Jenesis 40:1-23

  • Josef kọwara nrọ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ (1-19)

    • ‘Ọ bụ Chineke na-akọwa nrọ’ (8)

  • Ememme ụbọchị a mụrụ Fero (20-23)

40  Mgbe ihe ndị a mechara, onyeisi ndị na-ebunye eze Ijipt mmanya+ na onyeisi ndị na-emere ya achịcha mejọrọ onyenwe ha, bụ́ eze Ijipt.  N’ihi ya, Fero wesara mmadụ abụọ ahụ na-ejere ya ozi iwe, ya bụ, onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha.+  O wee tụba ha n’ụlọ nga dị n’ụlọ onyeisi ndị nche,+ bụ́ ebe a tụrụ Josef mkpọrọ.+  Onyeisi ndị nche nyefeziri ha n’aka Josef ka o lekọtawa ha.+ Ha wee nọrọ n’ụlọ nga ruo oge* ụfọdụ.  Onye na-ebunye eze Ijipt mmanya na onye na-emere ya achịcha, bụ́ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, rọrọ nrọ n’otu abalị. Nrọ onye nke ọ bụla n’ime ha nwere ihe ọ pụtara.  Mgbe chi bọrọ, Josef batara hụ ha, ma ihu ha gbarụrụ agbarụ.  N’ihi ya, Josef jụrụ ndị ahụ na-ejere Fero ozi, bụ́ ndị ya na ha nọ n’ụlọ nga dị n’ụlọ nna ya ukwu, sị: “Gịnị mere ihu unu ji gbarụọ taa?”  Ha wee sị ya: “Anyị abụọ n’otu n’otu rọrọ nrọ, ma e nweghị onye na-akọwa nrọ anyị na ya nọ.” Josef sịziri ha: “Ọ̀ bụ na ọ bụghị Chineke na-akọwa nrọ?+ Biko, kọọrọnụ m ya.”  Onyeisi ndị na-ebunye eze mmanya wee kọọrọ Josef nrọ ya, sị: “Ná nrọ m, e nwere osisi vaịn dị n’ihu m. 10  Osisi vaịn ahụ nwekwara alaka atọ. Mgbe ọ na-epu akwụkwọ ọhụrụ, ọ mara ifuru, mkpụrụ ọ mịrị n’ụyọkọ n’ụyọkọ chakwara. 11  Eji m iko Fero n’aka, m wee were mkpụrụ vaịn ndị ahụ pịnye mmiri ha n’iko Fero. Mgbe m pịnyechara ha, m bunyere Fero iko ahụ.” 12  Josef sịziri ya: “Lee ihe nrọ gị pụtara: Alaka atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. 13  N’ụbọchị atọ taa, Fero ga-akpọpụta gị, nyeghachi gị ọrụ gị.+ Ị ga-ebunyekwa Fero iko ya otú ị na-emebu mgbe ị bụ onye na-ebunye ya mmanya.+ 14  Ma, chetakwa m mgbe ihe gaziiri gị. Biko, meere m ebere* ma kọọrọ Fero banyere m, ka e wee kpọpụta m n’ebe a. 15  N’eziokwu, e si n’ala ndị Hibru tọrọ m,+ emeghịkwa m ihe ọ bụla n’ebe a mere ha ga-eji tụba m n’ụlọ mkpọrọ.”*+ 16  Mgbe onyeisi ndị na-emere eze achịcha hụrụ na ihe Josef kọwara dị mma, ọ gwara Josef, sị: “Ná nrọ nke m, ebu m nkata atọ n’isi, achịcha na-acha ọcha dịkwa n’ime nkata ndị ahụ. 17  Ụdị achịcha dị iche iche e meere Fero dịkwa n’ime nkata nke dị n’elu elu. E nwekwara nnụnụ ndị nọ na-eri achịcha ndị ahụ dị na nkata ahụ m bu n’isi.” 18  Josef gwaziri ya, sị: “Lee ihe nrọ gị pụtara: Nkata atọ ahụ bụ ụbọchị atọ. 19  N’ụbọchị atọ taa, Fero ga-egbupụ gị isi ma kwụwa gị n’osisi, nnụnụ ga-erikwa anụ gị.”+ 20  Ụbọchị nke atọ ahụ bụ ụbọchị Fero na-echeta ụbọchị a mụrụ ya.+ O wee meere ndị niile na-ejere ya ozi oriri. Ọ kpọpụtara onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya na onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’ihu ndị na-ejere ya ozi. 21  Fero nyeghachiri onyeisi ndị na-ebunye ya mmanya ọrụ ọ na-arụbu, ya ebunyewekwa ya mmanya. 22  Ma ọ kwụwara onyeisi ndị na-emere ya achịcha n’osisi, otú Josef kwuru mgbe ọ na-akọwara ha nrọ.+ 23  Ma, onyeisi ndị na-ebunye eze mmanya echetaghị Josef. O chefuru ya.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “ụbọchị.”
Ma ọ bụ “gosi m ịhụnanya pụrụ iche.”
Na Hibru, “n’olulu.”