Jenesis 42:1-38

  • Ụmụnne Josef gara Ijipt (1-4)

  • Josef hụrụ ụmụnne ya ma nwalee ha (5-25)

  • Ụmụnne Josef lọghachikwutere Jekọb (26-38)

42  Mgbe Jekọb nụrụ na ọka* dị n’Ijipt,+ ọ gwara ụmụ ya ndị nwoke, sị: “Gịnị mere unu ji nọrọ na-ele ibe unu n’anya?”  Ọ sịkwara ha: “Anụrụ m na ọka dị n’Ijipt. Gaanụ ebe ahụ zụtara anyị ọka, ka anyị wee dị ndụ ma ghara ịnwụ.”+  Ụmụnne Josef iri+ wee gawa ịzụta ọka n’Ijipt.  Ma Jekọb ekweghị ka Benjamin,+ nwanne Josef, soro ụmụnne ya ndị nke ọzọ gaa, n’ihi na ọ sịrị: “Ihe nwere ike ime ya, ya anwụọ.”+  Ụmụ Izrel* wee rute Ijipt, ha na ndị ọzọ bịara ịzụ ihe oriri, n’ihi na ụnwụ ahụ ruru Kenan.+  Ọ bụ Josef bụ onyeisi n’Ijipt,+ ọ bụkwa ya na-eresị ndị si n’ebe niile n’ụwa ọka.+ N’ihi ya, ụmụnne Josef bịara hulata kpọọrọ ya isiala.+  Mgbe Josef hụrụ ụmụnne ya, ọ matara ha ozugbo, ma o mere ka ha ghara ịmata ya.+ N’ihi ya, o ji olu ike gwa ha okwu, sị ha: “Ebee ka unu si bịa?” Ha sịrị ya: “Anyị si Kenan bịa ka anyị zụrụ ihe oriri.”+  Otú ahụ ka Josef si mata ụmụnne ya, ma ha amataghị ya.  Ozugbo ahụ, Josef chetara nrọ ndị ọ rọrọ banyere ha.+ O wee gwa ha, sị: “Unu bụ ndị nnyopụta! Unu bịara ka unu chọpụta ebe ndị unu nwere ike isi bata lụso anyị agha.” 10  Ha wee sị ya: “Mba, onyenwe anyị, kama ndị ohu gị bịara ịzụ ihe oriri. 11  Ọ bụ otu nwoke mụrụ anyị niile. Anyị na-akwụwa aka ọtọ. Ndị ohu gị abụghị ndị nnyopụta.” 12  Ma ọ sịrị ha: “Ọ bụghị eziokwu! Unu bịara ka unu chọpụta ebe ndị unu nwere ike isi bata lụso anyị agha.” 13  Ha sịziri ya: “Ndị ohu gị dị ụmụnne iri na abụọ.+ Ọ bụ otu nwoke bi na Kenan mụrụ anyị niile.+ Nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọ ugbu a,+ ma onye nke ọzọ anọghịzi.”+ 14  Ma Josef sịrị ha: “Ihe m gwara unu bụ otú ọ dị. ‘Unu bụ ndị nnyopụta.’ 15  M ga-eji ihe a nwalee unu: Eji m Fero aṅụ iyi na unu agaghị esi ebe a laa, ọ gwụla ma nwanne unu nke ọdụdụ ọ̀ bịara ebe a.+ 16  Zipụnụ otu onye n’ime unu ka ọ gaa kpọta nwanne unu, ma a ga-akpọchi unu. M ga-esi otú a mara ma ùnu na-ekwu eziokwu. Ma ọ bụrụ na unu emeghị ihe a, eji m Fero na-aṅụ iyi, na-agwa unu na unu bụ ndị nnyopụta.” 17  O wee tụba ha n’otu ụlọ mkpọrọ ruo ụbọchị atọ. 18  N’ụbọchị nke atọ, Josef gwara ha, sị: “Meenụ ihe a ka unu wee dịrị ndụ, n’ihi na m na-atụ egwu Chineke. 19  Ọ bụrụ na unu na-akwụwa aka ọtọ, ka otu n’ime ụmụnne unu nọrọ n’ụlọ ebe a kpọchiri unu. Ma ndị nke ọzọ n’ime unu nwere ike ịga buru ọka bulaara ndị ezinụlọ unu ụnwụ na-akpa aka ọjọọ.