Ilu 3:1-35

  • Mara ihe ma tụkwasị Jehova obi (1-12)

    • Jiri ihe ndị kacha mma na-efe Jehova (9)

  • Amamihe na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ (13-18)

  • Amamihe na-echebe mmadụ (19-26)

  • Na-emeso ndị ọzọ ihe otú dị mma (27-35)

    • Meere ndị ọzọ ihe ọma ma ọ bụrụ na ị ga-emeli ya (27)

3  Nwa m, echefula ihe m na-akụziri gị,*Jiri obi gị niile na-edebe iwu dị iche iche m na-enye gị,   N’ihi na ha ga-eme ka ị dịtee ndụ aka,Meekwa ka obi ruo gị ala.+   Akwụsịla ịhụ ndị ọzọ n’anya,* akwụsịkwala igosi na ị bụ onye e kwesịrị ịtụkwasị obi.*+ Yiri àgwà ndị a n’olu gị ka ihe olu. Dee ha n’obi gị.+   I mee ya, ihe gị ga na-amasị ma Chineke ma mmadụ,Ha ga-ewerekwa gị ka onye na-aghọta ihe.+   Jiri obi gị niile tụkwasị Jehova obi,+Atụkwasịla amamihe gị obi.*+   N’ihe niile ị na-eme, chọpụta ihe bụ́ uche ya,+Ọ ga-emekwa ka ihe gaziere gị.*+   Amala ihe n’anya onwe gị.+ Tụọ egwu Jehova, hapụkwa ihe ọjọọ.   I mee otú a, ahụ́ ga-adị gị ka à gwọrọ gị ọrịa,Ime ahụ́* ga-agbasikwa gị ike.   Sọpụrụ Jehova ma nye ya ihe ndị kacha mma i nwere,+Ha na mkpụrụ mbụ* nke ihe ọ bụla ị kụrụ n’ubi.*+ 10  Ihe ga-ejuzi n’ebe ndị ị na-akwasa ihe,+Olulu ebe mmanya ọhụrụ ị zọchapụtara na-asọba ga-ejukwa n’ọnụ. 11  Nwa m, ajụla aka ná ntị Jehova na-adọ gị,+Eledakwala mba ọ na-abara gị anya,+ 12  N’ihi na ọ bụ ndị Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba,+Otú nna si abara nwa ya ọ hụrụ n’anya mba.+ 13  Onye nwetara amamihe+Na onye na-aghọta ihe na-enwe obi ụtọ. 14  Inweta amamihe dị mma karịa inweta ọlaọcha. Inweta ya* dịkwa mma karịa inweta ọlaedo.+ 15  Ọ bara uru karịa nkume kọral.* E nweghị ihe ọ bụla ọzọ ị chọrọ inweta a ga-eji tụnyere ya. 16  Ogologo ndụ dị n’aka nri ya. Akụnụba na ùgwù dị n’aka ekpe ya. 17  Ịga n’ụzọ ya na-eme mmadụ obi ụtọ,Ụzọ ya niile bụkwa ụzọ udo.+ 18  Ọ bụụrụ ndị na-ejide ya aka osisi nke ndụ,A ga-akpọkwa ndị na-ejidesi ya aka ike ndị na-enwe obi ụtọ.+ 19  Jehova ji amamihe tọọ ntọala ụwa.+ O ji nghọta mee ka eluigwe kwụsie ike.+ 20  O ji amamihe ya kewaa mmiri miri emi,Na-emekwa ka mmiri si n’ígwé ojii na-ezo obere obere.+ 21  Nwa m, elegharala ha* anya. Jidesie ezigbo amamihe aka ike, na-echebakwara ihe echiche nke ọma. 22  Ha ga-eme ka ị* dị ndụ,Ha ga-abụkwa ihe ị ga-eji chọọ olu gị mma. 23  Mgbe ahụ, e nweghị ihe ga-eme gị mgbe ị na-aga n’ụzọ,Ụkwụ gị agaghịkwa akpọ n’ihe ọ bụla.+ 24  Ụjọ agaghị atụ gị mgbe i dina ala.+ Ị ga-edina ala hie ụra, ụra ga-atọkwa gị ụtọ.+ 25  Ị gaghị atụ ọdachi ọ bụla na-abịa na mberede ụjọ,+Ị gaghịkwa atụ ụjọ mbibi a ga-ebibi* ndị ajọ omume.+ 26  N’ihi na Jehova ga-eme ka obi sie gị ike.+ Ọ ga-eme ka ọnyà ghara ịma gị.*+ 27  Ajụla imere ndị i kwesịrị imere ihe ọma ihe ọma+Ma ọ bụrụ na i nwere ike inyere ha aka.+ 28  Asịla onye agbata obi gị: “Lawa; e mechaa, gị abịa. M ga-emere gị ya echi,”Ma ọ bụrụ na i nwere ike imere ya ihe ahụ ozugbo. 29  Akparala onye agbata obi gị nkata ọjọọ+Mgbe o chere na gị na ya bi n’udo. 30  Esesala mmadụ okwu+Ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ọjọọ o mere gị.+ 31  Enwerela onye tigbuo zọgbuo anyaụfụ,+Akpakwala àgwà ka ya. 32  N’ihi na Jehova kpọrọ onye aghụghọ asị,+Ma ya na onye ezi omume na-abụ ezigbo enyi.+ 33  Jehova na-abụ ezinụlọ onye ajọ omume ọnụ,+Ma ọ na-agọzi ezinụlọ onye ezi omume.+ 34  Ọ na-akwa ndị na-akwa emo emo,+Ma ọ na-emere ndị dị umeala n’obi amara.+ 35  A ga-akwanyere ndị ma ihe ùgwù,Ma a ga-akpụ ùgwù ndị nzuzu n’ala.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ “iwu m.”
Ma ọ bụ “igosi ndị ọzọ ịhụnanya pụrụ iche.”
Ma ọ bụ “onye eziokwu.”
Na Hibru, “Adaberela ná nghọta gị.”
Na Hibru, “ka ụzọ gị dị larịị.”
Na Hibru, “Ọkpụkpụ.”
Ma ọ bụ “ihe kacha mma.”
Ma ọ bụ “ihe ọ bụla ị kpatara.”
Ma ọ bụ “Irite ya n’uru.”
Ya bụ, àgwà Chineke ndị e kwuru okwu ha n’amaokwu ndị bu nke a ụzọ.
Ma ọ bụ “mkpụrụ obi gị.”
Na Hibru, “oké ifufe ga-efekwasị.”
Na Hibru, “ụkwụ gị.”