Jenesis 24:1-67

  • A chọtaara Aịzik nwaanyị (1-58)

  • Ribeka lakwuuru Aịzik (59-67)

24  Ugbu a, Ebreham emeela agadi, kaa ezigbo nká. Jehova gọzikwara Ebreham n’ihe niile.+  Ebreham gwara onye na-ejere ya ozi, onye kacha bụrụ okenye n’ezinụlọ ya, bụ́ onye na-elekọta ihe niile o nwere,+ sị: “Biko, tinye aka gị n’okpuru apata ụkwụ m,*  jiri aha Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na ụwa, ṅụọrọ m iyi na ị gaghị alụtara nwa m nwoke otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị Kenan, bụ́ ndị m bi n’obodo ha.+  Kama ị ga-aga n’obodo m, na nke ndị ikwu m,+ lụtara Aịzik nwa m nwoke nwaanyị.”  Ma, onye na-ejere ya ozi jụrụ ya, sị: “Ọ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ achọghị iso m lọta n’ala a? Ọ̀ bụ m kpọrọ nwa gị nwoke laghachi n’ala i si bịa?”+  Ebreham sịrị ya: “Akpọghachikwala nwa m nwoke n’ebe ahụ.+  Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe, onye si n’ụlọ nna m nakwa n’ala ndị ikwu m kpọrọ m,+ onye gwakwara m okwu ma ṅụọrọ m iyi,+ sị: ‘Ọ bụ ụmụ* gị+ ka m ga-enye ala a,’+ ga-ezite mmụọ ozi ya ka o butere gị ụzọ.+ Ị ga-esikwa n’ebe ahụ lụtara nwa m nwoke nwaanyị.+  Ma ọ bụrụ na nwaanyị ahụ ekweghị eso gị alọta, iyi a ị ga-aṅụ agaghị eme gị ihe ọ bụla. Ma akpọgala nwa m nwoke n’ebe ahụ.”  Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi wee tinye aka ya n’okpuru apata ụkwụ Ebreham nna ya ukwu ma ṅụọrọ ya iyi na ọ ga-eme ihe o kwuru.+ 10  Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi kpụụrụ kamel iri n’ime kamel nna ya ukwu, werekwa ụdị onyinye dị iche iche nna ya ukwu nwere, gawa. Ọ gawara n’obodo Nehọ, nke dị na Mesopotemia. 11  Mgbe o rutere n’otu olulu mmiri dị tupu a banye n’obodo ahụ, o mere ka kamel ndị ahụ ọ kpụ makpuru ala n’ebe ahụ. Ọ bụ n’oge mgbede, mgbe ụmụ nwaanyị na-apụtakarị ka ha sere mmiri. 12  O wee kpee ekpere, sị: “Jehova Chineke nna m ukwu Ebreham, biko, mee ka ihe gaziere m taa, gosikwa na ị hụrụ nna m ukwu Ebreham n’anya.* 13  Lee, m guzo n’akụkụ olulu mmiri a, ụmụ agbọghọ obodo a na-apụtakwa ka ha sere mmiri. 14  Biko, ka nwa agbọghọ m ga-asị, ‘Biko, butuo ite mmiri gị nye m mmiri ka m ṅụọ,’ nke ga-asịkwa m, ‘Ṅụọ, m ga-enyekwa kamel gị mmiri,’ bụrụ nwa agbọghọ ị họtaara Aịzik ohu gị. Biko, meere m ihe a ka m jiri ya mara na ị hụrụ nna m ukwu n’anya.”* 15  Tupu ya ekwuchaadị ihe ọ na-ekwu, Ribeka nwa Betuel+ bu ite mmiri ya n’ubu pụta. (Betuel bụ nwa Milka.+ Milka bụ nwunye Nehọ.+ Nehọ bụ nwanne Ebreham.) 