+ 20  Unu ga-akpọtaziri m nwanne unu nke ọdụdụ, ka unu wee gosi na ihe unu kwuru bụ eziokwu, unu agaghịkwa anwụ.” Ha wee mee otú ahụ. 21  Ha gwara ibe ha, sị: “O doro anya na ọ bụ n’ihi nwanne anyị nwoke ka e ji na-ata anyị ahụhụ,+ maka na anyị hụrụ otú o si na-ewute ya mgbe ọ na-arịọ anyị ka anyị meere ya ebere, ma anyị egeghị ya ntị. Ọ bụ ya mere nsogbu a ji bịara anyị.” 22  Ruben wee gwa ha, sị: “Ọ̀ bụ na mụ asịghị unu, ‘Unu emela nwata ahụ ihe ọjọọ,’* ma unu egeghị m ntị?+ Ugbu a, anyị na-aza ajụjụ maka ọbara ya.”+ 23  Ma ha amaghị na Josef ghọtara ihe ha na-ekwu ebe ọ bụ na e nwere onye na-asụgharị ihe ha na-ekwu. 24  Josef sizi n’ebe ha nọ pụọ wee malite ibe ákwá.+ Mgbe ọ lọghachiri, ya na ha kwuru okwu ọzọ, ya akpọrọzie Simiọn+ kee ya agbụ n’ihu ha.+ 25  Josef nyere iwu ka e kpojuo ọka n’akpa ha, ka e tinye ego onye nke ọ bụla n’ime akpa ya, nakwa ka e nye ha ihe ha ga-eri n’ụzọ. E meere ha otú ahụ. 26  Ha wee bukwasị ọka ha n’elu jakị ha, si n’ebe ahụ lawa. 27  Mgbe otu onye n’ime ha meghere akpa ya n’ebe ha ga-arahụ ka o nye jakị ya nri, ọ hụrụ ego ya n’ọnụ akpa ya. 28  O wee gwa ụmụnne ya, sị: “E weghachiri ego m. Ọ dị n’akpa m!” Obi wee wụnye ha n’afọ, ahụ́ mawakwara ha jijiji, ha asị ibe ha: “Gịnị bụ ihe a Chineke mere anyị?” 29  Mgbe ha lọghachikwutere Jekọb nna ha na Kenan, ha kọọrọ ya ihe niile mere ha. Ha sịrị ya: 30  “Onyeisi obodo ahụ ji olu ike gwa anyị okwu.+ Ọ sịkwara na anyị bịara inyopụta obodo ahụ. 31  Ma anyị gwara ya, sị, ‘Anyị na-akwụwa aka ọtọ. Anyị abụghị ndị nnyopụta.+ 32  Anyị dị ụmụnne iri na abụọ.+ Ọ bụ otu nna mụrụ anyị. Otu onye anọghịzi.+ Nwanne anyị nke ọdụdụ na nna anyị nọkwa ugbu a na Kenan.’+ 33  Ma onyeisi obodo ahụ sịrị anyị, ‘M ga-eji ihe a mara na unu na-akwụwa aka ọtọ: Hapụnụ otu nwanne unu ka mụ na ya nọrọ.+ Burunụ nri lawa ka unu bulaara ndị ezinụlọ unu ụnwụ na-akpa aka ọjọọ.+ 34  Kpọtaranụ m nwanne unu nke ọdụdụ, ka m wee mara na unu abụghị ndị nnyopụta, kama na unu na-akwụwa aka ọtọ. M ga-akpọnyezi unu nwanne unu, unu ga na-azụrụkwa nri n’ala a.’” 35  Mgbe ha na-ewepụtasị ihe dị n’akpa ha, ego onye nke ọ bụla dị n’akpa ya. Mgbe ha na nna ha hụrụ akpa ego ha, egwu tụwara ha. 36  Jekọb nna ha tiri mkpu, sị ha: “Ọ bụ m ka unu na-agbawa aka ụmụ!+ Josef anọghịzi.+ Simiọn anọghịzi,+ unu chọkwara ịkpọrọ Benjamin! Ọ bụ m ka ihe a niile na-eme!” 37  Ma Ruben gwara nna ya, sị: “I nwere ike igbu ụmụ m abụọ ma ọ bụrụ na mụ akpọghachighịrị gị ya.+ Nyefee m ya n’aka. M ga-akpọghachitere gị ya.”+ 38  Ma, Jekọb sịrị: “Nwa m agaghị eso unu gaa, n’ihi na nwanne ya nwoke anwụọla. Ọ bụ naanị ya fọrọ.+ Ọ bụrụ na ihe emee ya n’ụzọ, ya anwụọ, unu ga-eme ka m rugide uju+ n’isi awọ́ m nwụọ.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ọka a nwere ike ịbụ ọka wit ma ọ bụ ọka bali.
Ya bụ, ụmụ Jekọb.
Na Hibru, “emehiela nwata ahụ.”