jeremaya kparịtara ụka (17-21)

      • A na-enye Jeremaya achịcha (21)

  • 38

    • A tụbara Jeremaya n’olulu (1-6)

    • Ibed-melek napụtara Jeremaya (7-13)

    • Jeremaya gwara Zedekaya ka ọ chiliere ndị Babịlọn aka elu (14-28)

  • 39

    • A kwaturu mgbidi Jeruselem (1-10)

      • Zedekaya gbara ọsọ, e jide ya (4-7)

    • A hapụrụ Jeremaya ebe a ga na-elekọta ya (11-14)

    • E gbughị Ibed-melek (15-18)

  • 40

    • Nebuzaradan hapụrụ Jeremaya (1-6)

    • E mere Gedalaya onyeisi ala (7-12)

    • A kpara nkata igbu Gedalaya (13-16)

  • 41

    • Ishmel gburu Gedalaya (1-10)

    • Johenan chụụrụ Ishmel gawa (11-18)

  • 42

    • Ndị Juu gwara Jeremaya ka ọ rịọ Chineke ka ọ gwa ha ihe ha ga-eme (1-6)

    • Jehova gwara ha, sị: “Unu agala Ijipt” (7-22)

  • 43

    • Ndị Juu nupụrụ isi gawa Ijipt (1-7)

    • Jehova gwara Jeremaya okwu n’Ijipt (8-13)

  • 44

    • Jeremaya kwuru na ọdachi ga-adakwasị ndị Juu gara Ijipt (1-14)

    • Ndị Juu ekwetaghị ihe Chineke gwara ha (15-30)

      • Ndị Juu nọ na-efe “Eze Nwaanyị nke Eluigwe” (17-19)

  • 45

    • Ihe Jehova gwara Barọk (1-5)

  • 46

    • E buru amụma ihe ga-eme Ijipt (1-26)

      • Nebukadneza ga-emeri Ijipt (13, 26)

    • Nkwa ndị e kwere ndị Izrel (27, 28)

  • 47

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Filistia (1-7)

  • 48

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Moab (1-47)

  • 49

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Amọn (1-6)

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Ịdọm (7-22)

      • Ịdọm agaghịzi adị (17, 18)

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Damaskọs (23-27)

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Kida na ndị Hezọ (28-33)

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Ịlam (34-39)

  • 50

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Babịlọn (1-46)

      • Sinụ na Babịlọn gbapụ (8)

      • A ga-akpọghachite ndị Izrel (17-19)

      • Mmiri ndị dị na Babịlọn ga-ata (38)

      • Babịlọn agaghịzi abụ ebe a ga-ebi ebi (39, 40)

  •  51

    • E buru amụma ihe ga-eme ndị Babịlọn (1-64)

      • Ndị Midia ga-emeri Babịlọn na mberede (8-12)

      • A tụbara akwụkwọ n’Osimiri Yufretis (59-64)

  • 52

    • Zedekaya nupụụrụ ndị Babịlọn isi (1-3)

    • Nebukadneza nọchibidoro Jeruselem (4-11)

    • E bibiri Jeruselem na ụlọ nsọ dị na ya (12-23)

    • A dọọrọ ndị mmadụ n’agha laa Babịlọn (24-30)

    • E si n’ụlọ mkpọrọ kpọpụta Jehoyakin (31-34)