16  Ribeka bụ nwa agbọghọ mara ezigbo mma, e nwebeghịkwa nwoke ya na ya nwere mmekọahụ. Ọ gbadara na mmiri ahụ, gbanye mmiri n’ite mmiri ya ma si na mmiri ahụ pụta. 17  Onye na-ejere Ebreham ozi gbakwuuru ya ozugbo, sị ya: “Biko, si n’ite mmiri gị nye m mmiri ka m ṅụrụtụ.” 18  O wee sị ya: “Onyenwe m, ṅụọ.” O wee butulata ite mmiri ya ọsọ ọsọ ma nye ya mmiri. 19  Mgbe o nyechara ya mmiri, ọ sịrị ya: “M ga-esetakwara kamel gị mmiri ruo mgbe ha ṅụjuru afọ.” 20  Ozugbo ahụ, ọ wụnyere mmiri dị n’ite mmiri ya n’ihe anụ ụlọ ji aṅụ mmiri ma gbaga n’olulu mmiri ahụ ugboro ugboro na-eseta mmiri. Ọ nọ na-esetara kamel ahụ niile mmiri. 21  Ihe niile a juru nwoke ahụ anya, ya agba nkịtị na-ele ya n’anya n’anya, na-eche ma ọ̀ ga-abụ na Jehova emeela ka ihe ọ bịara nwee isi ka ọ̀ bụ na o mebeghị ka o nwee isi. 22  Mgbe kamel ndị ahụ ṅụchara mmiri, nwoke ahụ wepụtara ọla imi e ji ọlaedo mee nke dị ọkara shekel* n’arọ nakwa ọla aka abụọ e ji ọlaedo mee ndị dị shekel* iri n’arọ ma were ha nye ya. 23  Ọ sịkwara nwa agbọghọ ahụ: “Biko, gwa m, ị̀ bụ nwa onye? È nwere ebe anyị ga-arahụ n’ụlọ nna gị?” 24  Ọ zara ya, sị: “Abụ m nwa Betuel.+ Ọ bụ Milka na Nehọ+ mụrụ nna m.” 25  Ọ gwakwara ya, sị: “Anyị nwere okporo ọka, nwejuokwa nri anụ enwejuo. Anyị nwekwara ebe unu ga-arahụ.” 26  Nwoke ahụ wee hulata kpọọrọ Jehova isiala, 27  sị: “Ka e too Jehova bụ́ Chineke nna m ukwu Ebreham n’ihi na ọ ka na-egosi na ọ hụrụ nna m ukwu n’anya,* na-emezukwa nkwa o kwere ya. Jehova edurutela m n’ụlọ ụmụnne nna m ukwu.” 28  Nwa agbọghọ ahụ gbaara ọsọ gaa n’ụlọ nne ya kọọrọ ha ihe ndị a merenụ. 29  Ribeka nwere nwanne nwoke aha ya bụ Leban.+ Leban wee gbara ọsọ gakwuru nwoke ahụ nọ ná mpụga obodo, n’akụkụ olulu mmiri. 30  Mgbe Leban hụrụ ọla imi ahụ nakwa ọla aka ndị nwanne ya nwaanyị gba n’aka ma nụ ihe Ribeka nwanne ya nwaanyị kwuru, sị: “Ọ bụ ihe a ka nwoke ahụ gwara m,” Leban gakwuuru nwoke ahụ n’ebe ahụ ọ ka guzo n’akụkụ kamel ya, n’olulu mmiri ahụ. 31  Ozugbo ahụ, Leban sịrị ya: “Onye Jehova gọziri agọzi, bịawa. Gịnị mere ị ka ji guzoro n’èzí ebe a? M doziela ụlọ, kwadebekwa ebe kamel ndị a ga-anọ.” 32  Nwoke ahụ wee bata n’ụlọ. O* wee tọpụ kamel ndị ahụ ihe e kere ha ma nye kamel ndị ahụ okporo ọka na nri anụ. O kutekwara mmiri a ga-eji saa nwoke ahụ na ụmụ nwoke ya na ha so ụkwụ. 33  Ma mgbe e buteere ya ihe ọ ga-eri, ọ sịrị: “Agaghị m eri ihe ruo mgbe m gwara unu ihe mere m ji bịa.” Leban sịziri ya: “Kwuwe.” 34  O wee sị: “Abụ m onye na-ejere Ebreham ozi.