Jenesis 4:1-26

  • Ken na Ebel (1-16)

  • Ụmụ Ken (17-24)

  • Set na Ịnọsh nwa ya (25, 26)

4  Adam na Iv nwunye ya nwere mmekọahụ, ya adị ime.+ Mgbe Iv mụrụ Ken,+ ọ sịrị: “Jehova emeela ka m mụọ nwa nwoke.”  Mgbe e mechara, ọ mụrụ nwa ọzọ, bụ́ Ebel+ nwanne Ken. Ebel ghọrọ onye na-azụ atụrụ, ma Ken ghọrọ onye na-akọ ugbo.  Mgbe oge gatụrụ, Ken wetara ụfọdụ mkpụrụ ala mịrị ma jiri ha chụọrọ Jehova àjà.  Ma Ebel si n’ìgwè atụrụ ya weta ụfọdụ atụrụ e bu ụzọ mụọ+ ma jiri ha na abụba ha chụọ àjà. Jehova lere Ebel na onyinye ya anya ọma,+  ma o leghị Ken na onyinye ya anya ọma. Ken wee wee ezigbo iwe ma gbarụọ ihu.  Jehova wee sị Ken: “Gịnị mere i ji na-ewe oké iwe ma gbarụọ ihu?  Ọ bụrụ na ị gbanwee mewe ihe dị mma, ọ̀ bụ na agaghị m ele gị anya ọma? Ma ọ bụrụ na ị gbanweghị mewe ihe dị mma, mmehie nọ n’ọnụ ụzọ na-eche gị, ọ chọkwara inweta gị. Ma ị̀ ga-emerinụ ya?”  Mgbe e mechara, Ken gwara Ebel nwanne ya, sị: “Ka anyị gaa n’ọhịa.” Mgbe ha nọ n’ọhịa, Ken tiri Ebel nwanne ya ihe, tigbuo ya.+  Mgbe e mechara, Jehova sịrị Ken: “Olee ebe Ebel nwanne gị nọ?” O wee sị: “Amaghị m. Àbụ m onye nche nwanne m?” 10  Chineke gwaziri ya, sị: “Gịnị bụ ihe a i mere? Gee ntị! Ọbara nwanne gị si n’ala na-ebesara m ákwá.+ 11  Ugbu a, ị bụ onye a bụrụ ọnụ, m na-achụpụkwa gị n’ala a nke mịịrị ọbara nwanne gị onye i gburu.+ 12  Ọ bụrụ na ị kọọ ihe n’ala, ọ gaghị emepụtara gị ihe nke ọma. Ị ga na-awagharị n’ụwa, ị gbara gaa ebe a, gị agbara gaa ebe a.” 13  Ken wee sị Jehova: “Ahụhụ ị na-ata m maka ihe ọjọọ m mere agaghị ekwe m odidi. 14  Taa, ị na-achụpụ m n’ala a, agaghịkwa m anọ n’ihu gị ọzọ. M ga na-awagharịkwa n’ụwa, m gbara gaa ebe a, mụ agbara gaa ebe a, onye ọ bụla hụrụ m ga-egbukwa m.” 15  Jehova gwaziri ya, sị: “N’ihi ya, onye ọ bụla gburu Ken, a ga-ata ya ahụhụ ugboro asaa.” Jehova wee mee ka e nwee ihe àmà ga-eme ka onye ọ bụla hụrụ Ken ghara igbu ya. 16  Ken wee si n’ihu Jehova pụọ gaa biri n’ala Nọd,* n’ebe ọwụwa anyanwụ nke Iden.+ 17  Mgbe e mechara, Ken na nwunye ya nwere mmekọahụ,+ ya adị ime mụọ Ịnọk. Ken wee rụọ otu obodo ma kpọọ obodo ahụ aha nwa ya bụ́ Ịnọk. 18  Mgbe e mechara, a mụụrụ Ịnọk Aịrad. Aịrad wee mụọ Mehujel, Mehujel amụọ Metushel, Metushel amụọ Lemek. 19  Lemek lụrụ ụmụ nwaanyị abụọ. Aha nke mbụ bụ Eda, aha nke abụọ abụrụ Zila. 20  Eda mụrụ Jebal. Ọ bụ ya bụ onye mbụ biri n’ụlọikwuu ma na-azụ anụ ụlọ. 21  Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal. Ọ bụ ya bụ onye mbụ kpọrọ ụbọ akwara, gbuokwa ọjà. 22  Zila mụrụ Tubal-ken, onye ji ọla kọpa na ígwè kpụọ ụdị ngwá ọrụ ọ bụla. Nwanne nwaanyị Tubal-ken bụ Neama. 23  Lemek gwara ndị nwunye ya bụ́ Eda na Zila, sị: “Unu ndị nwunye Lemek, nụrụnụ olu m. Geenụ ntị n’ihe m na-ekwu: M gburu otu nwoke maka na o merụrụ m ahụ́. M gburu nwa okorobịa ahụ maka na o tiri m ihe. 24  Ọ bụrụ na a ga-ata onye gburu Ken ahụhụ ugboro asaa,+A ga-ata onye gburu Lemek ahụhụ ugboro iri asaa na asaa.” 25  Adam na nwunye ya nwere mmekọahụ ọzọ, nwunye ya wee mụọ nwa nwoke. Iv gụrụ ya Set*+ n’ihi na o kwuru, sị, “Chineke enyela m* nwa ọzọ ga-anọchi Ebel maka na Ken gburu ya.”+ 26  A mụkwaara Set nwa nwoke, ya agụọ ya Ịnọsh.+ N’oge ahụ, ndị mmadụ malitere ịkpọ aha Jehova.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ala Nọd pụtara ala ndị a chụpụrụ achụpụ.
Set pụtara “Onye A Họpụtara.”
Ma ọ bụ “Chineke ahọpụtarala m.”