Ezra 1:1-11

  • Iwu Eze Saịrọs nyere ka a rụghachi ụlọ nsọ (1-4)

  • Nkwadebe e mere ka ndị a dọọrọ n’agha si Babịlọn laa (5-11)

1  N’afọ nke mbụ n’ọchịchị Saịrọs+ eze Peshia, ka ihe Jehova si n’ọnụ Jeremaya kwuo+ wee mezuo, Jehova mere ka Saịrọs eze Peshia nye iwu* ka a maa ọkwa n’alaeze ya niile, deekwa ya n’akwụkwọ,+ sị:  “Ihe a bụ ihe Saịrọs eze Peshia kwuru, ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe enyela m alaeze niile dị n’ụwa.+ Ọ họpụtakwala m ka m rụọrọ ya ụlọ na Jeruselem,+ nke dị na Juda.  Onye ọ bụla n’ime unu niile nke so ná ndị ya, ka Chineke ya nọnyere ya. Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, rụghachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel (ọ bụ ya bụ ezi Chineke), onye ụlọ ya dị na Jeruselem.*  Onye ọ bụla bụ́ ọbịa,+ ebe ọ sọkwara ya nọrọ, ka ndị agbata obi ya* nyere ya aka. Ka ha nye ya ọlaọcha na ọlaedo, ngwongwo ndị ọzọ na anụ ụlọ, nakwa onyinye si ha n’obi ha ga-enye maka ụlọ ezi Chineke,+ nke dị na Jeruselem.’”  Ndị isi ọnụmara ebo Juda na ebo Benjamin nakwa ndị nchụàjà na ndị Livaị, onye ọ bụla ezi Chineke metụrụ aka n’obi,* wee kwadebe ịla ka ha gaa rụghachi ụlọ Jehova, nke dị na Jeruselem.  Ndị agbata obi ha niile wee nyere ha aka.* Ha nyere ha arịa ọlaọcha na arịa ọlaedo, ngwongwo ndị ọzọ, anụ ụlọ, na ihe ndị ọzọ bara ezigbo uru, nakwa onyinye niile si ha n’obi ha nyere maka ụlọ ezi Chineke.  Eze Saịrọs bupụtakwara arịa ndị dịbu n’ụlọ Jehova, ndị Nebukadneza bukọọrọ na Jeruselem ma busa n’ụlọ chi ya.+  Eze Saịrọs nke Peshia gwara Mitridat onye na-elekọta akụ̀, ya ebupụta ha, gụọ ha ọnụ ma nyefee ha n’aka Sheshbaza*+ onyeisi Juda.  Ọ bụ ihe ndị a ka a gụrụ ọnụ: arịa ọlaedo iri atọ ndị yiri nkata, otu puku (1,000) arịa ọlaọcha ndị yiri nkata, arịa iri abụọ na itoolu ndị yiri ha, 10  obere efere ọlaedo iri atọ, narị obere efere ọlaọcha anọ na iri (410), otu puku (1,000) arịa ndị ọzọ. 11  Arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha niile dị puku ise na narị anọ (5,400). Sheshbaza bu ha niile mgbe e si na Babịlọn kpọpụta ndị a dọọrọ n’agha+ kpọlata ha Jeruselem.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Na Hibru, “kpaliri mmụọ Saịrọs eze Peshia.”
O nwere ike ịbụ, “onye nọ na Jeruselem.”
Na Hibru, “ndị obodo ya.”
Na Hibru, “kpaliri mmụọ ya.”
Na Hibru, “mee ka aka ha sie ike.”
O nwere ike ịbụ ya bụ Zerubabel e kwuru okwu ya n’Ezra 2:2 na 3:8.