+ 35  Jehova agọziela nnọọ nna m ukwu, o meekwala ka ọ baa ezigbo ọgaranya ma nye ya atụrụ na ehi, ọlaọcha na ọlaedo, ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-eje ozi, nakwa kamel na jakị.+ 36  Sera, nwunye nna m ukwu, mụkwaara nna m ukwu nwa nwoke mgbe o merela agadi.+ Ọ bụ ya ka nna m ukwu ga-enye ihe niile o nwere.+ 37  N’ihi ya, nna m ukwu mere ka m ṅụọ iyi. Ọ sịrị m: ‘Alụtarala nwa m nwoke otu n’ime ụmụ nwaanyị ndị Kenan, bụ́ ndị m bi n’obodo ha.+ 38  Mba, kama ị ga-aga n’ụlọ nna m nakwa n’ezinụlọ m+ lụtara Aịzik nwa m nwoke nwaanyị.’+ 39  Ma m sịrị nna m ukwu, ‘Ọ bụrụkwanụ na nwaanyị ahụ achọghị iso m lọta?’+ 40  O wee sị m, ‘Jehova, onye m na-efe,+ ga-ezite mmụọ ozi ya+ ka ọ nọnyere gị, ọ ga-emekwa ka ihe ị na-aga nwee isi. Ị ga-esi n’ezinụlọ m nakwa n’ụlọ nna m lụtara nwa m nwoke nwaanyị.+ 41  Iyi ị ṅụụrụ m agaghị eme gị ihe ọ bụla ma ọ bụrụ na ị gaa n’ezinụlọ m ha ajụ ịkpọnye gị nwaanyị ahụ. Ọ bụ ya ga-eme ka i nwere onwe gị n’iyi ị ṅụrụ.’+ 42  “Mgbe m rutere n’olulu mmiri ahụ taa, m kpere ekpere, sị: ‘Jehova Chineke nna m ukwu Ebreham, ọ bụrụ na ị ga-eme ka ihe m bịara nwee isi, 43  lee, m guzo n’akụkụ olulu mmiri. Ọ bụrụ na nwa agbọghọ+ apụta isere mmiri, m ga-asị ya: “Biko, ka m ṅụrụtụ mmiri n’ite gị.” 44  Ọ bụrụ na ọ sị m: “Ṅụọ, m ga-esetakwara kamel gị mmiri,” ka ọ bụrụ nwaanyị ahụ bụ onye Jehova họtaara nwa nna m ukwu.’+ 45  “Tupu mụ ekwuchaa ihe a n’obi m, lekwa ka Ribeka bu ite mmiri ya n’ubu na-apụta! Ọ gbadara n’olulu mmiri ahụ malite isere mmiri. M wee sị ya: ‘Biko, nyetụ m mmiri ka m ṅụọ.’+ 46  O butulatara ite mmiri ya ọsọ ọsọ, sị m: ‘Ṅụọ mmiri,+ m ga-enyekwa kamel gị mmiri.’ M wee ṅụọ mmiri, o nyekwara kamel m mmiri. 47  Mgbe e mechara, m jụrụ ya, sị, ‘Ị̀ bụ nwa onye?’ ya azaa m, sị, ‘Abụ m nwa Betuel. Ọ bụ Nehọ na Milka mụrụ nna m.’ M wee gbanye ya ọla n’imi, gbanyekwa ya ọla aka n’aka.+ 48  M hulataziri kpọọrọ Jehova isiala ma too Jehova bụ́ Chineke nna m ukwu Ebreham,+ onye dutere m n’ebe m kwesịrị ịbịa ka m lụta nwa nwanne nna m ukwu ka ọ bụrụ nwunye nwa ya. 49  Ugbu a, ọ bụrụ na unu chọrọ igosi na unu hụrụ nna m ukwu n’anya nakwa na unu bụ ndị e kwesịrị ịtụkwasị obi, gwanụ m. Ma ọ bụrụ na unu achọghị ime otú ahụ, gwanụ m, ka m mara ma m̀ ga-agawa ihu ka m̀ ga-agawa azụ.”+ 50  Leban na Betuel wee, sị ya: “Ihe a si n’aka Jehova. Anyị enweghị ike ịsị gị ee ma ọ bụ ee e.* 51  Lekwa Ribeka n’ihu gị. Kpọrọ ya lawa, ka ọ bụrụ nwunye nwa nna gị ukwu, otú Jehova kwuru.” 52  Mgbe onye na-ejere Ebreham ozi nụrụ ihe ha kwuru, ọ kpọọrọ Jehova isiala ozugbo. 