Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Akwụkwọ Ihe E Mere n’Ụbọchị Ndị Eze nke Mbụ

Isi

Ihe Ndị Dị na Ya

  • 1

    • Ụmụ ndị a mụrụ malite n’oge Adam ruo n’oge Ebreham (1-27)

    • Ụmụ Ebreham na ụmụ ụmụ ya (28-37)

    • Ndị Ịdọm, ndị eze ha, na ndị isi ha (38-54)

  • 2

    • Ụmụ nwoke iri na abụọ Izrel mụrụ (1, 2)

    • Ụmụ Juda na ụmụ ụmụ ya (3-55)

  • 3

    • Ụmụ Devid na ụmụ ụmụ ya (1-9)

    • Ndị eze si n’ezinụlọ Devid (10-24)

  • 4

    • Ndị ọzọ bụ́ ụmụ Juda na ụmụ ụmụ ya (1-23)

      • Jebez na ekpere ya (9, 10)

    • Ụmụ Simiọn na ụmụ ụmụ ya (24-43)

  • 5

    • Ụmụ Ruben na ụmụ ụmụ ya (1-10)

    • Ụmụ Gad na ụmụ ụmụ ya (11-17)

    • E meriri ndị Hega (18-22)

    • Ọkara ebo Manase (23-26)

  • 6

    • Ụmụ Livaị na ụmụ ụmụ ya (1-30)

    • Ndị na-abụ abụ n’ụlọ nsọ (31-47)

    • Ụmụ Erọn na ụmụ ụmụ ya (48-53)

    • Ebe e kenyere ndị Livaị ka ha biri (54-81)

  • 7

    • Ụmụ Ịsaka na ụmụ ụmụ ya (1-5), ụmụ Benjamin na ụmụ ụmụ ya (6-12), ụmụ Naftalaị na ụmụ ụmụ ya (13), ụmụ Manase na ụmụ ụmụ ya (14-19), ụmụ Ifrem na ụmụ ụmụ ya (20-29), ụmụ Asha na ụmụ ụmụ ya (30-40)

  • 8

    • Ụmụ Benjamin na ụmụ ụmụ ya(1-40)

      • Ndị ezinụlọ Sọl (33-40)

  • 9

    • Ndị Izrel ndị si Babịlọn lọta e debara aha ha n’akwụkwọ n’ezinụlọ n’ezinụlọ (1-34)

    • Ndị ezinụlọ Sọl (35-44)

  • 10

    • Otú Sọl na ụmụ ya si nwụọ (1-14)

  • 11

    • Ndị Izrel niile chiri Devid eze (1-3)

    • Devid weghaara Zayọn (4-9)

    • Ndị agha Devid bụ́ ndị dike n’agha (10-47)

  • 12

    • Ndị kwadoro ka Devid bụrụ eze (1-40)

  • 13

    • Ndị Izrel gara Kiriat-jierim buru Igbe Chineke (1-14)

      • Chineke gburu Ọza (9, 10)

  • 14

    • Chineke mere ka ọchịchị Devid sie ike (1, 2)

    • Ezinụlọ Devid (3-7)

    • Devid meriri ndị Filistia (8-17)

  • 15

    • Ndị Livaị butere Igbe Chineke na Jeruselem (1-29)

      • Maịkal ledara Devid anya (29)

  • 16

    • A dọsara Igbe Chineke n’ụlọikwuu (1-6)

    • Abụ Devid rọrọ iji kelee Chineke (7-36)

      • “Jehova abụrụla Eze” (31)

    • Ndị na-eje ozi n’ebe a dọsara Igbe Chineke (37-43)

  • 17

    • Ọ bụghị Devid ga-arụ ụlọ nsọ Chineke (1-6)

    • Chineke kwere Devid nkwa na alaeze ya ga-adịgide (7-15)

    • Ekpere Devid kpere iji kelee Chineke (16-27)

  • 18

    • Ndị Devid meriri (1-13)

    • Ndị ha na Devid so na-achị (14-17)

  • 19

    • ANdị Amọn kparịrị ndị Devid dunyere ozi (1-5)

    • Devid meriri ndị Amọn na ndị Siria (6-19)

  • 20

    • Devid weghaara Raba (1-3)

    • E gburu ndị Filistia gbara ajọ dimkpa (4-8)

  • 21

    • Mgbe Devid gụrụ ndị Izrel ọnụ ọ na-ekwesịghị ịgụ ha (1-6)

    • Jehova tara ndị Izrel ahụhụ (7-17)

    • Devid rụrụ ebe ịchụàjà (18-30)

  • 22

    • Ihe ndị Devid kwakọtara a ga-eji arụ ụlọ nsọ Chineke (1-5)

    • Devid gwara Solomọn ka ọ rụọrọ Chineke ụlọ (6-16)

    •  Devid gwara ndị isi Izrel ka ha nyere Solomọn aka (17-19)

  • 23

    • Devid haziri ndị Livaị n’ìgwè n’ìgwè (1-32)

      • E doro Erọn na ụmụ ya ndị nwoke iche (13)

  • 24

    • Devid kere ndị nchụàjà, ha adị ìgwè iri abụọ na anọ (1-19)

    • E keere ndị Livaị fọrọnụ ọrụ (20-31)

  • 25

    • Ndị na-abụ abụ n’ụlọ Chineke (1-31)

  • 26

    • Otú e si kee ndị na-eche ọnụ ụzọ ámá nche (1-19)

    • Ndị na-elekọta akụ̀ na ndị na-elekọta ọrụ ndị ọzọ (20-32)

  • 27

    • Ndị isi ndị na-elekọtara eze ọrụ (1-34)

  • 28

    • Ihe Devid gwara ndị Izrel gbasara ụlọ nsọ ha chọrọ ịrụ (1-8)

    • Ihe Devid gwara Solomọn ka o mee na otú o kwuru a ga-esi arụ ụlọ nsọ ahụ (9-21)

  • 29

    • Onyinye ndị mmadụ nyere maka ụlọ nsọ ahụ (1-9)

    • Ekpere Devid kpere (10-19)

    • Otú ndị mmadụ si na-enwe aṅụrị nakwa ihe gbasara ọchịchị Solomọn (20-25)

    • Ọnwụ Devid (26-30)