53  Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi wee chịpụta uwe nakwa ihe ndị e ji ọlaọcha na ọlaedo mee ma chịnye ha Ribeka. O nyekwara nwanne ya nwoke na nne ya ihe ndị bara ezigbo uru. 54  Mgbe e mechara, ya na ụmụ nwoke so ya riri ihe ma ṅụọ mmanya, ha rahụkwara n’ebe ahụ. Mgbe o biliri n’ụtụtụ, ọ sịrị: “Hapụnụ m ka m lakwuru nna m ukwu.” 55  Nwanne nwoke Ribeka na nne ya wee sị: “Ka anyị na nwa agbọghọ a nọọ ụbọchị iri, ma ọ dịkarịa ala. E mechaa, o nweziri ike ịlawa.” 56  Ma ọ sịrị ha: “Ebe ọ bụ na Jehova emeela ka ihe m bịara nwee isi, unu egbochila m ịla. Hapụnụ m ka m lawa gakwuru nna m ukwu.” 57  Ha kwuziri, sị: “Ka anyị kpọọ nwa agbọghọ ahụ jụọ ya ihe o chere.” 58  Ha kpọrọ Ribeka, jụọ ya, sị: “Ị̀ ga-eso nwoke a laa?” Ọ zara, sị: “M ga-eso ya ala.” 59  Ha wee hapụ Ribeka nwanne ha nwaanyị+ na onye nyere ya ara*+ na onye na-ejere Ebreham ozi na ụmụ nwoke ya na ha so ka ha lawa. 60  Ha gọziri Ribeka, sị ya: “Nwanne anyị nwaanyị, ka ụmụ gị dịrị puku kwuru iri puku, ka ụmụ* gị wegharakwa obodo* ndị kpọrọ ha asị.”+ 61  Ribeka na ụmụ agbọghọ na-ejere ya ozi biliziri nọkwasị na kamel sowe nwoke ahụ. Onye ahụ na-ejere Ebreham ozi wee kpọrọ Ribeka lawa. 62  Ugbu a, Aịzik si n’ụzọ gara Bia-lehaị-rọị+ lọta, n’ihi na o bi n’ógbè Negeb.*+ 63  Aịzik pụtara ná mgbede na-ejegharị n’ọhịa ka ọ tụgharịa uche.+ Mgbe o lepụrụ anya, ọ hụrụ ka kamel na-abịa. 64  Mgbe Ribeka lepụrụ anya, ọ hụrụ Aịzik, ya esi na kamel ọ nọ na ya rịtuo ozugbo. 65  O wee jụọ onye na-ejere Ebreham ozi, sị: “Ònye bụ nwoke ahụ si n’ọhịa na-abịa izute anyị?” Onye na-ejere Ebreham ozi sịrị ya: “Ọ bụ nna m ukwu.” Ribeka wee were ákwà kpuchie ihu ya. 66  Onye na-ejere Ebreham ozi wee kọọrọ Aịzik ihe niile o* mere. 67  Mgbe e mechara, Aịzik kpọbatara Ribeka n’ụlọikwuu Sera nne ya.+ Aịzik si otú a lụọ Ribeka. O wee hụ Ribeka n’anya.+ E si otú a kasie Aịzik obi mgbe nne ya nwụchara.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ihe a nwere ike ịbụ otú ndị oge ochie si aṅụrụ mmadụ iyi.
Ma ọ bụ “nwa.” Na Hibru, “mkpụrụ.”
Ma ọ bụ “gosikwa nna m ukwu Ebreham ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “i gosila nna m ukwu ịhụnanya pụrụ iche.”
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Otu shekel bụ gram 11.4. Gụọ B14.
Ma ọ bụ “na-egosi nna m ukwu ịhụnanya pụrụ iche.”
O nwere ike ịbụ Leban ka a na-ekwu.
Ma ọ bụ “ịgwa gị ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ.”
Ya bụ, onye nyere ya ara nke bụzi onye na-ejere ya ozi ugbu a.
Na Hibru, “mkpụrụ.”
Na Hibru, “ọnụ ụzọ ámá.”
Ma ọ bụ “n’ebe ndịda.”
Ya bụ, onye na-ejere Ebreham ozi.